Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú M Si Mata Ihe Ga-ebi Mmegbu

Otú M Si Mata Ihe Ga-ebi Mmegbu

Otú M Si Mata Ihe Ga-ebi Mmegbu

Akụkọ Ursula Menne kọrọ

Kemgbe ụwa m, anaghị m achọ iji ntị anụ ebe a na-emegbu mmadụ. Ọ bụ ihe a mere m ji gaa mkpọrọ n’Ist Jamanị. Ọ bụkwa n’ụlọ mkpọrọ ahụ ka m nọ mata ihe ga-ebi mmegbu. Ngwa, ka m kọọrọ gị otú mụ na ije si gaa.

A MỤRỤ m n’afọ 1922 n’obodo dị na Jamanị a na-akpọ Hala. Ọ karịala otu puku afọ na narị afọ abụọ ndị mmadụ biwere ebe ahụ. Ọ dị n’ebe ndịda obodo Belin. E si Belin gawa ya, ọ dị ihe dị ka narị kilomita abụọ. Hala so n’ebe mbụ okpukpe Protestant bidoro ịkpa ike n’ụwa. A mụrụ Käthe, nwanne m nwaanyị, n’afọ 1923. Papa m bụ onye soja, mama m na-agụ egwú.

Papa m anaghị achọ iji ntị anụ ebe a na-emegbu mmadụ, amụtakwara m ya n’aka ya. Mgbe ọ hapụrụ ọrụ soja, o bidoro zụwa ahịa. Ndị na-abịakarị azụ ya ihe bụ ndị ogbenye. Ha bịa, ọ na-eresị ha ihe ma hà ji ego ma ha ejighị. Ọ bụ obiọma ya ahụ mere ahịa ya ji daa. Ihe a mere papa m kwesịrị ime ka m ghọta na ịkwụsị mmegbu abụghị agwọ e ji akpụka mma egbu. Ma, m ka nọ na-eche na m ga-akwụsịli ya.

Mama m kụziiri mụ na Käthe nwanne m otú e si agụ egwú na otú e si agba egwú. Adị m garagara, mụ na nwanne m nwaanyị kporikwara ndụ. Ma, ihe niile gbanwere n’afọ 1939.

Njinji Amalite Iji

Mgbe m pụtara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, abanyere m ụlọ akwụkwọ na-akụzi otú e si agba egwú. Aha nwaanyị na-akụziri anyị egwú bụ Mary Wigman. Ọ kụziiri anyị otú mmadụ nwere ike isi jiri egwú ọ na-agba gwa onye ọzọ ihe dị ya n’obi. Ebidokwara m ịna-ese ihe. Ihe a niile mere ka obi na-atọ m ụtọ. Ma, n’afọ 1939, njinji jiri. Agha Ụwa nke Abụọ malitere. Njinji ọzọ jiri n’afọ 1941 mgbe ụkwara nta gburu papa m.

Agha jọgburu onwe ya. Ọ bụ eziokwu na adị m naanị afọ iri na asaa mgbe agha ahụ bidoro, echere m na isi emebiela ụmụ mmadụ. Ọtụtụ ndị obodo anyị ndị na-akpa ezigbo àgwà sooro ndị Nazi na-akpa aghara. A na-anara ndị mmadụ ihe ha, na-egbu ha ka ọkụkọ, na-emebikwa ihe aghara aghara. Ọtụtụ ndị ezinụlọ anyị nwụrụ n’agha ahụ, bọmbụ alaakwa ụlọ anyị n’iyi.

Mụ na nwanne m nwaanyị na mama m ka bi na Hala mgbe agha biri n’afọ 1945. Tupu mgbe ahụ, alụrụ m di, anyị amụtakwa otu nwa nwaanyị. Ma, mụ na di m anaghị ebi n’udo. N’ihi ya, onye ọ bụla gara biri nke ya. Amalitere m ịrụ ọrụ ịgba egwú na ise ihe, ka m nwee ike ịhụ ihe mụ na nwa m nwaanyị ga-eri.

Mgbe ahụ agha biri, ndị ọchịchị bịara kee Jamanị ụzọ anọ, ndị Sọviet Yuniọn eketa ebe anyị bi. Ọ bụ otú ahụ ka anyị si baa n’aka ọchịchị Kọmunist. Ebe a anyị bi bụ Ist Jamani, ma e bidoro ịkpọ ya Jaman Demokratik Ripọblik (ya bụ, GDR) n’afọ 1949.

