NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
Ịkpọ Mmadụ Iyi Ọ̀ Dị Njọ nke Otú Ahụ?
“M na-anụkarị ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha iyi nke na o nweghịzi ihe m ji ya kpọrọ. Ọ dịzi m ka o nweghị ihe o mere.”—Chibụike, ọ dị afọ iri na asaa.
“Mgbe m dị obere, m na-akpọkarị ndị mmadụ iyi. Ọ naghị ara ahụ́ mmadụ ịmụta ịkpọ ndị ọzọ iyi, ma ọ na-esi ike nkwụsị.”—Ngọzi, ọ dị afọ iri na itoolu.
Ajụjụ
Olee otú obi na-adị gị ma ị nụ ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha iyi?
Anadịghị m ama nke bụ́ ịkpọ iyi ma ọ bụ okwu ọjọọ n’ihi na ọ naghị emetụ m n’ahụ́.
Ahụ́ anaghị erucha m ala, mana m na-ewere ya otú ahụ.
Obi na-ajọ m njọ, o nweghị ike ịmara m ahụ́.
Ugboro ole ka ị na-akpọ mmadụ iyi?
Anatụdịghị m akpọ mmadụ iyi
Mgbe ụfọdụ
Mgbe niile
Olee otú i si ele mmadụ ịkpọ ibe ya iyi anya?
Ọ bụghị oké ihe
Ọ jọka
Ihe mere ịkpọ mmadụ iyi ma ọ bụ ikwu okwu ọjọọ ji dị njọ
Ì lere mmadụ ịkpọ ibe ya iyi anya ka ihe jọgburu onwe ya? I nwere ike ịsị mba. ‘A sị ka e kwuwe, e nwere nsogbu ndị ka njọ na-echu anyị ụra. Ihe ọzọ bụ na onye ọ bụla na-eme ya.’ Ma, ọ̀ bụ eziokwu?
Ma ị̀ ma ma ọ bụ na ị maghị, e nwere ọtụtụ ndị na-anaghị akpọ ibe ha iyi. Ma, o nwere ezigbo ihe ndị ọzọ na-amaghị mere na ha anaghị akpọ ndị ọzọ iyi. Dị ka ihe atụ:
Ihe iyi ị na-akpọ mmadụ na-egosi. Ihe ị na-ekwu na-egosi ihe dị gị n’obi. Ịkpọ mmadụ iyi nwere ike igosi na ị naghị echebara ndị ọzọ echiche. Ọ̀ bụ ụdị mmadụ ahụ ka ị bụ n’eziokwu?
Baịbụl sịrị: “Ihe ndị na-esi n’ọnụ apụta na-esi n’obi.”—Matiu 15:18.
Ịkpọ mmadụ iyi nwere ike ime ka ndị ọzọ lewe gị anya ọjọọ. Otu akwụkwọ aha ya bụ Cuss Control kwuru, sị: “Ihe anyị na-ekwu nwere ike ikpebi ụdị enyi anyị ga-enwe, otú ndị ezinụlọ anyị na ndị ọrụ ibe anyị ga-esi na-akwanyere anyị ùgwù, otú anyị na ndị mmadụ ga-adịru ná mma, na otú a ga-esi jiri anyị kpọrọ ihe. O nwekwara ike ikpebi ma ànyị ga-enweta ọrụ ma ọ bụ na anyị agaghị enweta, ma à ga-ebuli anyị n’ọkwá ma ọ bụ na a gaghị ebuli anyị, kpebiekwa otú ndị anyị na-amaghị ga-esi akpaso anyị àgwà.” Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Jụọ onwe gị ma gị na ndị mmadụ agaghị adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na ị naghị akpọ mmadụ iyi.”
Baịbụl sịrị: “Wepụnụ . . . okwu mkparị.”—Ndị Efesọs 4:31.
Echela na ịkpọ mmadụ iyi ga-eme ka ndị mmadụ chee na ị ma ihe. Otu nwoke aha ya bụ Alex Packer kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ How Rude!, sị: “Ndị mmadụ anaghị achọ ige onye na-akpọkarị ndị ọzọ iyi ntị.” O kwukwara na mmadụ ịna-ekwukarị okwu ọjọọ “ga-eme ka onye ahụ na-ekwu okwu ka onye na-enweghị uche, ma ọ bụ onye ihe banyere ndị ọzọ na-anaghị emetụ n’ahụ́. Ọ bụrụ na ị naghị eche echiche ekwu okwu ma ọ bụ na ị naghị ekwu ihe doro anya, ọ ga-emetụta otú uche gị si arụ ọrụ.”
Baịbụl sịrị: “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta.”—Ndị Efesọs 4:29.
Ihe i nwere ike ime
Kwuo otú ị ga-esi akwụsị ya. Ọ́ gaghị adị mma ka i jiri otu ọnwa ma ọ bụ ihe na-erughị ya kwụsị ikwu okwu ọjọọ? N’ọnwa ahụ, kanye ihe n’ụbọchị ndị ị na-ekwughị okwu ọjọọ na kalenda ma ọ bụ na chaatị. Ka i nwee ike ịnọgide ná mkpebi i mere ịkwụsị ịna-ekwu okwu ọjọọ, o nwere ihe ọzọ ị ga-eme. Dị ka ihe atụ:
Zere ntụrụndụ ndị nwere ike ime ka okwu ọjọọ ju gị isi. Baịbụl kwuru, sị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Ndị Kọrịnt 15:33) E wepụ mmadụ na ibe ya ịna-akpa, ihe ndị ọzọ so ná mkpakọrịta bụ ile fim, igwu egwuregwu vidio, na ige egwú. Otu nwa okorobịa dị afọ iri na asaa aha ya bụ Okeke, kwuru, sị: “Ọ dị mfe mmadụ ịna-agụ ihe ọ na-ege n’egwú na-amasị ya, ma leghara okwu ọjọọ ndị dị na ya anya naanị n’ihi na ụda ya na-atọ ya ụtọ.”
Kpaa àgwà ka onye ṅụjuru mmiri ara afọ. Ụfọdụ na-ekwu okwu ọjọọ n’ihi na ha chere na ọ ga-eme ka ndị mmadụ were ha ka ndị dimkpa. Ma, ọ bụghị eziokwu. Baịbụl kwuru na ‘ndị tozuru okè na-azụ ikike nghọta ha azụ, site n’iji ya eme ihe, ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.’ (Ndị Hibru 5:14) Ha anaghị eme ihe ha maara na-adịghị mma naanị ka ndị ọzọ too ha.
N’eziokwu, mmadụ ikwu okwu ọjọọ na-eme ka onye ahụ na-eche ihe na-adịghị mma. Ndị na-ekwu okwu ọjọọ n’ụwa a ka nkụ. Akwụkwọ ahụ a na-akpọ Cuss Control kwuru, sị, “Esola ha. Gbalịa ka ị na-ekwu okwu dị mma. Ahụ́ ga-eru gị ala, ruokwa ndị ọzọ ala ma gị na ha nọrọ.”