Olee Otú M Ga-esi Na-agwa Ndị Mụrụ M Okwu?
ISI NKE 1
Olee Otú M Ga-esi Na-agwa Ndị Mụrụ M Okwu?
“Agbalịsiri m ike ịgwa ndị mụrụ m otú obi dị m, ma okwu agaghị m were were n’ọnụ. Ha napụrụ m okwu n’ọnụ ozugbo. O siiri m ezigbo ike ịkata obi gaa ịgwa ha otú obi dị m, ma mbọ niile m gbara kụrụ afọ n’ala!”—Rosa.
MGBE ị ka dị obere, o nwere ike ịbụ mama gị na papa gị bụ ndị mbụ ị na-agakwuru ka ha gwa gị ihe ị ga-eme mgbe ọ bụla i nwere nsogbu. Ị na-akọrọ ha ihe ọ bụla merenụ, ihe ọ sọkwara ya bụrụ. Ị na-agwa ha otú obi dị gị, obi na-esikwa gị ike na ndụmọdụ ha ga-abara gị uru.
Ma ugbu a, o nwere ike ịdị gị ka ha anaghịzi aghọta gị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Edie sịrị: “Mgbe anyị na-eri nri n’otu mgbede, amalitere m ibe ákwá ma na-akọrọ ndị mụrụ m otú obi dị m. Ha gere ntị, ma ọ dị ka ha aghọtaghị ihe m na-ekwu.”
Gịnịzi mere? “Abanyere m n’ọnụ ụlọ nke m gaa bee ezigbo ákwá!”Ma, i nwere ike ikpebi mgbe ụfọdụ na ị gaghị akọrọ ndị mụrụ gị otú obi dị gị. Otu nwata nwoke aha ya bụ Christopher sịrị: “Ana m akọrọ ndị mụrụ m ọtụtụ ihe. Ma obi dị m ụtọ na mgbe ụfọdụ, ha anaghị ama ihe niile m na-eche n’obi m.”
Ọ̀ dị njọ ma ọ bụrụ na ị gwaghị ndị mụrụ gị ihe ụfọdụ ị na-eche? Ọ dịghị njọ ma ọ bụrụhaala na ị naghị eme ya iji ghọgbuo ha. (Ilu 3:32) N’agbanyeghị nke ahụ, ma ọ̀ dị gị ka ndị mụrụ gị anaghị aghọta gị ma ọ̀ bụ na gịnwa anaghị achọ ịkọrọ ha ihe, otu ihe doro anya bụ: I kwesịrị ịna-akọrọ ndị mụrụ gị ihe, ha kwesịkwara ịma ihe dị gị n’obi.
Na-agwa Ha Okwu!
E nwere ike iji ịgwa ndị mụrụ gị okwu tụnyere ịnya ụgbọala. Ọ bụrụ na ị nyara ụgbọala ruo ebe ihe nọchiri ụzọ, ike agaghị agwụ gị; ị ga-achọrọ ụzọ ọzọ gawa ebe ị na-aga. Ka anyị tụlee ihe atụ abụọ.
IHE MGBOCHI NKE 1 Ị chọrọ ịgwa ndị mụrụ gị ihe, ma ọ dị gị ka ha anaghị ege gị ntị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lia sịrị: “Ọ na-esiri m ike ịkọrọ papa m ihe. Mgbe ụfọdụ, m ga-anọ na-akọrọ ya ihe, ihe m ga-anụzi bụ, ‘Ewela iwe, ị̀ sịrị gịnị?’”
AJỤJỤ: Ọ́ bụrụkwanụ na e nwere nsogbu Lia kwesịrị ịkọrọ papa ya? E nwere ihe atọ o nwere ike ime.
Nke A
Iji olu ike gwa papa ya okwu. Lia ejiri olu ike sị papa ya: “Papa, ihe a dị ezigbo mkpa! Geenụ mụ ntị!”
Nke B
Ịkwụsị ịkọrọ papa ya ihe. Lia akwụsị ịkọrọ papa ya nsogbu o nwere.
Nke CH
Ịchọta oge ka mma ọ ga-akọrọ ya nsogbu ahụ. Lia agakwuru papa ya ma kọọrọ ya ihe bụ́ nsogbu ya ma ọ bụ ya edee ya ede nye papa ya.
Olee nke i chere Lia kwesịrị ime? ․․․․․
Ka anyị leba anya n’ihe ndị ahụ ma mara uru na ọghọm ndị nwere ike ịdị na nke ọ bụla.
O nwere ihe ọzọ papa Lia na-eche, ọ bụkwa ya mere na ọ chọpụtaghịdị na obi adịghị Lia mma. N’ihi ya, ọ bụrụ na Lia ahọrọ Nke A, papa ya agaghị aghọta ihe mere o ji jiri olu ike na-agwa ya okwu. Ọ bụrụ na Lia ejiri olu ike gwa papa ya okwu, o nwere ike ọ gaghị eme ka papa ya gee ya ntị, ọ gaghịkwa egosi na ọ na-asọpụrụ ya. (Ndị Efesọs 6:2) N’ihi ya, iji olu ike agwa papa ya okwu agaghị abara ya uru.
