Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Papa M Lụgharịa Nwunye ma Ọ Bụ Mama M Lụgharịa Di, Gịnị Ka M Ga-eme?

Papa M Lụgharịa Nwunye ma Ọ Bụ Mama M Lụgharịa Di, Gịnị Ka M Ga-eme?

ISI NKE 5

Papa M Lụgharịa Nwunye ma Ọ Bụ Mama M Lụgharịa Di, Gịnị Ka M Ga-eme?

OBI nwere ike ịdị papa gị ezigbo ụtọ n’ụbọchị ọ na-alụgharị nwunye. Otú ahụ ka o nwekwara ike ịdị mama gị n’ụbọchị ọ na-alụgharị di. Ma, o nwere ike ịbụ na obi adịghị gị mma! N’ihi gịnị? Papa gị lụgharịa nwunye ma ọ bụ mama gị lụgharịa di, ọ pụtara na olileanya i nwere na ndị mụrụ gị ga-ebikọta ọnụ ọzọ akụọla afọ n’ala. O nwekwara ike iwute gị karịchaa ma ọ bụrụ na ọ dịbeghị anya papa gị ma ọ bụ mama gị ị hụrụ n’anya nwụrụ.

Olee otú obi dị gị mgbe mama gị lụgharịrị di ma ọ bụ mgbe papa gị lụgharịrị nwunye? Kanye ✔ na nke ọ bụla kọwara otú obi dị gị.

N’oge ahụ, . . .

□ Obi dị m ụtọ

□ Obi erughị m ala

□ O wutere m

□ M na-enwere onye ọ lụrụ anyaụfụ

□ Obi na-ama m ikpe n’ihi na m malitere ịhụ onye ọ lụrụ n’anya

Obi nwere ike ịna-ama gị ikpe n’ihi na ị ma na i kwesịghị ichefu papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ gị na ya na-ebighịzi. N’agbanyeghị ihe mere obi ji na-ama gị ikpe, ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ e dere nwere ike ime ka ị na-eme ihe na-adịghị mma iji gosi na ezigbo iwe na-ewe gị.

Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịna-eme ka ike ụwa gwụ onye papa gị ma ọ bụ mama gị lụrụ. I nwedịrị ike ịgbalị ime ka ha na-ese okwu, n’ihi na ị chọrọ ka ha gbasaa. Ma, otu ilu dị na Baịbụl dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye ọ bụla nke na-ekotere ụlọ ya nsogbu, ọ ga-ejide ifufe,” nke pụtara na ọ gaghị achịta ájá. (Ilu 11:29) I kwesịghị ikwe ka ụdị ihe ahụ mee gị. E nwere ihe ndị ga-aka baara gị uru i nwere ike ime iji die ihe ndị ahụ na-emebi gị obi. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

Nsogbu nke 1: Irubere Onye Mama Gị ma Ọ Bụ Papa Gị Lụrụ Isi

Irubere onye papa gị ma ọ bụ mama gị lụrụ isi anaghị adị mfe. Ya gwa gị ihe ị ga-eme, i nwere ike iji iwe sị ya, ‘Ọ bụghị gị mụrụ m!’ Obi nwere ike ịdịtụ gị mma n’ihi na i kwuru otú obi dị gị, ma ọ na-egosi na ị ka na-akpa àgwà ụmụaka.

Ihe ọzọ bụ na irubere onye papa gị ma ọ bụ mama gị lụrụ isi bụ otu ụzọ ị ga-esi gosi na ị na-eme ihe ahụ Baịbụl kwuru, nke bụ́, “n’uche unu, bụrụnụ ndị tozuru okè.” (1 Ndị Kọrịnt 14:20, Bible Nsọ nke Union Version) N’eziokwu, di mama gị na-arụrụ gị ihe papa gị kwesịrị ịrụrụ gị. Nwunye papa gị na-arụkwara gị ihe mama gị kwesịrị ịrụrụ gị. I kwesịkwara ịna-asọpụrụ di mama gị ma ọ bụ nwunye papa gị.—Ilu 1:8; Ndị Efesọs 6:1-4.

Ọ bụrụ na di mama gị ma ọ bụ nwunye papa gị adọọ gị aka ná ntị, ọ na-egosi na ọ hụrụ gị n’anya nakwa na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi. (Ilu 13:24) Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Yvonne kwuru, sị: “Di mama m na-adọ anyị aka ná ntị, ma, ọ bụ ihe nna na-emere ụmụ ya. Aghọtara m na ọ bụrụ na mụ enupụrụ ya isi, ọ pụtara na o nweghị ihe m ji ihe niile ọ na-emere anyị kemgbe ọtụtụ afọ kpọrọ, ma ego ọ na-emefuru anyị ma Okwu Chineke ọ na-akụziri anyị. Ọ pụtara iji ihe ọjọọ kwụọ ya ụgwọ ihe ọma o mere.”

