Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Nwoke na Nwaanyị Ịkpa—Nke 2: Gịnị Ka M Ga-atụ Anya Ya Ma Mụ na Mmadụ Kpawa?

Nwoke na Nwaanyị Ịkpa—Nke 2: Gịnị Ka M Ga-atụ Anya Ya Ma Mụ na Mmadụ Kpawa?

 Ka e were ya na e nwere onye ị hụrụ, ihe ya amasị gị, gị na ya ekwekọrịta ka unu kpawa iji lee ma ọ̀ ga-adabara unu ịlụ. Gịnị ka i kwesịrị ịna-atụ anya ya ka unu na-akpa?

Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a

 Tụwa anya na unu ga na-agwa ibe unu eziokwu ma unu kparịtawa ụka

 Gị na onye gị na ya na-akpa ga-amatakwu ọtụtụ ihe gbasara ibe unu ka unu na-anọrị. Ka ị na-ahụ otú o si akpa àgwà, ị ga-amata ụfọdụ n’ihe ndị ahụ.

 Ma, e nwere ụfọdụ ihe unu abụọ kwesịrị ikwurịta. Ka unu na-ekwurịta ha, ekwela ka otú obi dị gị kpaa ihe ndị unu ga-ekpebi aka, kama, jiri ihe ndị bụ́ eziokwu e ji n’aka leruo ihe unu na-ekwu anya ma kpebizie ihe ị ga-eme.

 Ụfọdụ n’ime ihe ndị unu kwesịrị ikwurịta bụ:

  •   Okwu ego. È nwere onye i ji ụgwọ? Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ ijide onwe gị ka ị ghara ịna-emefusị ego? Ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, olee otú gị na ya ga-esi na-ekpebi otú unu si akpata ego na otú unu si emefu ya?

  •   Ahụ́ ike. Ahụ́ ò siri gị ike? È nwere mgbe ị rịara nnukwu ọrịa n’oge gara aga?

  •   Ihe ndị i bu n’obi ime. Olee ihe ndị ị ga-achọ ime ná ndụ? Ọ̀ bụ ụdị ihe i bu n’obi ime ka onye gị na ya na-akpa bukwa n’obi ime? Unu mechaa lụọ, ị̀ ka ga na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na otú ihe si dịrị unu emee ka ị gharazie ime ihe ndị ahụ i bu n’obi ime?

  •   Ezinụlọ. È nwere onye ezinụlọ unu ọ bụ gị na-elekọta ugbu a? È nwere onye ị na-atụ anya na ọ bụ gị ga na-elekọta n’ọdịnihu? Ị̀ chọrọ ịmụ ụmụ? Ọ bụrụ na ị chọrọ, òle ka ị chọrọ ịmụ?

 Ka unu na-ekwurịta ihe ndị a, kwuo ihe ndị ị chọrọ ikwu otú ha dị gị n’obi, ha bụrụkwa eziokwu. Ezochila ihe ọ bụla ma ọ bụ tinye ihe ụfọdụ nnu na ose iji mee ka ihe gị dị onye gị na ya na-akpa mma.​—Ndị Hibru 13:18.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Olee ihe ndị i kwesịrị ịma gbasara onye gị na ya na-akpa? Olee ihe ndị o kwesịrị ịma gbasara gị? Olee otú ịna-agwa ibe unu eziokwu ugbu a ga-esi mee ka unu na-agwa ibe unu eziokwu ma unu mechaa lụọ?

 Ihe Baịbụl kwuru: “Na-agwarịtanụ ibe ụnụ eziokwu.”​—Ndị Efesọs 4:25, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

 Ariana, onye lụrụla di otu afọ ugbu a, kwuru, sị: “Nke nwaanyị nwere ike na-eche, sị, ‘Anyị kpaa ọnwa isii, anyị ekwe ibe anyị nkwa na anyị ga-alụ ibe anyị,’ ma nke nwoke nwere ike na-eche na ha ga-akparu otu afọ tupu ha ekwe ibe ha nkwa. Ụdị ihe a nwere ike ime ka obi na-ajọ nke nwaanyị ahụ njọ, ọ gaghịkwa ama ihe ọ ga-eme eme n’ihi na nke nwoke ekweghị ya nkwa ọsọ ọsọ otú ọ tụrụ anya ya. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka ha abụọ mara ihe ibe ha bu n’obi.”

