NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
È Nwere Ihe Ụdị Egwú M Na-akpọ Mere?
“Mgbe ọ bụla m jikechara ịgawa ebe m na-aga, m na-agbanye egwú. M banye n’ụgbọala, m gbanye egwú. Mgbe ọ bụla m nọ n’ụlọ na-ezu ike, na-ehicha ihe ma ọ bụ na-agụ akwụkwọ, m na-akpọnye egwú. M na-ege egwú mgbe ọ bụla.”—Carla.
Egwú ọ̀ na-amasị gị otú o si amasị Carla? Ya bụrụ otú ahụ, isiokwu a ga-enyere gị aka ịhụ uru egwú bara, otú ị ga-esi ezere nsogbu ndị dị́ na ya, na otú ị ga-esi na-akpachapụ anya ahọrọ ụdị egwú ị ga na-ege.
Uru egwú bara
E nwere ike iji ige egwú tụnyere iri nri. Iri nri bara uru ma iribiga ya oké na-akpata nsogbu. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ige egwú. Tụlee uru egwú bara:
Egwú nwere ike ime ka obi dị́ gị mma.
“Ọ bụrụ na obi adịghị m mma, m gbanyehaala egwú kacha atọ m ụtọ, obi na-adị m mma ozugbo.”—Mark.
Egwú nwere ike ime ka i cheta ihe mere n’oge gara.
“E nwere otu egwú ọ na-abụ m nụ, m cheta ihe mere m obi ụtọ n’oge gara aga. Obi na-adị m ezigbo ụtọ mgbe ọ bụla m nụrụ egwú ahụ.”—Sheila.
Egwú nwere ike ime ka ndị mmadụ na ibe ha dịrị n’otu.
“Mgbe m gara otu mgbakọ mba niile nke Ndịàmà Jehova, anyị mmiri gbara m mgbe ndị niile bịara ya na-abụ abụ mmechi. Anyị niile na-asụ asụsụ dị́ iche iche, ma abụ ahụ mere ka anyị dịrị n’otu.”—Tammy.
Egwú nwere ike ime ka ị mụta ịkpa ọtụtụ àgwà ọma.
“Ịmụ otú e si eji ngwá egwú akụ egwú na-eme ka mmadụ mụta inwe ndidi. Ọ bụghị ihe mmadụ na-amụta ngwa ngwa. Naanị ihe ga-eme ka mmadụ mụta ya bụ onye ahụ inwe ndidi.”—Anna.
Ị̀ maara? Akwụkwọ Baịbụl kacha buo ibu bụ akwụkwọ Abụ Ọma. Abụ dị́ na ya dị otu narị na iri ise.
Nsogbu ndị dị́ n’egwú
Ụfọdụ egwú dị ka nri mebiri emebi, ha nwere ike ịkpatara mmadụ nsogbu. Lee ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ.
Ihe a na-ekwu n’ọtụtụ egwú bụ gbasara omume rụrụ arụ.
“O yiziri ka egwú ndị kacha ewu ewu bụ ndị na-ekwu naanị gbasara mmekọahụ rụrụ arụ. Ha anaghịzidi ezo ọnụ.”—Hannah.
Baịbụl kwuru, sị: “Ka a ghara ịkpọtụdị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu aha n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 5:3) Jụọ onwe gị, sị: ‘Ụdị egwú m na-ege ọ̀ na-eme ka m ghara irube isi na ndụmọdụ a Baịbụl nyere?’
Egwú ụfọdụ nwere ike ime ka obi na-ajọ gị njọ.
“Mgbe ụfọdụ, m na-amụ anya n’abalị na-ege egwú na-eme ka m na-eche banyere ihe ndị na-eme ka ike ụwa gwụ m. Ụdị egwú a nwere ike ime ka ihe ọjọọ na-abata m n’obi.”—Tammy.
Baịbụl kwuru, sị: “Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị.” (Ilu 4:23) Jụọ onwe gị, sị: ‘Egwú m na-ege ọ̀ na-eme ka m chewe ihe na-adịghị mma n’obi m?’
Egwú ụfọdụ nwere ike ime ka ị na-ewe iwe.
“Egwú ndị na-eme ka mmadụ na-ewe iwe, kpọọ ndị ọzọ asị, ma ọ bụ leda onwe ya anya na-akpatara m nsogbu. M na-achọpụta na obi anaghị adịzi m mma ma m gehaala ụdị egwú ahụ. Ndị ezinụlọ anyị achọpụtakwala ya.”—John.
Baịbụl kwuru, sị: “Wepụnụ ha niile n’ebe unu nọ, ya bụ, ọnụma, iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị, wepụkwanụ okwu rụrụ arụ n’ọnụ unu.” (Ndị Kọlọsi 3:8) Jụọ onwe gị, sị: ‘Egwú m na-ege ọ̀ na-eme ka m na-ewe iwe ma ọ bụ ghara ịna-echebara ndị ọzọ echiche?’
Gịnị ka i kwesịrị ime? Na-ahọ ụdị egwú ị na-ege ahọ. Ọ bụ ihe otu nwa agbọghọ a na-akpọ Julie na-agbalị ime. Ọ sịrị: “M na-elerukarị egwú ndị m nwere anya, na-ewepụkwa nke ọ bụla na-adịghị mma. Ọ naghị adị mfe mgbe niile, ma ama m na ọ bụ ihe m kwesịrị ime.”
Otu nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Tara na-eme ụdị ihe a. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịna-akụ egwú ụda ya na-atọ ezigbo ụtọ na redio. Ma, m gee ntị nụ ihe ha na-agụ, m na-etinye redio ahụ n’ebe a na-eme ihe ọzọ. Ihe a m na-eme dị ka mmadụ ịgbụpụ nri dị́ ụtọ ọ kpụ n’ọnụ. Ma, ọ bụrụ na m nwee ike izere egwú ndị na-ekwu gbasara omume rụrụ arụ, ọ ga-adịrị m mfe izere ime omume rụrụ arụ. Achọghị m ịna-eche na e nweghị ihe ụdị egwú m na-ege nwere ike ime m.”