NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
Ì Kwesịrị Ikwe Nkwa Na Ị Gaghị Enwe Mmekọahụ?
Gịnị bụ mmadụ ikwe nkwa na ya agaghị enwe mmekọahụ?
N’obodo ụfọdụ, ndị na-eto eto na-edejupụta akwụkwọ ma ọ bụ jiri ọnụ ha kwee nkwa na ha agaghị enwe mmekọahụ ruo mgbe ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye.
Ọtụtụ ndị matara banyere ihe a n’afọ 1990, mgbe Southern Baptist Convention dị n’Amerịka malitere ihe omume ha kpọrọ “True Love Waits,” ya bụ, “Ezigbo Ịhụnanya Na-enwe Ndidi.” N’ihe omume ahụ, ha na-agwa ndị na-eto eto ka ha na-eme ihe dị mma, jirikwa ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru na-agba ha ume ka ha ghara inwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye.
Ka obere oge gara, a malitere ihe omume ọzọ yiri nke mbụ ahụ. Ma na nke a, a na-enye ndị kwere nkwa ahụ mgbaaka ọlaọcha iji gosi na ha ekweela nkwa ahụ nakwa ka ọ na-echetara ha na ha agaghị enwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye.
Nkwa a ọ̀ na-eme ka ndị na-eto eto ghara inwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye?
Ihe ndị mmadụ na-aza dị iche iche.
Christine C. Kim na Robert Rector kwuru na ‘ọtụtụ nchọpụta e mere gosiri na nkwa a ndị na-eto eto na-ekwe na-eme ka ha ghara ịmalite na nwata nwewe mmekọahụ ma ọ bụ ka ha na-enwe ya naanị mgbe ụfọdụ.’
Nchọpụta ndị Guttmacher Institute mere gosiri na ndị na-eto eto kwere nkwa a nwere ike inwewe mmekọahụ otú ahụ ndị nke na-ekweghị ya na-eme.
Gịnị mere nchọpụta ndị e mere ji ekwu ihe dị iche iche?
N’ụfọdụ nchọnchọ ndị e mere, ndị e ji mee ha bụ ndị kwere nkwa a na ndị nke na-ekweghị nkwa a, ma ha niile na-ele inwe mmekọahụ anya otú dị iche iche.
Ná nchọpụta ndị ọzọ, ọ bụ ndị kwere nkwa ahụ na ndị na-ekweghị ka e ji mee ya, ma ha kweere otu ihe banyere inwe mmekọahụ.
Olee ihe nchọpụta ndị e ji ndị kweere otu ihe mee na-egosi? Dr. Janet Rosenbaum, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ahụ́ ike ndị na-eto eto, kwuru na afọ ise ndị na-eto eto ji kwe nkwa a gachaa, anaghịzi enwe ihe dị iche ná ndị kwere nkwa ahụ na ndị nke na-ekweghị.
Ihe ka mma ị ga-eme
Ndị malitere ihe gbasara ikwe nkwa enweghị mmekọahụ nwere ezigbo ihe ha bu n’obi. Ma, nsogbu dị na ya bụ na ha anaghị akụziri ndị na-eto eto ihe ndị ga-enyere ha aka imezu nkwa ahụ. Dr. Rosenbaum kwuru na ọtụtụ n’ime ndị na-ekwe nkwa a ejighị obi ha niile eme ya. Ọ sịrị na ọ bụ onye ọ bụla n’otu n’otu ga-eji aka ya kpebie na ọ gaghị enwe mmekọahụ tupu ọ lụọ di ma ọ bụ nwunye ọ bụghị ide ya n’akwụkwọ.
Baịbụl gbakwara anyị ume iji aka anyị kpebie na anyị agaghị enwe mmekọahụ. Ma ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka ime ya abụghị ịgwa ha ka ha dejupụta akwụkwọ ma ọ bụ jiri ọnụ kwee nkwa, kama ọ bụ inyere ha aka ‘ịzụ ikike nghọta ha azụ,’ ka ha nwee ike ịmata ihe dị iche n’ihe dị́ mma na ihe na-adịghị mma. (Ndị Hibru 5:14) A sị ka e kwuwe, ịjụ inwe mmekọahụ tupu mmadụ alụọ di ma ọ bụ nwunye abụghị naanị ka onye ahụ zere ibute ọrịa na afọ ime, kama ọ bụkwa otu n’ime ụzọ onye ahụ si akwanyere Chineke, bụ́ onye malitere alụmdi na nwunye, ùgwù.—Matiu 5:19; 19:4-6.
Iwu ndị dị na Baịbụl na-abara anyị uru. (Aịzaya 48:17) N’agbanyeghị afọ ole anyị dị, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ikpebisi ike ịna-erube isi n’iwu Chineke nyere ka anyị ‘gbaara ịkwa iko ọsọ.’ (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Mgbe onye ahụ lụziri di ma ọ bụ nwunye, obi ga-eru ya ala, ọ gaghịkwa na-echegbu onwe ya ma ọ bụ na-akwa mmakwaara otú ahụ ndị nwere mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye na-eme.