Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ike Ịga Akwụkwọ Agwụla M?

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ike Ịga Akwụkwọ Agwụla M?

 N’ụlọ akwụkwọ, e nwere ndị nkụzi na-anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́, a na-enye mmadụ nsogbu ka o mee ihe ọjọọ, na-ele ule ndị na-eme ka mmadụ na-echewasị isi, na-enyekwa mmadụ ihe omume karịrị akarị ọ ga-eme n’ụlọ. Ọ bụrụ na ike ịga akwụkwọ agwụla gị, ihe ndị a nwere ike ịbụ ezigbo ihe kpatara ya. a Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Rachel b kwuru, sị:

 “Ọ kaara m mma ị ga ebe ọ bụla ọzọ kama ịga ụlọ akwụkwọ. Ọ kaara m mma ịga na-egwu mmiri, ịga ka mụ na ndị enyi m nọrịa, ma ọ bụdị ịnọ na-enyere papa m na mama m aka na-esi nri ma ọ bụ na-asachasị ihe kama ịga ụlọ akwụkwọ.”

 Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ọ dị Rachel, oge ị na-aga akwụkwọ nwere ike ịdị gị ka à tụrụ gị mkpọrọ nakwa na naanị ihe ị ga-emeli bụ ịna-edi ya ruo ụbọchị ị ga-agụcha akwụkwọ. È nwere otú ọzọ ka mma mmadụ kwesịrị isi lee oge ọ na-aga akwụkwọ anya?

 Ị̀ ma ihe a? Ọ bụrụ na ị na-ele ịga akwụkwọ anya otú kwesịrị ekwesị, ọ ga-eme ka ị na-aga akwụkwọ maka na ị chọrọ ịga ya, ọ bụghị maka na i kwesịrị ịga ya. Ọ ga-emezi ka i were ịga akwụkwọ ka otú ị ga-esi mụta àgwà ndị ga-abara gị uru ma i too.

 Gbalịa lekwasị anya n’ihe ndị a ka i nwee ike ịna-ele ịga akwụkwọ anya otú dị mma:

 Ihe ndị ị na-amụta. Ka ị na-amụtakwu ihe, ị ga-ama otú ị ga-esi na-emeri nsogbu ndị ga-abịara gị n’ọdịnihu n’ebe ị ga-emecha rụwa ọrụ nakwa n’ebe ndị ọzọ. Ị gaghị na-eche ka ndị ọzọ gwa gị ihe ị ga-eme. Jụọ onwe gị, sị, ‘N’agbanyeghị na e nwere ihe ndị na-anaghị amasị m n’ụlọ akwụkwọ, olee ihe ndị bara uru m na-amụta na ya?’

 Ihe Baịbụl kwuru: “Jidesie ezigbo amamihe aka ike, na-echebakwara ihe echiche nke ọma.”​—Ilu 3:21.

 Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe a, gụọ isiokwu bụ́ “What if I’m Failing at School?

 Àgwà ndị ọ na-enyere gị aka ịna-akpa. I nwere ike isi n’ihe ndị a na-eme n’ụlọ akwụkwọ mụta otú ị ga-esi na-ahazi oge gị nke ọma, otú ị ga-esi na-arụ ahụ́ gị ụka, na otú ị ga-esi na-arụsi ọrụ ike. Àgwà ndị a ga-abakwaranụ gị uru ma i too. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú ihe ndị a na-eme n’ụlọ akwụkwọ si enyere m aka ịna-ahazi oge m nke ọma na ịna-arụsi ọrụ ike? È nwere ebe ndị m kwesịrị imezikwu ihe n’ihe ndị a?’

 Ihe Baịbụl kwuru: “Mmadụ na-erite uru ma ọ bụrụ na ọ na-arụsi ọrụ ike.”​—Ilu 14:23.

 Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe a, gụọ isiokwu bụ́ “How Can I Manage My Time?

 Otú gị na ndị ọzọ si emekọ ihe. I nwere ike isi n’otú gị na ụmụ klas unu si emekọ ihe mụta ịna-enwere ndị ọzọ ọmịiko na ịna-akwanyere ha ùgwù. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Joshua kwuru, sị: “Mmadụ ịmụta otú ya na ndị ọzọ ga-esi na-ekwurịta okwu dị mkpa otú ahụ ịmụ gbasara ihe ndị mere eme na sayensị dị. Ị mụta ya, ọ ga-abara gị uru ná ndụ gị niile.” Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ndị m mụtara n’ụlọ akwụkwọ gbasara otú mụ na ndị ọzọ ga-esi na-emekọ ihe, ma ndị mụ na ha na-esighị n’otu obodo ma ndị ihe ha kweere dị iche n’ihe m kweere?’

 Ihe Baịbụl kwuru: “Na-agbanụ mbọ ka unu na mmadụ niile na-adị n’udo.”​—Ndị Hibru 12:14.

 Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe a, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú M Ga-esi Mụtakwuo Otú E Si Akparịta Ụka nke Ọma?

 Ihe ị ga-eme n’ọdịnihu. Ịga akwụkwọ ga-enyere gị aka ịmata ebe ndị ị na-eme nke ọma nakwa iburu ebe ndị ahụ n’obi mgbe ị na-ekpebi ihe ndị ị ga-eme n’ọdịnihu. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Brooke kwuru, sị: “I nwedịrị ike ịmụta ọrụ ụfọdụ n’ụlọ akwụkwọ otú mụnwa mụtara, ị gụchazie akwụkwọ, gị arụwa ọrụ ahụ.” Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ọrụ m ga na-arụ ma m gụchaa akwụkwọ? Olee otú m ga-esi gbaa mbọ n’ụlọ akwụkwọ ka m mụta ihe ga-enyere m aka ịna-arụ ọrụ ahụ?’

 Ihe Baịbụl kwuru: “Mee ka ụzọ ị na-aga dị larịị.”​—Ilu 4:26.

a Ọ bụrụ na ị naghị aga ụlọ akwụkwọ, ma papa gị ma ọ bụ mama gị na-akụziri gị ihe niile a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ n’ụlọ, ọtụtụ n’ime ihe ndị e kwuru n’isiokwu a ga-abara gị uru.

b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.