Otú Ihe Si Gaa Mgbe Anyị Banyere n’Ọchịchị Kọmunist

Ka oge na-aga, mama m malitere ịrịa ọrịa, mụ akpọrọ ya na-elekọta. Ebidokwara m ịrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo anyị. Ọ bụkwa n’oge ahụ ka m hụrụ ụmụ akwụkwọ ndị ihe a na-eme n’ọchịchị na-ewe iwe. Ha nọ na-akọsara ụwa niile arụrụala a na-arụ n’ọchịchị. Dị ka ihe atụ, e nwere nwa akwụkwọ a na-ekweghị ka ọ banye mahadum maka na papa ya dụnyeere ndị Nazi ukwu n’oge ahụ a lụrụ agha. Amaruru m nwa ahụ ala, mụ na ya mekọrọ ọtụtụ ihe. Mgbe m nụrụ ihe e mere ya, m jụrụ onwe m sị: ‘Ọ̀ kwa isi kotere ebu ka ebu kwesịrị ịgba?’ Ihe a ndị ọchịchị mere mere ka iwe wekwuo m, mụ esorozie ụmụ akwụkwọ ahụ na-eme ngagharị iwe. O nwedịrị ụbọchị m dere ihe n’akwụkwọ, mapawa ya n’ụlọikpe dị n’obodo anyị.

Mgbe ahụ, ọ bụ mụnwa bụ odeakwụkwọ kọmitii na-ahụ maka udo n’ógbè anyị. O nwere ụfọdụ akwụkwọ ozi ọ na-abụ ha sị m dee, ezigbo iwe ewee m. O nwere mgbe kọmitii a kpara nkata itinye otu agadi nwoke bi na West Jamanị ná nsogbu. Ha dechara ihe ụfọdụ, tinye n’envelopu chọọ izigara ya. A sị na ha zigaara ya ihe ahụ, onye ọzọ ahụ ya, a ga-ewere nwoke ahụ ka onye na-agba ọchịchị ndị West Jamanị mgba okpuru. Eji m iwe gaa zoo ihe ahụ, ya emee ha ezigaghịzi ya.

Onye E Weere n’Onye Kacha Njọ Mere Ka M Mata na Mmegbu Ga-emecha Bie

N’ọnwa Jun afọ 1951, anọ m n’ọfịs m, ndị uwe ojii abụọ abịa kpụrụ m kpụga n’ụlọ mkpọrọ a na-akpọ Red Ọks. Mgbe m nọrọ otu afọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ha boro m ebubo na m na-agba ọchịchị mgba okpuru. Otu n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ m so na-eme ngagharị iwe gara gwa ndị uwe ojii na ọ bụ mụnwa mapawara akwụkwọ ahụ n’ụlọikpe. N’ụbọchị a na-ekpe m ikpe, ihe niile gara ghaa ghaa ghaa, o nweghịdị onye nụrụ ihe m kwuru mgbe m na-azara ọnụ m. E mechaziri tụọ m mkpọrọ afọ isii. N’ụlọ mkpọrọ ahụ, ebidoro m rịawa ọrịa, a kpọgazie m ebe a na-edewe ndị mkpọrọ na-arịa ọrịa. Ụmụ nwaanyị iri anọ nọ n’ebe ahụ. Mgbe m batara hụ otú imi na anya dị ha, na o nweghị onye n’ime ha obi dị mma, ụjọ abịa m. Mụ agaa n’ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ na-esu aka. Onye na-elekọta anyị ajụwa m ihe bụ́ nsogbu m. Mụ agwa ya na achọrọ m ka ọ kpọpụ m n’ụlọ ahụ, kpọga m ebe naanị m ga-anọ ma ya chọọ. Nwoke ahụ atụpụghịdịrị m ọnụ n’ihe a m gwara ya. Ka m nọzi na-elegharị anya n’ụlọ ahụ, mụ ahụ otu nwaanyị dị iche ná ndị nke ọzọ. Ụjọ adịghị ya n’ahụ́, obi dịkwa ya mma. Mụ agaa nọrọ ya n’akụkụ.

Nwaanyị a kwuziri ihe tụrụ m n’anya. Ọ sịrị m: “Ọ bụrụkwa na ị ga-anọ m n’akụkụ, achọghịkwa m nsogbu gị. Mmadụ niile nọ ebe a weere na ọ bụ mụnwa kacha njọ naanị maka na m bụ Onyeàmà Jehova.”

Mgbe ahụ, amaghị m na e weere Ndịàmà Jehova ka ndị na-agba Ọchịchị Kọmunist ụkwụ. Naanị ihe m ma bụ na mgbe papa m nọ ndụ, Ndị Mmụta Baịbụl abụọ na-abịakarị amụrụ ya ihe. * Echetara m ụbọchị papa m kwuru, sị: “Ihe Ndị Mmụta Baịbụl na-ekwu bụ eziokwu.”

