Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

3. Saa Anya Ná Mmiri Sie Nri Gị, Dewekwa Ya Ebe Nje Na-agaghị Aba Ya

3. Saa Anya Ná Mmiri Sie Nri Gị, Dewekwa Ya Ebe Nje Na-agaghị Aba Ya

3. Saa Anya Ná Mmiri Sie Nri Gị, Dewekwa Ya Ebe Nje Na-agaghị Aba Ya

N’OGE ụmụ Izrel, e nwere otu onye gara ghọrọ aṅara ọhịa, binye n’ite ofe a na-esiri ndị mmadụ n’agbanyeghị na ‘ọ maghị ihe aṅara ọhịa ahụ bụ.’ Mgbe e sichara ofe ahụ bupụta, ụjọ ekweghị ndị e siiri ya rie ya. Ha tiri mkpu, sị: “Ọnwụ dị n’ite a.”—2 Ndị Eze 4:38-41.

Akụkọ a a kọrọ na Baịbụl gosiri na anyị ekwesịghị iri nri onye siri ya na-akpachapụghị anya sie. Ma ọ́ bụghị ya, anyị nwere ike rie ihe ga-akpatara anyị ọrịa ma ọ bụdị gbuo anyị. Ka ụdị ihe a ghara ime ma i siere ndị ezinụlọ gị nri, saa anya ná mmiri sie ya, dewekwa ya ebe nje na-agaghị aba ya. Legodị ihe anọ ga-enyere gị aka:

Ị chọọ iwepụ aịz n’anụ i si na friza wepụta, tinye ya na friji.

E nwere otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka nri n’Amerịka. Ụlọ ọrụ a kwuru na ọ dịghị mma iwepụta anụ na friza dewe ya n’ihe dị ka tebụl ka aịz pụọ ya. Ha kwuru na e mee otú ahụ, nje nwere ike ịba n’anụ ahụ n’agbanyeghị na aịz ka nwere ike ịdị n’ime ya. N’ihi ya, ị chọọ ka aịz pụọ n’anụ i si na friza wepụta, dewe ya na friji. I nwekwara ike kechie ya na wọtapruf, dọnyezie ya na mmiri oyi.

Sighee ya esighe.

Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na ọ bụrụ na e sighee nri esighe, ọ ga-afọ obere ka nje niile dị ná nri ahụ nwụọ. Mgbe ị na-esi nri, nke ka nke ofe na stuu, gbalịa hụ na i sighere ya esighe. *

Rie ya mgbe ọ ka dị ọkụ.

E sichaa nri, e kwesịghị ịhapụ ya ka ọ nọọ ọdụ tupu e riwe ya. Ọ ka mma iri ya mgbe ọ ka dị ọkụ. Rie ihe e kwesịrị iri mgbe ọ dị ọkụ mgbe ahụ ọ dị ọkụ, riekwa nke e kwesịrị iri mgbe ọ jụrụ oyi mgbe ahụ ọ jụrụ oyi. I sichaa nri, i nwere ike hapụ ya na stov ka ọkụ na-ekusatụ ya. Ya bụrụkwanụ ekwu ka i ji esi nri, i sichaa, gị ahapụ ya n’ekwu, lọsịa nkụ ị kwanyere ya.

Dewe nri fọrọ afọ otú ọ na-agaghị emebi.

Otu nwaanyị onye Pọland aha ya bụ Anita na-emekarị ya sichaa nri, ya ebupụta ya ozugbo ka e rie. Ya bụrụkwanụ nri ha na-agaghị ericha ozugbo ahụ, ya ekunye ya n’ụmụ obere efere, dọnye na friza. Ihe mere o ji ekunye ya n’ụmụ obere efere bụ ka ọ dịrị ya mfe ịdakwa ya n’ọkụ ma ha mechaa chọọ iri ya. I tinye nri i siri esi na friji, hụ na e riri ya tupu abalị anọ agafee.

Ọ bụrụ na ọ bụ n’ụlọ nri ka unu gara iri nri, ị manụ na ọ bụghị gị siri nri ahụ. Olee ihe ị ga-eme ka unu ghara irite ọrịa?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ị na-esi anụ, sie ya ka o ghee eghe.

[Igbe dị na peeji nke 6]

IHE Ị GA-AKỤZIRI ỤMỤ GỊ: Otu nwaanyị onye Họng Kọng aha ya bụ Yuk Ling kwuru, sị: “Ụmụ m siwe nri a gbara ná mkpọ, m na-agwa ha ka ha leruo anya ebe e dere otú e si esi ya.”