Ọ bụ eziokwu na ịhọrọ Nke B nwere ike iyi ka ọ̀ kacha mfe, ma ọ bụghị ya kacha mma. Maka gịnị? Maka na “atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu, ma a na-arụzu ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.” (Ilu 15:22) Ọ bụrụ na Lia chọrọ ime ka nsogbu ahụ bie, o kwesịrị ịkọrọ ya papa ya. Ọ bụrụkwa na ọ chọrọ ka papa ya nyere ya aka, papa ya kwesịrị ịmata ihe bụ́ nsogbu ya. Ịkwụsị ịkọrọ papa ya ihe ọ bụla agaghị eme ka nsogbu ahụ bie, ọ gaghịkwa eme ka papa ya nyere ya aka.
Ma, ọ bụrụ na Lia ahọrọ Nke CH, ọ pụtara na o kweghị ka nsogbu ọ bụla gbochie ya ime ihe ọ chọrọ ime. Kama, ọ ga-agbalị ịgwa papa ya ihe ahụ n’oge ọzọ. Ọ bụrụkwa na Lia ekpebie ide ya ede nye papa ya, o nwere ike ime ka obi dị Lia mma. O dee ya ede, ọ ga-enwe ike ide ihe niile ọ chọrọ ikwu. Papa Lia gụọ ihe ahụ o dere, ọ ga-aghọta ihe ọ chọrọ ịgwa ya. O nwekwara ike inyere ya aka ịghọtakwu nsogbu ya. N’ihi ya, nke CH ga-abara Lia na papa ya uru.
Olee ihe ndị ọzọ Lia nwere ike ime? Legodị ma ò nwere nke ị ga-echeta ma dee ya n’okpuru ebe a. Deekwa uru ma ọ bụ ọghọm nwere ike ịdị na ya.
․․․․․
IHE MGBOCHI NKE 2 Ndị mụrụ gị chọrọ ka gị na ha kparịta ụka, ma gịnwa achọghị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sera sịrị: “O nweghị ihe na-ewe m iwe ka mmadụ ịjụkasị m ajụjụ ahụ́ ozugbo m si n’ụlọ akwụkwọ lọta. Naanị ihe m chọrọ mgbe ahụ bụ iwepụ obi m n’ihe ọ bụla gbasara ụlọ akwụkwọ. Ma, ọ bụ mgbe ahụ ka ndị mụrụ m na-amalite ịjụ m: ‘Olee otú ụlọ akwụkwọ
si gaa taa? Ì nwere nsogbu n’ụlọ akwụkwọ taa?’” O doro anya na ihe mere papa Sera na mama ya ji na-ajụ ya ajụjụ ndị ahụ bụ na ha na-echere ya echiche ya ọma. Ma Sera sịrị, “Ọ na-esiri m ike ịkọ ihe mere n’ụlọ akwụkwọ mgbe ezigbo ike gwụrụ m.”AJỤJỤ: Gịnị ka Sera nwere ike ime? Dị ka e kwuru n’ihe atụ mbụ ahụ anyị nyere, e nwere ihe atọ o nwere ike ime.
Nke A
Ịjụ ịza ihe ha jụrụ ya. Sera ekwuo, sị: “Biko, hapụnụ m aka. Achọghị m ikwu ihe ọ bụla ugbu a!”
Nke B
Ịza ha ihe ha jụrụ ya. Sera azaa ha ajụjụ ahụ n’agbanyeghị na ike gwụrụ ya, ma ihe ọ zara ha esighị ya n’obi.
Nke CH
Ịhapụ ikwu ihe ọ bụla gbasara “ụlọ akwụkwọ,” ma kwuo banyere ihe ọzọ. Sera ekwuo na ya ga-akọrọ ha ihe mere n’ụlọ akwụkwọ mgbe obi dị ya mma. Ọ jụziri ha ajụjụ gosiri na ọ hụrụ ha n’anya: “Olee otú ụbọchị taa si gaa? Ọ̀ gakwara nke ọma?”
Olee nke i chere Sera kwesịrị ime? ․․․․․
Ka anyị lebakwa anya n’ihe ndị ahụ ma mara uru na ọghọm ndị nwere ike ịdị na nke ọ bụla.
Ike gwụrụ Sera, ọ chọghịkwa ka ya na onye ọ bụla kparịta ụka. Ọ bụrụ na ọ họrọ Nke A, ike ka ga-agwụkwa ya, ma obi ga na-ama ya ikpe n’ihi otú o si jiri iwe gwa ndị mụrụ ya okwu.—Ilu 29:11.
Ihe ọzọ bụ na obi agaghị adị papa Sera na mama ya mma n’ihi otú o si gwa ha okwu ma ọ bụ n’ihi otú ebe niile ga-esi jụọ oyi mgbe o kwuchara ihe ahụ. Ha nwere ike ichewe na e nwere ihe Sera na-ezochiri ha. Ha nwedịrị ike ịgwa ya na ọ ga-azarịrị ha ajụjụ ha, nke ga-eme ka iwe wekwuo ya. N’ihi ya, Nke A agaghị abara ya uru.
