Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Ihe M Ga-eme Ka Uche M Na-adị n’Otu Ihe?

Olee Ihe M Ga-eme Ka Uche M Na-adị n’Otu Ihe?

 Gịnị mere na uche m anaghị adịli n’otu ihe?

 “Anaghị m agụzi akwụkwọ otú m si agụbu. Ọ na-esiziri m ike ịgụcha paragraf toro ogologo.”​—Elaine.

 “M na-ele vidio, ọ na-adị m ka ọ naghị agasi ike, m na-achọkwa ime ya ka ọ gasiwe ike.”​—Miranda.

  “Mgbe ọ bụla m na-eme otu ihe dị mkpa, ekwentị m mehaala mkpọtụ, naanị ihe m na-echewezi mgbe ahụ bụ, ‘Ònye ziteere m ozi?’”​—Jane.

 Ekwentị na ihe ndị yiri ya, hà nwere ike ime ka uche gị ghara ịdị n’ihe ị na-eme? Ụfọdụ sị na o nwere ike. Nicholas Carr, bụ́ onye na-ede akwụkwọ na onye bụ́ ọkachamara n’otú ụlọ ọrụ ga-esi na-eme nke ọma, sịrị: “Ịgakarị n’Ịntanet na-eme ka uche anyị na-apụkarị n’ihe anyị na-eme. Ọ na-eme ka anyị na-achọkarị ka ihe niile na-aga ọsọ ọsọ n’enweghị nsogbu, ma uche anyị agaghị adịcha n’ihe ahụ anyị na-eme.” a

 Ka anyị hụ ụzọ ebe atọ ekwentị na ihe ndị yiri ya nwere ike isi mee ka uche gị ghara ịdị n’ihe ị na-eme.

  •   Mgbe gị na mmadụ na-akparịta ụka. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Maria, sịrị: “Ụfọdụ ndị na-ezipụ ozi ma ọ bụ na-egwu egwuregwu vidio ma ọ bụdị na-awagharị n’Ịntanet n’ekwentị ha mgbe ha na ndị ọzọ na-akparịta ụka. Ha anaghịdị ege ntị n’ihe onye ha na ya na-akparịta ụka na-ekwu.”

  •   Mgbe ị nọ na klas na-amụ ihe. Otu akwụkwọ a kpọrọ Digital Kids, sịrị: “Ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ kwuru na ha na-eji ekwentị ha ezipụ ozi, na-achọ ihe n’Ịntanet, na-ele fim ma ọ bụ na-ege egwú mgbe a na-akụziri ha ihe na klas.” Ha ji ekwentị ha na-eme “ihe na-agbasaghị ihe a na-akụziri ha n’ụlọ akwụkwọ.”

  •   Mgbe ị na-amụ ihe n’onwe gị. Otu nwa okorobịa, dị afọ iri abụọ na abụọ, aha ya bụ Chris, sịrị: “Ihe na-akacha esiri m ike bụ ịkwụsị ile anya n’ekwentị m mgbe ọ bụla o mere mkpọtụ.” Ọ bụrụ na ị bụ nwa akwụkwọ, otu ihe onye nkụzi nyere gị mee n’ụlọ nke kwesịrị iwe gị otu awa, nwere ike iwe gị awa atọ ma ọ bụ karịa ma ọ bụrụ na ekwentị gị na-eme ka uche gị ghara ịdị n’ihe ị na-eme.

 Nke bụ́ eziokwu bụ: Ọ ga-esi ike uche gị adị n’ihe ị na-eme ma ọ bụrụ na ị na-ekwe ka ekwentị gị na-atụrụ gị ụka ma na-eme ka uche gị pụọ n’ihe ị na-eme.

Uche na-anaghị adịli n’otu ihe dị ka ịnyịnya ara. Ọ bụ ya na-ekpebi ebe ọ ga-ebuga onye nwe ya

 Ihe ndị m ga-eme ka uche m nwee ike ịna-adị n’otu ihe

  •   Mgbe gị na mmadụ na-akparịta ụka. Baịbụl sịrị: “Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.” (Ndị Filipaị 2:4) Mgbe gị na mmadụ na-akparịta ụka, na-ege ya ntị nke ọma, i mee otú ahụ, ị na-egosi ya na i ji ya kpọrọ ihe. Na-ele ya anya n’ihu, ekwekwala ka ekwentị gị mee ka uche gị pụọ n’ihe unu na-ekwu.