Ma, e nwere ike ime ihe kwesịrị iwute gị. Ụdị ihe ahụ mee, gosi na ị bụ onye ‘tozuru okè.’ Otú ị ga-esi eme ya bụ ime ihe Ndị Kọlọsi 3:13 gwara anyị mee, ya bụ: “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya.”

N’okpuru ebe a, dee ụfọdụ àgwà ọma di mama gị ma ọ bụ nwunye papa gị nwere.

․․․․․

Olee otú icheta àgwà ọma ndị ahụ ga-esi nyere gị aka ịkwanyere ya ùgwù?

․․․․․

Nsogbu nke 2: Ịmụta Imesapụ Aka na Ikwe Ka E Mejọọ Gị Mgbe Ụfọdụ

Otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na anọ aha ya bụ Erọn kwuru, sị: “Papa m lụgharịrị nwaanyị ugboro abụọ. O siiri m ike ịhụ ha na ụmụ ha n’anya. Ná mmalite, ọ na-adị m ka hà bụ ndị ọbịa, ma a gwara m na m kwesịrị ịhụ ha n’anya. Ihe ahụ niile edoghị m anya.”

Nsogbu ndị siri ike nwekwara ike ịbịara gị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ naanị gị ka papa gị na mama gị mụrụ ma ọ bụkwanụ na ị bụ nwa mbụ, e nwere ike inwe onye ọzọ ga-anọchizi gị. Ọ bụrụ na ị bụ nwoke, o nwere ike ịbụ na ọ na-adị gị kemgbe ka ị̀ bụ nna nwe ụlọ, ma ugbu a, di mama gị aghọọla nna nwe ụlọ. Ma ọ bụkwanụ, o nwere ike ịdị gị otú ọ dị Yvonne. O kwuru, sị: “O nweghị ihe nna mụrụ m ji mama m kpọrọ. N’ihi ya, ọ bụ naanị mụ na mama m na-anọkarị. Ma, mgbe mama m lụgharịrị di, di ya hụrụ ya n’anya nke ukwuu. Ha na-anọ mgbe niile na-akparịta ụka. Ọ malitere ịdị m ka ò zurula mama m. Ma, emechara m gbanwee otú m si ele ha abụọ anya.”

Olee otú ị ga-esi ṅomie Yvonne? Baịbụl gbara anyị ume, sị: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche.” (Ndị Filipaị 4:5) Okwu Grik e si sụgharịta ‘inwe ezi uche’ pụtara ‘esighị ọnwụ.’ A na-eji ya akọwa onye na-anaghị esi ọnwụ inweta ihe niile ruuru ya. Olee otú ị ga-esi mee ihe ahụ Baịbụl kwuru? (1) Chefuo ihe gara aga. (Ekliziastis 7:10) (2) Ghọta na onye mama gị ma ọ bụ papa gị lụrụ na ụmụ ọ mụtara sozi gị nwere ihe ọ bụla naanị gị nwebu. (1 Timoti 6:18) (3) Emela ha ka hà bụ ndị ọbịa.

N’ihe ndị a e kwuru, olee nke i kwesịrị ilebara anya karịchaa? ․․․․․

Nsogbu nke 3: Mgbe A Na-anaghị Eme Gị Otú E Mere Ndị Ọzọ

Tara kwuru, sị: “Di mama m hụrụ ụmụ ya n’anya karịa ka ọ hụrụ mụ na nwanne m. Ọ na-azụrụ ha nri ọ bụla ha chọrọ, na-ewetakwara ha fim ha chọrọ ile. Ọ na-eme ihe ọ bụla ga-eme ka obi dị ha mma.” Idi ụdị ihe a adịghị mfe. Gịnị nwere ike inyere gị aka idi ya? Gbalịa ghọta ihe nwere ike ime ka mmadụ hụ nwa ya n’anya karịa ka ọ hụrụ nwa nwunye ya ma ọ bụ nwa di ya. Ma eleghị anya, ọ bụghị naanị maka na ha bụ otu ọbara, kama ha ebiela ọtụtụ afọ. A sị ka e kwuwe, o nwere ike ịbụ na ị hụrụ papa gị ma ọ bụ mama gị n’anya karịa nwunye papa gị ma ọ bụ di mama gị.

Ma, ime gị otú e mere ndị ọzọ na imere gị ihe e kwesịrị imere gị abụghị otu. Àgwà ndị mmadụ na mkpa ha dị iche iche. N’ihi ya, kama ịna-echegbu onwe gị banyere ihe e meere ndị ọzọ a na-emeereghị gị, gbalịa chọpụta ma di mama gị ma ọ bụ nwunye papa gị ọ̀ na-agbalị igboro gị mkpa gị.

