Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Nwoke na Nwaanyị Ịkpa—Nke 3: Ànyị Kwesịrị Ịkwụsị Ịkpa?

Nwoke na Nwaanyị Ịkpa—Nke 3: Ànyị Kwesịrị Ịkwụsị Ịkpa?

 O tetụla gị na mmadụ kpawara, ma ị na-enwezi obi abụọ. Ùnu ka kwesịrị ịna-akpa ka ùnu ga-akwụsị ịkpa? E wepụtara isiokwu a ka o nyere gị aka ikpebi ihe ị ga-eme.

Ihe ndị a ga-ekwu n’isiokwu a

 Ihe unu kwesịrị ime ma i nwewe obi abụọ

 Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị akpawa, ha nwere ike ịchọpụta ka oge na-aga na ihe anaghị adabachara ha otú ha cheburu. Dị ka ihe atụ:

  •   O nwere ike ịna-amasị otu onye n’ime ha ịna-aga egwu mmiri, na-amasị onye nke ọzọ ịna-aga elegharị anya.

  •   O nwere ike ịbụ na otu onye n’ime ha na-achọ ka ya na ndị ọzọ na-ekwurịta okwu mgbe niile, ma onye nke ọzọ na-achọkarị ịnọrọ onwe ya.

  •   A naghị ejicha otu onye n’ime ha n’aka, ma onye nke ọzọ na-akwụwa aka ọtọ mgbe niile.

 Ị ga-achọpụta na nke ọ bụla n’ihe atụ atọ a dị iche n’ibe ya. N’ihe atụ nke mbụ, ihe na-amasị ha dị iche iche; na nke abụọ otú ha si akpa àgwà dị iche iche; na nke atọ ihe ha ji kpọrọ ihe dị iche iche.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Olee nke n’ime ihe atụ atọ ahụ ga-aka abụrụ gị nsogbu ma ọ bụrụ na unu alụọ? Ọ bụrụ na e nwere nke n’ime ha unu ga-eji maka ibe unu gbanwetụ ihe ụfọdụ, olee nke ọ bụ?

 Di na nwunye nwere ike ịna-ebi n’udo n’agbanyeghị na ihe na-amasị ha na àgwà ha dị iche iche. A sị ka e kwuwe, ihe ịdabara unu apụtaghị na e nweghị ihe unu abụọ ji dị iche n’ibe unu. Mgbe ụfọdụ, di na nwunye na-agba mbọ ka ihe na-amasị otu onye n’ime ha masịwa ibe ya ma ọ bụdị ka àgwà otu onye n’ime ha na-akpa bawara onye nke ọzọ uru. a

 Ma, o kwesịrị ịbụ ihe ndị i ji kpọrọ ihe ka onye ga-abụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ji kpọrọ ihe, ya bụ, ihe ndị i kweere gbasara ife Chineke, ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, na otú e kwesịrị isi na-ebi ndụ. Ọ bụrụ na ihe ndị i ji kpọrọ ihe abụghị ihe ndị o ji kpọrọ ihe, ọ pụtara na nsogbu dị.

 Dị ka ihe atụ, chegodị ihe ga-eme ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye ji ihe gbasara okpukpe kpọrọ ihe ma onye nke ọzọ ejighị. Akwụkwọ bụ́ Fighting for Your Marriage kwuru, sị: “Nchọpụta e mere egosila ọtụtụ ugboro na ndị di na nwunye na-anaghị ekpe otu okpukpe na-agbakarị alụkwaghịm.”

 Ihe Baịbụl kwuru: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu, n’ihi na unu na ha abụghị otu.”​—2 Ndị Kọrịnt 6:14.

 Ikpebi ihe unu ga-eme

 Baịbụl kwuru na ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye “ga-enwe ọtụtụ nsogbu.” (1 Ndị Kọrịnt 7:28) N’ihi ya, ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na unu na-enwetụ nsogbu ugbu a unu ka na-akpa.

 Ọ bụrụ na unu na-esetụ obere okwu ugbu a, ọ pụtaghị na unu agaghị na-ebi n’udo ma unu mechaa lụọ. Ajụjụ dị mkpa unu kwesịrị ịza bụ, Ùnu ga-edozili esemokwu ndị ahụ n’udo? N’eziokwu, unu mụta otú unu ga-esi na-edozi esemokwu ugbu a, ọ ga-abara unu uru ma unu mechaa lụọ.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Na-enwerenụ ibe unu obiọma, na-enwekwanụ obi ebere. Na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam.”​—Ndị Efesọs 4:32.

 Ma, ọ bụrụ na unu na-ese ezigbo okwu, na-esekwa ya mgbe niile, o nwere ike ịpụta na ihe agaghị adabara unu abụọ. N’ihi ya, ọ ga-aka mma ka unu chọpụta ma ihe ọ̀ na-adabara unu ugbu a unu ka na-akpa karịa ịchọpụta ya mgbe unu lụrụla.

Ọ bụrụ na unu na-ese ezigbo okwu, na-esekwa ya mgbe niile, o nwere ike ịpụta na ihe agaghị adabara unu abụọ

 Ihe i kwesịrị iburu n’obi: Agbachila nkịtị ma ọ bụrụ na ọ na-eme gị ezigbo obi abụọ ma ihe ọ̀ ga-adabakwara gị na onye gị na ya na-akpa ma ọ bụkwanụ ma ị̀ dịla njikere ịlụ di ma ọ bụ nwunye.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Onye ma ihe hụ nsogbu, ọ na-aga zoo, ma ndị na-amaghị ihe na-agara banye ná nsogbu, ha na-atakwa ahụhụ ya.”​—Ilu 22:3.

 Ọ bụrụ na unu kpebiri ịkwụsị ịkpa

 Obi nwere ike ịgbawa nwoke na nwaanyị ma ha kwụsị ịkpa. Ma, ọ bụrụ na ọ na-emesi otu onye n’ime unu ma ọ bụ unu abụọ obi abụọ ike ma ihe ọ̀ ga-adabakwara unu, o nwere ike ịkara unu mma ịkwụsị ịkpa.

 Olee otú unu kwesịrị isi eme ya? Unu ekwesịghị izigara ibe unu ozi n’ekwentị ma ọ bụ na iimel iji kwuo na unu agaghịzi na-akpa, ọ gwụkwala ma ọ bụ na e nweghị ihe ọzọ unu ga-emeli. Kama ime otú ahụ, ọ ga-aka mma ka unu kpebie oge dị mma na ebe ga-adaba adaba unu ga-anọ kwurịta ihe a dị ezigbo mkpa.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Na-agwanụ ibe unu eziokwu.”​—Zekaraya 8:16.

 Na unu abụọ kwụsịrị ịkpa ọ̀ pụtara na o nweghịzi ihe ị dị mma ya? Mba. Ị manụ na ihe mere unu ji kpawa bụ ka unu mara ma ọ̀ ga-adabara unu abụọ ịlụ. Ọ bụrụgodị na gị na onye gị na ya na-akpa akwụsị ịkpa, i nwere ike isi n’ihe ahụ mere unu mụta ihe.

 Jụọ onwe gị, sị: ‘N’oge a anyị abụọ nọ na-akpa, gịnị ka m mụtara gbasara onwe m? Ihe ndị mere n’oge anyị na-akpa ọ kụziiri m ihe ndị m kwesịrị imekwu nke ọma na ha? Olee ihe ndị m mere m na-agaghị eme ma mụ na onye ọzọ kpawa?’