     “Mgbe gị na mmadụ na-akparịta ụka, gbalịa ka anya gị ghara ịna-agakarị n’ekwentị gị. Na-ele onye gị na ya na-ekwurịta okwu anya ma na-ege ya ntị iji gosi na ị na-akwanyere ya ùgwù.”​—Thomas.

     IHE GA-ENYERE GỊ AKA: Mgbe gị na mmadụ na-akparịta ụka, debe ekwentị gị ebe anya gị na-agaghị eru ya. Ndị ọkachamara kwuru na i jirihaala ekwentị gị, o nwere ike ime ka uche gị ghara ịdị n’ihe unu na-akparịta. Ọ pụtara na a kpọhaala gị ma ọ bụ zitere gị ozi, o nwere ike ime ka mkparịta ụka unu kwụsịtụ.

  •   Mgbe ị nọ na klas na-amụ ihe. Baịbụl sịrị: “Na-egenụ ntị nke ọma.” (Luk 8:18) Buru ihe a Baịbụl kwuru n’uche mgbe niile. Ọ bụrụ na ụlọ akwụkwọ unu na-ekwe ka unu jiri ekwentị unu na-aga n’Ịntanet mgbe unu nọ na klas, ejila oge ahụ agụ ozi ndị e ziteere gị n’ekwentị, egwu egwuregwu vidio ma ọ bụ gị na ndị ọzọ ana-ezirịta ozi mgbe i kwesịrị ịna-ege ntị n’ihe a na-akụzi.

     “Gbalịa ka ị na-ege ntị nke ọma mgbe ị nọ na klas. Detuo ihe ụfọdụ dị mkpa onye nkụzi na-ekwu. O kwe mee, na-anọ n’ihu oche ka a ghara inwe ọtụtụ ihe ga na-adọpụ gị uche.”​—Karen.

     IHE GA-ENYERE GỊ AKA: Jiri akwụkwọ na pen na-edetu ihe onye nkụzi na-ekwu kama iji kọmputa ma ọ bụ ekwentị. Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụrụ na mmadụ ji aka ya na-edetu ihe ọ na-anụ, ọ ga-esi ike uche ya apụọ n’ihe a na-ekwu, ọ ga-enyekwara ya aka icheta ihe a kụziiri ya.

  •   Mgbe ị na-amụ ihe n’onwe gị. Baịbụl sịrị: “Nweta amamihe. Gbalịa ka ị na-aghọta ihe.” (Ilu 4:5) Nke a pụtara na ị ga-echebakwuru ihe echiche ka i nwee ike ịghọta ya nke ọma, ọ bụghị ịgụ ya elu elu iji gafee ule.

     “Mgbe ọ bụla m na-amụ ihe, m na-etinye ekwentị m otú mmadụ na-agaghị enwe ike izitere m ozi ma ọ bụ kpọọ m. M na-eme ya ka uche m nwee ike ịdị n’ihe m na-eme. Anaghị m ele ma è nwere ozi ma ọ bụ ihe ọhụrụ batara n’ekwentị m. O nwee ihe m kwesịrị icheta m ga-eme, m na-edetu ya n’akwụkwọ ka m nwee ike icheta ya ma m mụchaa ihe.”​—Chris.

     IHE GA-ENYERE GỊ AKA: Hụ na e nweghị ihe nọ gburugburu ebe ị nọ na-amụ ihe nke nwere ike ime ka uche gị ghara ịdị n’ihe ị na-eme. Debe ebe ahụ ọcha, hụkwa na o nweghị ihe kwasasịrị ebe niile.

a E si n’akwụkwọ a kpọrọ The Shallows​—What the Internet Is Doing to Our Brains (Ihe Ịntanet Na-eme Ụbụrụ Anyị) nweta ya.