Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Àbụ M A Kwaa A Kwụrụ?

Àbụ M A Kwaa A Kwụrụ?

 Ị̀ bụ onye na-edili nsogbu bịaara gị? Ò nweela otu n’ime ihe ndị a mere gị . . .

  •   onye ị hụrụ n’anya ịnwụnahụ gị?

  •   ọrịa na-ekweghị ala ala?

  •   ọdachi ndị na-emere onwe ha?

 Ndị ọkachamara sịrị na ọ bụghị naanị mgbe nnukwu nsogbu bịaara mmadụ ka onye ahụ kwesịrị ịmụta ịbụ a kwaa a kwụrụ. Obere obere nsogbu ndị ị na-enwe n’ụbọchị nwedịrị ike ịkpatara gị ọrịa. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka ị mụta idi nsogbu, ma ọ̀ bụ nke obere ma ọ̀ bụ nke nnukwu.

 Gịnị ka ịbụ a kwaa a kwụrụ pụtara?

 Ịbụ a kwaa a kwụrụ bụ mmadụ inwe ike idi nsogbu ndị bịaara ya na ihe ndị gbanwere ná ndụ ya. Nke a apụtaghị na nsogbu anaghị abịara onye bụ a kwaa a kwụrụ. Kama ihe ọ pụtara bụ na onye ahụ na-enwe ike isi ná nsogbu ahụ pụta, sikwuo ike karịa ka o siri na mbụ, ọ sọgodị ya ya bụrụ na o mere ka ihe ụfọdụ siere ya ike.

Oké ifufe fewe, osisi ụfọdụ na-ehulatacha ma mechaa kwụrụkwa. Otú ahụ ka gịnwa nwere ike imecha nweta onwe gị ma nsogbu bịaara gị kwụsị

 Gịnị mere ịbụ a kwaa a kwụrụ ji dị mkpa?

  •   N’ihi na nsogbu na-abịara onye ọ bụla. Baịbụl sịrị: “Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ, . . . ọ bụghịkwa ndị nwere amamihe na-enweta ihu ọma; n’ihi na oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.” (Ekliziastis 9:11) Gịnị ka nke a na-akụziri anyị? Na ndị ezigbo mmadụ na-ata ahụhụ, ọtụtụ mgbe kwa, ọ bụghị n’ihi na e nwere ihe ọjọọ ha mere.

  •   N’ihi na mmadụ ịbụ a kwaa a kwuru na-echebe ya. Otu nwoke na-enye ụmụ akwụkwọ kọleji ndụmọdụ sịrị: “A na-enwekarịzi ụmụ akwụkwọ ndị na-abịa n’ọfis m ike ụwa gwụrụ n’ihi na ha emetachaghị nke ọma n’ule ma ọ bụ n’ihi ihe na-adịghị mma onye ọzọ dere gbasara ha tinye n’Ịntanet.” A bịagodị n’obere nsogbu ndị a e weere na o nweghị ihe ha bụ, ọ sịrị na o nwere ike ịkpatara nwa akwụkwọ na-amaghị otú esi edi nsogbu ndị bịaara ya “ọrịa dị iche iche ma ọ bụdị mee ka isi ghara ịkpakọchazi ya ọnụ.” a

  •   Ịmụta ịbụ a kwaa a kwụrụ ga-abara gị uru ma ugbu a ma mgbe ị ghọrọ dimkpa. Otu dọkịta aha ya bụ Richard Lerner kwuru gbasara ihe ndị gbawara mmadụ obi. Ọ sịrị: “Ihe ga-eso mee ka ihe gaziere mmadụ, ya ana-emekwu nke ọma, bụ ma o wepụ obi n’ihe mere ya ma gbaa mbọ nweta onwe ya, chọta ihe ndị ọzọ ọ ga-eme ma ọ bụ chọọ ụzọ ọzọ ọ ga-esi mezuo ihe ahụ o bu n’obi ime.” b

 Olee otú ị ga-esi mụta ịbụ a kwaa a kwụrụ?

  •   Chọpụta otú nsogbu gị haruru. Mata mgbe e nwere nnukwu nsogbu na mgbe nsogbu dịnụ bụ nke obere ya. Baịbụl sịrị: “Ọ bụ onye nzuzu na-egosipụta iwe ya n’otu ụbọchị ahụ, ma onye maara ihe na-ekpuchi ihe ihere.” (Ilu 12:16) Ọ bụghị nsogbu niile ka ị ga-ekwe ka o chegbuwe gị.

     Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Joanne sịrị: “N’ụlọ akwụkwọ anyị, e nwere ụmụ klas anyị ndị ọ na-abụ e nwee obere ihe merenụ, ha ana-ekwu gbasara ya ka à ga-asị na ọ bụ ihe dị oké mkpa. Ndị enyi ha n’Ịntanet gwazie ha na ihe ahụ ha kwuru dị mma, ha esiwekwuo ọnwụ gbasara ya. Ọ na-emezi ka o sikwuoro ha ike ịna-ejide onwe ha ma ha nwee nsogbu.”

