Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Merie Ọnwụnwa?

Olee Otú M Ga-esi Merie Ọnwụnwa?

ISI NKE 9

Olee Otú M Ga-esi Merie Ọnwụnwa?

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Karen gara oriri na nkwari. Mgbe ọ nọrọ ebe ahụ ihe dị ka nkeji iri, ọ hụrụ ka ụmụ okorobịa abụọ bu ụfọdụ katọn bata. Onye ọ bụla ma ihe dị n’ime katọn ndị ahụ. O bula ụzọ nụ ka ụmụ okorobịa abụọ ahụ na-ekwu na “a ga-ata nkwụ” n’oriri na nkwari ahụ.

Karen nụrụ olu enyi ya nwaanyị aha ya bụ Jessica ka o si n’azụ jụọ ya, sị, “Ì guzo ebe ahụ eme gịnị, Mgbeeke dị ka gị?” Karen tụgharịrị, hụ ka o bu karama mmanya biya abụọ a ka kwụpere akwụpe. Jessica nyewere Karen otu ma sị ya, “Agwakwala m na i torubeghị ikporitụ ndụ!”

Karen achọghị ịṅụ. Ma, nsogbu enyi ya na-enye ya ka ọ ṅụọ mmanya karịrị ihe ọ tụrụ anya ya. Jessica bụ enyi ya. Karen achọghịkwa ka Jessica chee na ya bụ Mgbeeke. Ihe ọzọ bụ na Jessica so n’ezigbo ụmụ agbọghọ e nwere n’ụlọ akwụkwọ ha. Ọ bụrụ na Jessica na-aṅụ mmanya na-aba n’anya, ò nwe ihe o mere? Karen malitere iche, sị, ‘Ọ̀ kwa naanị ịṅụ mmanya? Ọ bụghị ịṅụ ọgwụ ike ma ọ bụ inwe mmekọahụ.’

MGBE ị ka bụ nwata, ụdị ọnwụnwa dị iche iche ga na-abịara gị. Ọ na-esikarị n’aka ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị. Otu nwa okorobịa dị afọ iri na asaa aha ya bụ Ramon kwuru, sị, “Ụmụ agbọghọ nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị na-esi ọnwụ. Ha hụ nwa okorobịa, ha ana-emetụgharị ya aka ka ha hụ ebe ọ ga-eru tupu ya asị na ọ dịghị ya mma. Ị gwa ha na ị chọghị, ha ana-eme ihe ha na-eme!” Otu nwa agbọghọ dịkwa afọ iri na asaa aha ya bụ Deanna chọpụtara otu ihe ahụ. O kwuru, sị: “Otu nwa okorobịa bịara konye m aka n’olu. Esuru m ya aka n’aka, sị ya, ‘À na-akpọkwanụ ụdị egwuregwu a gịnị? Amaghịdị m onye ị bụ!’”

Ọnwụnwa nwekwara ike ịbịara gịnwa, yie ihe na-agaghị akwụsị akwụsị. Ọnwụnwa yiri onye na-akụ aka n’ọnụ ụzọ gị n’akwụsịghị akwụsị n’agbanyeghị na ị sịrị ya enyela gị nsogbu. Ọnwụnwa ọ̀ na-akụrụ gị aka n’ụzọ ugboro ugboro? Dị ka ihe atụ, legodị anya n’ihe ndị e dere n’okpuru ebe a. Ò nwere nke bụụrụ gị ọnwụnwa?

□ Ịṅụ sịga

□ Ikiri ndị gba ọtọ

□ Ịṅụ mmanya na-aba n’anya

□ Inwe mmekọahụ

□ Ịṅụ ọgwụ ọjọọ

□ Ihe ọzọ ․․․․․

Ọ bụrụ na o nwere nke ị kanyere ✔ na ya, echela na i nweghị ike ịbụ Onye Kraịst. I nwere ike ịmụta otú ị ga-esi na-ejide onwe gị ma ihe ọjọọ gụwa gị nakwa otú ị ga-esi emeri ọnwụnwa. Olee otú ị ga-esi mụta ya? Ịmata ihe na-akpata ọnwụnwa ga-abara gị uru. Ka anyị tụlee ụzọ ihe atọ na-akpata ọnwụnwa.

1. Ezughị okè. Ime ihe ọjọọ na-agụ ụmụ mmadụ niile na-ezughị okè agụụ. Pọl onyeozi, bụ́ Onye Kraịst tozuru okè, kwuru hoo haa, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.” (Ndị Rom 7:21) O doro anya na onye ezi omume nwere ike inwe “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya” mgbe ụfọdụ. (1 Jọn 2:16) Ma, ọ bụrụ na mmadụ ana-eche mgbe niile banyere ihe bụụrụ ya ọnwụnwa, ọ ga-eme ka ihe ka njọ, n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie.”—Jems 1:15.