Olee mkpa gị ụfọdụ di mama gị ma ọ bụ nwunye papa gị na-egboro gị?

․․․․․

Olee mkpa gị ụfọdụ i chere na ọ naghị egboro gị?

․․․․․

Ọ bụrụ na i chere na e nwere mkpa gị ndị ọ na-anaghị egboro gị, ọ́ gaghị adị mma ka i jiri obiọma gwa ya banyere ha?

Ndidi Bara Uru!

N’ezinụlọ ebe papa lụgharịrị nwunye ma ọ bụ ebe mama lụgharịrị di, ọtụtụ afọ ga-agafe tupu mmadụ niile atụkwasịwa ibe ha obi, nke ga-eme ka ahụ́ ruo onye ọ bụla ala. Ọ gwụla ya bụ ihe ga-eme ka ha nwee ike ibi n’udo n’agbanyeghị na àgwà ha na echiche ha abụghị otu. N’ihi ya, nwee ndidi! Atụla anya na ha ga-ahụ gị n’anya ozugbo ma ọ bu na ezinụlọ unu ga-adị n’otu ozugbo.

E nwere otu nwa okorobịa aha ya bụ Tọmọs. Obi adịtụdịghị ya mma mgbe mama ya lụgharịrị di. N’oge ahụ, mama ya nwere ụmụ anọ, di ya enwee ụmụ atọ. Tọmọs dere, sị: “A na-alụ ọgụ n’ụlọ anyị, na-ese okwu, ọgba aghara na-adị, obi na-ekorokwa onye ọ bụla n’elu.” Ma, gịnị mere ka ha malite ibi n’udo? Tọmọs dere, sị: “Ime ihe Baịbụl kwuru mere ka anyị kwụsị okwu na ụka.”

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ọ́ bụrụkwanụ na ụmụnne gị niile bụ ndị otu nne na otu nna mụrụ gị na ha, ma ya abụrụ na ha na-akpasu gị iwe?

AMAOKWU BAỊBỤL

“Njedebe okwu dị mma karịa mmalite ya. Onye nwere ndidi ka onye mmụọ ya dị mpako mma.”—Ekliziastis 7:8.

NDỤMỌDỤ

Ebe ụmụ di mama gị ma ọ bụ ụmụ nwunye papa gị bizi n’ụlọ unu, o nwere ike ịgụwa gị agụụ ka gị na ha nwee mmekọahụ. N’ihi ya, na-ejide onwe gị ka ị ghara ịna-eche banyere inwe mmekọahụ, gbalịsiekwa ike ka ejiji gị ma ọ bụ àgwà gị ghara ime ka ha chọọ ka gị na ha nwee mmekọahụ.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọ bụrụ na papa gị lụgharịa nwunye ma ọ bụ mama gị lụgharịa di, otú ahụ ọ na-esiri gị ike ịmụta otú e si ebi n’ụdị ezinụlọ ahụ ka o nwere ike isiri ụmụ di mama gị ma ọ bụ ụmụ nwunye papa gị ike.

IHE M GA-EME!

Iji na-akwanyekwuru nwunye papa m ma ọ bụ di mama m ùgwù, m ga na-echeta ihe ọma ndị a o meere ezinụlọ anyị (dee ihe ọma abụọ o mere): ․․․․․

Ọ bụrụ na ụmụ di mama m ma ọ bụ ụmụ nwunye papa m eleda m anya, otú m ga-esi mee ihe e kwuru ná Ndị Rom 12:21 bụ: ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m ma ọ bụ di mama m ma ọ bụ nwunye papa m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Olee ihe nwere ike ịbụ ụjọ di mama gị ma ọ bụ nwunye papa gị na ụmụ ya ma unu na ha biri?

● Gịnị mere o ji dị mkpa ka i nwee olileanya na ihe ga-emecha dị mma n’ezinụlọ ọhụrụ unu?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 38]

“Mama m na di nke abụọ ọ lụrụ mechara gbaa alụkwaghịm. Ma, mụ na ụmụ nwoke ahụ mụrụ ka dị n’ezigbo mma ruo taa. Mmata m matara ha so n’ihe kacha mma metụrụla ná ndụ m.”—Tara

[Foto dị na peeji nke 39]

Ime ka ezinụlọ abụọ dị n’otu yiri ịgwakọta mmiri na simenti. Ọ na-ewe oge, ọ dịghịkwa mfe, ma ọ na-emecha baa ezigbo uru, mee ka ezinụlọ sie ike