Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Ndị Kọlọsi 3:23—“Jirinụ obi unu niile na-eme ihe ọ bụla unu na-eme”

Ndị Kọlọsi 3:23—“Jirinụ obi unu niile na-eme ihe ọ bụla unu na-eme”

 “Jirinụ obi unu niile na ike unu niile na-eme ihe ọ bụla unu na-eme, dị ka ùnu na-emere ya Jehova, ọ bụghị mmadụ.”​—Ndị Kọlọsi 3:23, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Ihe ọ bula unu na-eme, na-arụnụ ọrụ site ná mkpụrụ obi unu, dị ka unu na-arụrụ Onwenwe anyị ọrụ, ọ bụghịkwa mmadu.”​—Ndị Kọlọsi 3:23, Bible Nsọ nke Union Version.

Ihe Ndị Kọlọsi 3:23 Pụtara

 Onye Kraịst ga-agbalị na-arụsi ọrụ ike n’ihi na otú o si arụ ọrụ gbasara ofufe ọ na-efe Jehova Chineke.

 “Ihe ọ bụla unu na-eme.” Ndị chọrọ ife Jehova na-agba mbọ ime ihe Baịbụl kwuru n’ihe niile ha na-eme. Ha na-arụsi ọrụ ike, na-akwụwa aka ọtọ, ma bụrụ ndị a ga-atụkwasịli obi n’ihe niile ha na-eme kwa ụbọchị, ma n’ụlọ ha, ma n’ebe ha na-arụ ọrụ, ma n’ụlọ akwụkwọ.​—Ilu 11:13; Ndị Rom 12:11; Ndị Hibru 13:18.

 “Jirinụ obi unu niile na ike unu niile na-eme ihe ọ bụla unu na-eme.” Ọ bụ n’okwu Grik “na-akọwa otú mmadụ si kpebisie ike iji ike ya niile na-eme ihe Chineke chọrọ” a ka e si sụgharịta okwu bụ “jirinụ obi unu niile na ike unu niile.”

 Ụdị onye a na-eme ihe niile o nwere ike ime ka o jiri ike ya na uche ya niile rụọ ọrụ ọ bụla ọ na-arụ. Otú ụfọdụ Baịbụl si sụgharịa “jirinụ obi unu niile na ike unu niile” bụ “site na mkpụrụ obi unu” (Bible Nsọ nke Union Version) ma ọ bụ “sinụ n’ala-obi ụnụ” (Bible Nsọ Ọhụụ).​—Gụọ “ Ndị Kọlọsi 3:23 na Baịbụl dị iche iche.”

 “Dị ka ùnu na-emere ya Jehova, ọ bụghị mmadụ.” Ndi Kraịst na-eji ọrụ ọ bụla ha na-arụ akpọrọ ihe n’ihi na ha ma na ọ gbasara adịm ná mma ha na Jehova Chineke. Ihe kacha ha mkpa bụ ime ihe Jehova chọrọ, ọ bụghị ihe onye were ha n’ọrụ ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ chọrọ. Ọ bụrụ na Onye Kraịst ana-arụsi ọrụ ike, ma na-akpa àgwà ọma, ndị mmadụ ga na-ekwu okwu ọma gbasara ya nakwa gbasara Chineke ọ na-efe. Onye Kraịst ga-esi otu a mee ‘ka a ghara ikwu okwu ọjọọ gbasara aha Chineke.”​—1 Timoti 6:1; Ndị Kọlọsi 3:22.

Ihe Ndị Gbara Ndị Kọlọsi 3:23 Gburugburu

 Ọ bụ Ndị Kraịst bi na Kọlọsi oge ochie b ka Pọl onyeozi degaara akwụkwọ Ndị Kọlọsi. Ọ ga-abụ na ọ nọ na Rom dee ya malite n’ihe dị ka n’afọ 60 ruo 61 Oge Ndị Kraịst. N’oge ahụ, ọ fọrọ obere ka a tọhapụ ya na mkpọrọ nke mbụ a tụrụ ya.

 N’agbanyeghị ebe Ndị Kraịst si ma ọ bụ otú ihe si dịrị ha, ndụmọdụ dị n’akwụkwọ Ndị Kọlọsi ga-enyere ha aka ịdị n’otu ka ha na-efe Chineke. (Ndị Kọlọsi 3:11) Ọ gbara ha ume ka ha na-akpa àgwà ndị e ji mara Chineke, dị ka ịhụnanya, obiọma, na ebere. (Ndị Kọlọsi 3:12-14) O kwukwara otú ofufe mmadụ na-efe Chineke si kwesị ịgbasa ihe niile ọ na-eme ná ndụ.​—Ndị Kọlọsi 3:18–4:1.

 Otú Baịbụl Ndị Ọzọ Si Sụgharịa Ndị Kọlọsi 3:23

 “Ihe ọbụla ụnụ na-eme, jirinụ obi ụnụ na-eme ya dịka ọ bụ Dinwenụ ka ụnụ na-emere, ọ bụghị mmadụ.”​—Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

 “Ihe ọ bụla unu na-eme, na-arụnụ ọrụ site ná mkpụrụ obi unu, dị ka unu na-arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọ bụghịkwa mmadụ.”​—Bible Nsọ nke Union Version.

 “Ihe ọ bụla ụnụ na-eme, sinụ n’ala-obi ụnụ mee ya, dịka ọ̀ bụ̀ Onyenweayị ka ụnụ na-emere, ọ bụghị mmadụ.”​—Bible Nsọ Ọhụụ.

 Lee obere vidio a ka ị hụ ihe akwụkwọ Ndị Kọlọsi na-ekwu.

a Ihe a si n’akwụkwọ bụ́ Exegetical Dictionary of the New Testament, 1993, Mpịakọta nke 3, peeji nke 502.

b Obodo a dị n’ebe a na-akpọ Tọki n’oge a.