  •   Mụta ihe n’aka ndị ọzọ. Otu ilu Baịbụl sịrị: “Ọ bụ ígwè ka a na-eji amụcha ígwè. Otú ahụ ka ihu mmadụ na-amụcha ihu mmadụ ibe ya.” (Ilu 27:17) E nwere ọtụtụ ihe ndị dị mma anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị dirila nsogbu ndị tara akpụ.

     Nwa agbọghọ aha ya bụ Julia sịrị: “Gị na ndị ọzọ na-ekwu okwu, ị ga-achọpụta na e nweela ọtụtụ nsogbu bịaara ha ná ndụ ma ha emerichaa ha. Gị na ha kparịta ụka ka ị chọpụta ihe ndị ha mere n’oge ha nwere nsogbu ndị ahụ ma ọ bụ ihe ndị ha emeghị n’oge ahụ.”

  •   Nwee Ndidi. Baịbụl sịrị: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.” (Ilu 24:16) Ọ na-ewe oge tupu onye ihe mere ewere ụwa ya otú o si hụ ya. N’ihi ya, ya ejula gị anya ma e nwee ụbọchị ụfọdụ obi ga na-ajọ gị njọ. Ihe kacha mkpa ma ị daa bụ ‘ka i bilie.’

     Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Andrea sịrị: “Onye ihe mere nwetawa onwe ya, ihe ahụ na-eji nwayọọ nwayọọ na-apụ ya n’obi, obi adịwakwa ya mma. Ọ bụghị ihe na-eme otu ụbọchị. Ọ na-ewe oge. Achọpụtala m na ọ bụ nwayọọ nwayọọ ka onye ihe mere ga na-enwetakwu onwe ya ka oge na-aga.”

  •   Mụta ịna-ekele Chineke. Baịbụl sịrị: ‘Gosinụ na unu bụ ndị nwere ekele.’ (Ndị Kọlọsi 3:15) Otú ọ sọkwara ihe ya si siere gị ike, a ga-enwerịrị ihe ndị i nwere ike iji maka ha kelee Chineke. Gbalịa cheta ihe atọ mere ndụ ị dị ji na-atọ gị ụtọ.

     Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Samantha sịrị: “Nsogbu bịara mmadụ, ọ naghị ara ahụ́ onye ahụ ajụwa onwe ya, sị, ‘Gịnị mere o ji bụrụ m ka ụdị ihe a na-eme?’ Otu ihe dị mkpa na-eme ka mmadụ bụrụ a kwaa a kwụrụ bụ na onye ahụ agaghị anọ na-eche banyere nsogbu ya mgbe niile. Ihe ka mma bụ icheta na ihe ga-emecha dị mma nakwa ịna-ekele Chineke maka ihe ndị i nwere na ihe ndị ị ga-emeli.”

  •   Gbalịa ka ihe i nwere ju gị afọ. Pọl onyeozi sịrị: “Amụtawo m inwe afọ ojuju n’ọnọdụ ọ bụla m nọ na ya.” (Ndị Filipaị 4:11) O nweghị ihe Pọl ga-emeli banyere nsogbu ndị bịaara ya. Ma ihe ọ ga-emeli ihe na ya bụ otú yanwa si were nsogbu ahụ. Pọl kpebiri na ihe ndị ya nwere ga-eju ya afọ.

     Otu nwa okorobịa aha ya bụ Matthew sịrị: “Otu ihe m chọpụtara gbasara onwe m bụ na nsogbu bịara m, otú m si ewere ya ná mbido anaghị adịcha mma. Ihe m na-agbalịzi ime ugbu a bụ ịmụta na ihe ga-emecha dị mma ma e nwee ihe ọ bụla merenụ. M mee nke a, ọ ga-abara ma mụ ma ndị ọzọ nọ m nso uru.”

  •   Kpee ekpere. Baịbụl sịrị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.” (Abụ Ọma 55:22) Ikpe ekpere abụghị ihe mmadụ na-eme naanị ka obi dị ya mma. Ọ bụ otú i si agwa Onye Kere gị okwu, n’ihi na ‘ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’​—⁠1 Pita 5:⁠7.

     Otu nwa okorobịa aha ya bụ Carlos sịrị: “Ọ bụghị naanị m kwesịrị ịna-ebu nsogbu ndị m na-enwe. Ọ bụrụ na m kpee ekpere kọọrọ Chineke nsogbu m niile na otú ọ dị m n’obi ma keleekwa ya maka ihe ọma ndị o meere m, ọ na-enyere m aka iwepụ echiche na-adịghị mma n’obi m ma mee ka m lekwasị anya n’ihe ndị Jehova na-emere m. Ekpere dị nnọọ ezigbo mkpa!”

a O si n’akwụkwọ a kpọrọ Disconnected, nke Thomas Kersting dere.

b O si n’akwụkwọ bụ́ The Good Teen​—⁠Rescuing Adolescence From the Myths of the Storm and Stress Years.