Ebe Ndị A Tụrụ Ndịàmà Jehova Mkpọrọ n’Ihi Ihe Ha Kweere
Ndịàmà Jehova ole nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ọnwa Nọvemba afọ 2020
EBE A TỤRỤ HA MKPỌRỌ |
MMADỤ OLE A TỤRỤ MKPỌRỌ |
IHE MERE E JI TỤỌ HA MKPỌRỌ |
---|---|---|
Krimia |
6 |
|
Eritria |
52 |
|
Rọshịa |
43 |
|
Sịngapọ |
12 |
|
Saụt Koria |
3 |
|
Tajikistan |
3 |
|
Tọkmenestan |
9 |
|
Mba Ndị Ọzọ |
Ihe Karịrị 67 |
|
Ole ha niile dị |
Ihe Karịrị 195 |
|
Nkebi nke 18 nke Ihe Mba Dị Iche Iche Kwekọrịtara na Ọ Bụ Ihe Ruuru Mmadụ kwuru na “mmadụ iche ihe masịrị ya, ịjụ ihe akọnuche ya na-anabataghị, na ikpe okpukpe masịrị ya” so n’ihe ndị bụ́ isi ruuru mmadụ. * N’obodo ụfọdụ, a na-atụ Ndịàmà Jehova mkpọrọ, na-echikwa ha ọnụ n’ala maka na ha na-eme ihe ndị a ruuru ha. Ọtụtụ n’ime ndị a a na-atụ mkpọrọ bụ ụmụ okorobịa jụrụ ịrụ ọrụ agha n’ihi na akọnuche ha anabataghị ya. Ndị ọzọ abụrụ naanị maka na ha na-ekpe okpukpe ha.
^ par. 36 Gụọ ihe dị na Ihe Òtù Mba Ụwa Kwuru na Ọ Bụ Ihe Ruuru Mmadụ Ọ Bụla, nkebi nke 18 na Ihe Ndị Yurop Kwekọrịtara na Ọ Bụ Ihe Ruuru Mmadụ, Nkebi nke 9.