ỌGỌST 31, 2022 | E DEGHARỊRỊ YA NA JENỤWARỊ 26, 2023
RỌSHỊA
OTÚ IHE SI KWỤRỤ—NWANNA A MARA IKPE | “Jehova Enyela M Ndị Enyi Kwụ M n’Azụ Ụjọ Na-anaghị Atụ”
N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Jenụwarị, Ụlọikpe Kuznetskiy nke Novokuznetsk, dị na Kemerovo, mara Nwanna Sergey Sushilnikov ikpe ma kwuo na a ga-eji afọ isii lee ma ọ̀ ga-edebe iwu ndị ha nyere ya. Ọ bụrụ na o debeghị ha, a ga-atụ ya mkpọrọ. Ọ gaghị aga mkpọrọ ka ọ dị ugbu a.
Afọ Ihe Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha Mere
Nọvemba 2019
Ndị uwe ojii tinyere ihe ga-eme ka ha na-anụ ihe Sergey na-ekwu n’ekwentị, na-esetakwa vidio ihe na-eme n’ụlọ ya
Jun 3, 2021
Ha gbara ya akwụkwọ na ọ na-eme mpụ
Jun 8, 2021
Ndị uwe ojii bịara na-achọ ihe n’ụlọ Sergey, kpụrụ ya na nwunye ya gaa ịgba ha ajụjụ
Julaị 15, 2021
Ọchịchị etiti obodo ha debara aha ya n’ebe e dere aha ndị omempụ, jichiekwa ego ha dowere n’ụlọ akụ̀
Febụwarị 8, 2022
E boro ya ebubo na ọ na-ahaziri òtù ndị omempụ ọrụ ma na-arụrụ ha ọrụ. A machikwara ha isi n’obodo ha gaa ebe ọ bụla
Mach 30, 2022
A malitere ikpe ya ikpe
Onye Ọ Bụ
Obi dị anyị ụtọ na Jehova ga na-enyere ndị ji obi ha niile na-ejere ya ozi aka mgbe niile “n’oge nsogbu.”—Abụ Ọma 46:1.