Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

2. Na-adị Ọcha

2. Na-adị Ọcha

2. Na-adị Ọcha

NDỊ dọkịta na-akpachapụ anya ka ha ghara ibunye ndị ha na-awa ahụ́ ọrịa. Ọ bụ ya mere ha ji akwọ aka ha nke ọma tupu ha awawa mmadụ ahụ́. Ha na-elezikwa anya saa ihe ha ji awa ahụ́ mmiri, dewekwa ebe ha na-anọ awa ahụ́ ọcha. Ị chọọ ka ndị ezinụlọ gị ghara irite ọrịa ná nri, i kwesịrị ịgba mbọ na-adị ọcha. I kwesịkwara ịna-edewe usekwu unu na nri ị na-esi ọcha.

Na-akwọ aka gị akwọ.

Otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ahụ́ ike na Kanada kwuru na e kee ọrịa ndị na-efe efe ụzọ iri, a na-esi n’aka ebute ụzọ asatọ n’ime ha. N’ihi ya, jiri ncha na-akwọ aka nke ọma tupu i riwe nri. Jirikwa ncha kwọọ aka ma ị gachaa mposi. Tupu i siwe nri, hụkwa na i ji ncha kwọọ aka gị nke ọma.

Na-edewe usekwu gị ọcha.

Ndị ọkachamara chọpụtara na ndị mmadụ na-akacha edewe ebe ha na-asa ahụ́ na ebe ha na-aga mposi ọcha, na-eche na ọ bụ ebe ndị bụ́ isi e nwere ike isi bute ọrịa. Ma, ha amaghị na ebe ọ kacha dịrị mfe isi bute ọrịa bụ na sapo e ji asa efere. Ị manụ na a na-edewekarị ya n’usekwu.

N’ihi ya, sapo i ji asa efere mewe ochie, tufuo ya weta nke ọhụrụ. Jiri ncha na mmiri ọkụ na-asa usekwu gị ma ọ bụkwanụ gị ana-efesa ya ihe e ji egbu nje. Nke bụ́ eziokwu bụ na ime ihe ndị a anyị kwuru adịghị mfe. E nwere otu nwaanyị bi n’ebe ana-enweghị mmiri pọmpụ, aha ya bụ Bola. Nwaanyị a kwuru, sị: “Ọ naghị adịrị anyị mfe. Ma, anyị na-agbalị nweta mmiri na ncha anyị ji asa ụlọ anyị na usekwu anyị mgbe niile.”

Saa ihe ị zụrụ mmiri.

Tupu ndị mmadụ eburu mkpụrụ osisi ma ọ bụ akwụkwọ nri bịa ahịa, ha nwere ike jiri mmiri na-adịghị ọcha saa ya. E nwekwara ike kpata akwụkwọ nri ahụ n’ọhịa ndị mmadụ na-anyụ nsị ma ọ bụkwanụ mkpụrụ osisi ahụ adaa n’ala mgbe e bụ ya na-abịa ahịa. N’ihi ya, tupu ị tawa mkpụrụ osisi ị zụrụ n’ahịa, saa ya nke ọma, a sịgodị na ị ga-ebechapụ mkpo ya. Saakwa akwụkwọ nri ị chọrọ iji esi nri nke ọma, ka nje ndị dị na ya pụọ. Ya adịkwala gị oké ngwa ngwa. Otu nwaanyị onye Brazil aha ya bụ Daiane kwuru, sị: “M mewe salad, m na-ewetu obi saa akwụkwọ nri ndị m ji eme ya mmiri.”

Dewe anụ iche.

Ị zụọ anụ ma ọ bụ azụ̀ friji, jiri ihe kechie ya. Etinyela ya ebe i tinyere ihe ndị ọzọ i ji esi nri, ka nje ghara isi na ya banye ha. Ị lọta chọọ iji mma na osisi e ji ebi akwụkwọ nri bekasịa anụ ma ọ bụ azụ̀ ahụ, jiri ncha na mmiri ọkụ saa ha. I mechaakwa, hụ na i ji mmiri ọkụ na ncha saa ha tupu i jiri ha bie akwụkwọ nri ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ.

I mechaa ihe a niile anyị kwuru, oleezi otú ị ga-esi sie nri ahụ ị chọrọ isi ka ndị ezinụlọ gị ghara irite ọrịa?

[Igbe dị na peeji nke 5]

IHE Ị GA-AKỤZIRI ỤMỤ GỊ: Otu nwoke onye Họng Kọng aha ya bụ Hoi kwuru, sị: “Anyị na-agwa ụmụ anyị ka ha na-akwọ aka ha tupu ha etinye ihe ọ bụla n’ọnụ. Anyị na-agwakwa ha na tupu ha erie ihe danahụrụ ha, ha saa ya mmiri ma ọ bụkwanụ ha etufuo ya.”