2. Anyị bi n’ụwa rụrụ arụ. Ọnwụnwa juru ebe niile. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Trudy kwuru, sị: “N’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ebe a na-arụ ọrụ, ndị mmadụ na-ekwu banyere mmekọahụ mgbe niile. Ma na tiivi ma na fim, a na-emekarị ka o yie ihe magburu onwe ya na ihe na-atọ ezigbo ụtọ. A naghị egosikarị ihe ọjọọ ọ na-akpata!” Ihe mere Trudy emeela ka ọ mata na tiivi na ndị ọgbọ mmadụ nwere ike imebi mmadụ. O kwuru, sị: “Mgbe m dị afọ iri na isii, echere m na enwetala m enyi nwoke hụrụ m n’anya. Mama m dowere m ọdụ, gwa m na ọ bụrụ na mụ akwụsịghị ụdị ndụ m na-ebi, na m ga-atụrụ ime ọkwà. Amaghị m na mama m ga-ekwu ụdị ihe ahụ. Ọ wụrụ m akpata oyi! Mgbe ọnwa abụọ gachara, achọpụtara m na m dị ime.”

3. “Ọchịchọ a na-enwe n’oge ntorobịa.” (2 Timoti 2:22) Ọchịchọ a nwere ike ịbụ ọchịchọ ọ bụla ndị na-eto eto na-enwekarị, dị ka ịchọ ka ndị ọzọ na-ele gị anya ọma ma ọ bụ ghọta na i toola. O nweghị ihe dị njọ n’ụdị ọchịchọ ahụ. Ma, ọ bụrụ na ị kpacharaghị anya, o nwere ike ime ka o sikwuoro gị ike imeri ọnwụnwa. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ka ndị mmadụ ghọta na i toola, o nwere ike ime ka ị kwụsị ịkpa àgwà ka onye a zụrụ azụ. Ọ bụ ụdị ihe ahụ mere Steve mgbe ọ dị afọ iri na asaa. Ọ sịrị, “M malitere inupụrụ ndị mụrụ m isi, na-emekwa ihe ọ bụla ha sịrị m emela. Ihe a niile malitere ime obere oge e mechara m baptizim.”

Otú Ị Ga-esi Merie Ọnwụnwa

N’eziokwu, izere ihe ndị ahụ e kwuru okwu ha anaghị adị mfe. Ma, i nwere ike imeri ọnwụnwa. Olee otú ị ga-esi merie ya?

● Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịchọpụta ọnwụnwa nke na-akacha esiri gị ike. (O nwere ike ịbụ na ị kanyela ihe na ya na peeji nke 65.)

● Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịjụ onwe gị, sị, ‘Olee mgbe ọ kacha yie ka ọnwụnwa a ọ̀ ga-abịara m?’ Kanye ✔ n’otu n’ime ihe ndị a:

□ Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ

□ Mgbe m nọ naanị m

□ Mgbe m nọ n’ebe m na-arụ ọrụ

□ Oge ọzọ ․․․․․

Ị mata mgbe ọnwụnwa nwere ike ịbịara gị, o nwere ike inyere gị aka izere ya. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ahụ a kọrọ ná mmalite isiokwu a. Olee ihe kwesịrị ime ka Karen ghọta na a ga-enwe nsogbu n’oriri na nkwari ahụ?

․․․․․

Olee otú ọ gaara esi zere ọnwụnwa ahụ?

․․․․․

● Ugbu a ị chọpụtarala ọnwụnwa ahụ, chọpụtakwa mgbe o nwere ike ịbịara gị, i jikerela ime ihe i kwesịrị ime. Nke mbụ bụ ịchọta otú ị ga-esi gbochie ọnwụnwa ahụ ma ọ bụ mee ka ọ dịrị gị mfe imeri ya. Dee ihe i nwere ike ime n’ebe a.

․․․․․

(Ihe atụ: Mgbe ị na-ala ma unu gbasaa ụlọ akwụkwọ, ọ bụrụ na ị na-ahụkarị ụmụ akwụkwọ ibe gị na-agwa gị ka i soro ha ṅụọ sịga, i nwere ike isi ụzọ ọzọ na-ala ka ị ghara izute ha. Ọ bụrụ na ị na-ahụkarị ndị gba ọtọ ị na-achọghị ịhụ mgbe ị na-achọ ihe n’Ịntanet, i nwere ike itinye ihe ga-eme ka ụdị ihe ahụ ghara ịpụta. Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ idenye naanị ihe ị na-achọ mgbe ị na-achọ ihe n’Ịntanet.)

N’eziokwu, i nweghị ike izere ọnwụnwa niile. Otu ụbọchị, ọnwụnwa siri ezigbo ike nwere ike ịbịara gị, ikekwe mgbe ị na-atụghịdị anya ya. Gịnị ka i nwere ike ime ma ụdị ihe ahụ mee?