Aha nwaanyị ahụ m gara nọrọ n’akụkụ bụ Berta Brüggemeier. Mgbe ahụ m gakwuuru ya, obi lọrọ m n’ihi na ọ bụ ezigbo mmadụ. M gwaziri ya, sị: “Biko, gwa m ihe gbasara Jehova.” Si ụbọchị ahụ gawa, mụ na ya na-anọkarị, ọ na-akụzikwara m Okwu Chineke. Amụtara m ọtụtụ ihe n’aka ya. O ji Baịbụl kụziere m na Jehova Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Ọ kpọrọ imegbu mmadụ asị, ọ chọkwara ka mmadụ niile biri n’udo. Amụtakwara m na Chineke ga-edozi nsogbu niile ndị ọchịchị aka ike na ụmụ mmadụ ọjọọ kpatarala n’ụwa anyị a. Abụ Ọma 37:10, 11 kwuru, sị: “N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”

Otú M Si Pụta n’Ụlọ Mkpọrọ, Gbagazie West Jamanị

Anọrọ m ihe karịrị afọ ise n’ụlọ mkpọrọ, pụtazie n’afọ 1956. Ụbọchị ise sochiri ya, mụ esi Ist Jamanị gbaga West Jamanị. Mgbe ahụ, amụọla m ụmụ abụọ. Ha bụcha ụmụ nwaanyị. Aha ha bụ Hannelore na Sabine, akpọkwa m ha gbaga West Jamanị. Ọ bụ ebe ahụ ka mụ na di m nọ gbaa alụkwaghịm, mụ na Ndịàmà Jehova ebidoghachi ịmụ Baịbụl. Ka anyị na-amụ Baịbụl, achọpụtara m na e nwere ụfọdụ ihe ndị na-adịghị mma m na-eme m kwesịrị ịkwụsị ka mụ na Jehova nwee ike ịdị ná mma. Akwụsịrị m ha, e meekwa m baptizim n’afọ 1958.

Emechara m lụọ di ọzọ aha ya bụ Klaus Menne. Ọ bụ Onyeàmà Jehova. Mụ na ya biri nnọọ nke ọma, anyị mụtakwara ụmụ abụọ. Aha ha bụ Benjamin na Tabia. Ma, ihe dị ka afọ iri abụọ gara aga, ụgbọala gburu di m ọma. Kemgbe ahụ, agbazi m aka di. Ma ihe na-akasi m obi bụ na Jehova ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha adịrịghachi ndụ n’ụwa a mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs. (Luk 23:43; Ọrụ Ndịozi 24:15) Ihe ọzọ na-akasi m obi bụ na ụmụ m anọ bụcha Ndịàmà Jehova.

Baịbụl m na-amụ emeela ka m mata na ọ bụ naanị Jehova ga-akwụsịli mmegbu. Ọ dịghị ka ụmụ mmadụ, ọ ma otú ụwa dị anyị, marakwa ụdị ndị anyị bụ. Ị manụ na ụmụ mmadụ enweghị ike ịmacha ihe ndị a. Ihe a m matara emeela ka m ghara ịna-echegbu onwe m ma m hụ ebe a na-emegbu mmadụ ma ọ bụkwanụ ma e megbuwe m. Ekliziastis 5:8 kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya, na ebe e ji aka ike na-ewepụ ikpe ziri ezi na ezi omume n’ógbè a na-achị achị, ya ejula gị anya, n’ihi na onye dị elu karịa onye ahụ dị elu na-ahụ ihe na-emenụ.” Ọ bụ Chineke, onye kere anyị, bụ onye ka “onye ahụ dị elu.” Ndị Hibru 4:13, kwuru, sị: “Ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.”

Ihe Mụ na Ụwa Jerela Kemgbe Ihe Fọrọ Obere Ka Ọ Bụrụ Afọ Iri Itoolu

Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ajụ m, sị: “Ọchịchị ndị Nazi na nke Kọmunist, olee nke i chere ka mma?” O nweghị nke ka mma, ha abụọ na-achịcha ọchịchị nchịgbu. Ma hanwa ma ọchịchị ọ bụla ọzọ mmadụ ga-eweta enweghị nke ga-achịtali ụmụ mmadụ. N’Ekliziastis 8:9, Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Mmadụ [achịala] mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.” Ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu.

Mgbe ahụ m dị obere m na-amaghị nke ụwa na-akọ, anaara m eche na ụmụ mmadụ nwere ike ịkwụsị mmegbu. Ma ugbu a, amatala m na ọ bụ naanị Chineke ga-emeli ya. Ọ ga-ewepụ ndị ọjọọ niile, nyefezie Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ọchịchị. Ị manụ na Kraịst anaghị eme ihe dị naanị onwe ya mma. Baịbụl kwukwara na Jizọs ‘hụrụ ezi omume n’anya, kpọọkwa mmebi iwu asị.’ (Ndị Hibru 1:9) Obi dị m ezigbo ụtọ na Chineke mere ka m mata Eze ọma a ga-achị ụwa n’oge na-adịghị anya. Achọkwara m ka ọ chịa m ruo mgbe ebighị ebi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Ihe a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ bụ Ndị Mmụta Baịbụl.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ihe a bụ mụ na ụmụ m ndị nwaanyị mgbe ahụ anyị gbagara West Jamanị

[Foto dị na peeji nke 23]

Ihe a bụ mụ na nwa m nwoke Benjamin na nwunye ya bụ́ Sandra