O doro anya na Nke B ka Nke A mma. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ọ ga-eme ka ya na ndị mụrụ ya kparịta ụka. Ma ebe ọ bụ na ihe ahụ Sera na-ekwu esighị ya n’obi, ya na ndị mụrụ ya agaghị enweta ihe ha chọrọ, ya bụ, ka onye ọ bụla kwuo otú ọ dị ya n’obi.
Ma ọ bụrụ na Sera ahọrọ Nke CH, ahụ́ ga-aka eru ya ala n’ihi na ha ahapụla ịkọ ihe ọ bụla gbasara ụlọ akwụkwọ mgbe ahụ. Ndị mụrụ ya ga-enwekwa obi ụtọ na ọ gbalịrị ka ya na ha kwurịta okwu. Ọ bụrụ na Sera ahọrọ Nke CH, ọ ga-aka abara ya na ndị mụrụ ya uru n’ihi na ha niile na-eme ihe e dere ná Ndị Filipaị 2:4, nke sịrị: “Echela echiche banyere nanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya n’ihe banyere ndị ọzọ na ihe ha na-eme.”—Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.
Emela Ka Ha Ghọtahie Gị
Cheta na ihe ị na-ekwu na ihe ndị mụrụ gị na-aghọta n’ihe i kwuru anaghị abụcha otu. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ndị mụrụ gị jụrụ gị ihe mere iwe ji ewe gị. Ọ bụrụ na ị zaa ha, sị: “Achọghị m ikwu banyere ya.” Ihe ha ga-aghọta bụ: “Agaghị m agwa unu n’ihi na atụkwasịghị m unu obi. Ọ bụ ndị enyi m ka m ga-agwa nsogbu m, ọ bụghị unu.” Dee ihe i chere banyere ihe ndị e kwuru n’okpuru ebe a. Ka e were ya na i nwere nsogbu gị na ya na-alụ, mama gị ma ọ bụ papa gị achọọ inyere gị aka.
Ọ bụrụ na ị sị: “Unu enyela onwe unu nsogbu. Nsogbu a akarịbeghị m.”
Ihe ndị mụrụ gị nwere ike ịghọta bụ: ․․․․․
Ihe ka mma i nwere ike ikwu bụ: ․․․․․
Olee ihe dị mkpa i kwesịrị ime? Chee ihe ị ga-ekwu eche nke ọma. Kwuo ya otú ga-egosi na ị na-akwanyere ha ùgwù. (Ndị Kọlọsi 4:6) Ghọta na ndị mụrụ gị bụ ndị enyi gị, ha abụghị ndị iro gị. Nke bụ́ eziokwu bụ na e kwesịrị inyere gị ezigbo aka ma ọ bụrụ na ị chọrọ imeri nsogbu ndị na-abịara gị.
Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na nsogbu gị abụghị otú ị ga-esi agwa ndị mụrụ gị okwu, kama ọ bụ na mgbe ọ bụla gị na ha kwuru okwu, unu na-ese okwu?
AMAOKWU BAỊBỤL
“Ihe nile m na-ekwu ziri ezi, sikwa n’obi m pụta.”—Job 33:3, Bible Nsọ Ọhụụ.
NDỤMỌDỤ
O siere gị ike ịkọrọ ndị mụrụ gị nsogbu gị mgbe gị na ha nọ n’ụlọ, kọọrọ ha ya mgbe unu na-aga n’ụzọ ma ọ bụ mgbe unu nọ n’ụgbọala ma ọ bụ mgbe unu gara ịzụ ihe.
Ị̀ MA NA . . . ?
Otú ahụ o nwere ike isiri gị ike ịgwa ndị mụrụ gị banyere ihe ụfọdụ dị mkpa ka o nwekwara ike isiri ha ike ịgwa gị banyere ụdị ihe ahụ ma ọ bụkwanụ ha echee na ha ekwesịghị ịgwa gị banyere ha.
IHE M GA-EME!
Mgbe ọzọ ọ dị m ka m ghara ịgwa papa m na mama m okwu, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ọ bụrụ na papa m ma ọ bụ mama m asị na m ga-ekwurịrị ihe m na-achọghị ikwu, ihe m ga-ekwu bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Olee uru ọ ga-abara gị ma ị chọta oge dị mma ị ga-eji kọọrọ ndị mụrụ gị ihe bụ́ mkpa gị?—Ilu 25:11.
● Gịnị mere o ji baa uru ka ị na-akọrọ ndị mụrụ gị nsogbu gị?—Job 12:12.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]
“Mmadụ na ndị mụrụ ya ịkparịta ụka anaghị adị mfe mgbe niile. Ma ọ bụrụ na onye ahụ akata obi kọọrọ ha nsogbu o nwere, ọ ga-adị ya ka ebe e bupụrụ ibu arọ o bu.”—Devenye
[Foto dị na peeji nke 8]
Otú ahụ ihe nọchiri ụzọ na-agaghị eme ka ị ghara ịga ebe ị na-aga, i nwere ike ịchọta ụzọ ọzọ ị ga-esi gwa ndị mụrụ gị okwu!