 Tụwa anya na otú unu si ele ihe anya ga-adị iche

 E nweghị onye ya na ibe ya bụ otu. Echekwala na gị na onye gị na ya na-akpa ga-ekwekọrịta n’ihe niile ma ọ bụ na otú i si ele ihe anya ka ọ ga-esikwa na-ele ihe anya. Omenala unu na otú e si zụọ unu nwere ike ime ka otú unu si ele ihe anyị dị iche iche.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Ọ bụrụ na otú unu si ele ihe anya n’ụmụ obere ihe dị iche iche, ùnu ga-adị njikere ịgbanwe otú unu si ele ihe anya ka udo nwee ike ịdị ma ọ bụrụ na ime otú ahụ agaghị emebi iwu Chineke?

 Ihe Baịbụl kwuru: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesi.”​—Ndị Filipaị 4:5.

 Matthew, onye lụrụla nwaanyị afọ ise ugbu a, kwuru, sị: “N’agbanyeghị otú o si dị gị ka ùnu bụ nnu na mmanụ, unu ga-enwerịrị nghọtahie. Ọ dị mma ka mmadụ na onye ihe na-adabara ya na ya na-akpa, ma ihe ka mkpa bụ àgwà ha abụọ na-akpa mgbe ha na-enweghị otu olu.”

 Tụwa anya na gị na mmadụ ịkpa ga-achọ ọtụtụ ihe n’aka gị

 Gị na mmadụ ịkpa ga na-ewe gị oge, na-achọkwa ọtụtụ ihe n’aka gị. Gịnị ga-enyere gị aka?

 Emefela ihe ókè. Ekwela ka ọkpụkpa unu na-akpa rie gị nnọọ isi nke na ị gaghịzi na-elebara ihe ndị dịịrị gị ma ọ bụ ndị enyi gị ndị ọzọ anya. Alana, onye lụrụla di afọ ise ugbu a, kwuru, sị: “Ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, ndị enyi gị ka ga-adị gị mkpa, gịnwa ga-adịkwa ha mkpa. Ejikwala maka na e nweela onye gị na ya na-akpa legharazie ha anya.”

 Cheta na ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, i kwesịrị ịhazi otú ị ga-esi na-eme ihe niile dịịrị gị, wepụtakwara nke ọ bụla oge ya. Leenụ ma ị̀ ga-ebido ugbu a gị na mmadụ ka na-akpa haziwe ya.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Ị̀ na-achọ ka onye gị na ya na-akpa na-ewepụta oge karịrị akarị maka gị ma ọ bụ na-elebara gị anya gafee ókè? Ì chere na onye gị na ya na-akpa na-achọ ihe karịrị akarị n’aka gị? Gịnị ka unu ga-eme ka ike ghara ịgwụ onye ọ bụla n’ime unu ma ọ bụkwanụ ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ichewe na e kweghị ya ṅụrụ mmiri tọgbọ iko?

 Ihe Baịbụl kwuru: “E nwere oge kwesịrị ekwesị maka ihe ọ bụla, ihe ọ bụla a na-eme n’ụwa nwere oge.”​—Ekliziastis 3:1.

 Daniel, onye lụrụla nwaanyị afọ abụọ ugbu a, kwuru, sị: “Ọ bụrụ naanị ntụrụndụ bụ ihe ndị chọrọ ịlụ ibe ha na-emekọ ọnụ, ha mechaa lụọ, ha ga-ahụ na otú akị ilu si ada n’ọnụ abụghị otú o si atọ. Ndị chọrọ ịlụ kwesịrị ịna-emekọ ihe ndị dịịrị ha n’ụbọchị ọnụ, dị ka ịga zụta ihe n’ahịa, ịrụ ọrụ ndị dị n’ụlọ, na ife Chineke. Ihe a ga-eme ka ha mụta ịna-emekọ ihe ọnụ ma ha mechaa lụọ.”

 Cheta na ihe mere unu ji akpa bụ ka unu jiri oge ụfọdụ chọpụta ma ọ̀ ga-adabara unu ịlụ ka ọ̀ bụ na ọ gaghị adabara unu. Agba nke 3 n’isiokwu a ga-eleba anya n’ihe ndị i kwesịrị ichebara echiche tupu gị ekpebie nke ị ga-eme.