Jikere Ejikere

Mgbe ‘Setan nwara Jizọs ọnwụnwa,’ Jizọs jụrụ ọnwụnwa nke ọ bụla ozugbo. (Mak 1:13) N’ihi gịnị? N’ihi na ọ ma ihe o kpebiri ime ma ọnwụnwa ndị ahụ bịara ya. Jizọs ebula ụzọ kpebie irubere Nna ya isi mgbe niile. (Jọn 8:28, 29) Mgbe Jizọs sịrị: “Esi m n’eluigwe bịa ime, ọ bụghị uche m, kama uche onye zitere m,” o si ya n’obi.—Jọn 6:38.

Na peeji na-eso nke a, dee ihe abụọ mere i ji kwesị imeri ọnwụnwa ahụ na-akacha abịara gị nakwa ihe abụọ i nwere ike ime ga-enyere gị aka imeri ya.

Ihe mere i ji kwesị imeri ọnwụnwa ahụ:

1 ․․․․․

2 ․․․․․

Ihe i nwere ike ime ga-enyere gị aka imeri ya:

1 ․․․․․

2 ․․․․․

Cheta na mgbe ọ bụla i kwere ka ọnwụnwa merie gị, ị na-agbara ọchịchọ gị ohu. (Taịtọs 3:3) Gịnị mere ị ga-eji kwere ka ọchịchọ gị na-atụrụ gị ihe ị ga-eme? Gosi na ị bụ dimkpa. Na-ejide onwe gị mgbe ihe ọjọọ na-agụ gị kama ikwe ka ọ na-atụrụ gị ihe ị ga-eme. (Ndị Kọlọsi 3:5) Na-ekpekwa ekpere ka i nwee ike ịna-eme otú ahụ.—Matiu 6:13. *

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A N’ISI NKE 15 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ahụ́ ọ̀ na-anyị gị arọ? Chọpụta otú ị ga-esi mee ka ahụ́ dịkwuo gị mma nakwa otú ị ga-esi nwekwuo ume!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 43 Gụkwuo banyere ya n’Isi nke 33 na nke 34 n’akwụkwọ a.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ idi, kama mgbe ọnwụnwa bịara, ọ ga-emere unu ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike idi ya.”—1 Ndị Kọrịnt 10:13.

NDỤMỌDỤ

Jiri “Ihe M Ga-eme ma Ndị Ọgbọ M Nyewe M Nsogbu,” nke dị na peeji nke 132 na nke 133 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2, chepụta ihe ị ga-eme ma ọ bụ ihe ị ga-ekwu ma mmadụ chọọ ịnwata gị ime ihe ọjọọ.

Ị̀ MA NA . . . ?

Chineke buru amụma na Jizọs ga-ekwesị ntụkwasị obi, ma ọ pụtaghị na ọ dị ka robọt, nke a rụrụ ka ọ na-eme ihe ọ bụla a gwara ya. Jizọs ji aka ya na-ekpebi ihe ọ ga-eme. O ji aka ya kpebie ikwesị ntụkwasị obi. A manyeghị ya amanye. O so n’ihe mere o ji kpesie ekpere ike mgbe ọnwụnwa bịaara ya.—Ndị Hibru 5:7.

IHE M GA-EME!

Ihe m ga-eme nke ga-enyere m aka ikpebisikwu ike imeri ọnwụnwa bụ ․․․․․

Ndị ụfọdụ, ebe ụfọdụ, na ihe ụfọdụ m kwesịrị izere bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● È nwere ike ịnwa ndị zuru okè ọnwụnwa?—Jenesis 6:1-3; Jọn 8:44.

● Mgbe i meriri ọnwụnwa, olee uru ikwesị ntụkwasị obi gị ga-abara ndị ọzọ?—Ilu 27:11; 1 Timoti 4:12.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 68]

“Ihe na-enyere m aka bụ ịmata na Onye kacha ike n’eluigwe na n’ụwa nọnyeere m nakwa na m nwere ike ịrịọ ya mgbe ọ bụla ka o nyere m aka!”—Christopher

[Igbe/Foto dị na peeji nke 67]

Chegodị Ihe A!

Ihe a yiri elekere bụ kọmpas. Ihe ahụ yiri aka elekere na-eche ihu n’ebe ugwu mgbe niile. Ma i dewe magnetọ n’akụkụ kọmpas ahụ, ihe ahụ yiri aka elekere agaghịzi eche ihu n’ebe ugwu. Ọ ga-echezi ihu n’ebe magnetọ ahụ dị. N’ihi ya, ihe ahụ yiri aka elekere ga-eduhie mmadụ.

Akọnuche gị na-eme ka kọmpas ahụ. Ọ bụrụ na a zụọ ya nke ọma, ọ ga na-agwa gị ihe i kwesịrị ime, nyekwara gị aka iji amamihe na-ekpebi ihe ị ga-eme. Ma, mkpakọrịta ọjọọ ga-eme gị ihe magnetọ na-eme kọmpas. Ọ ga-eme ka ị ghara ịma ihe ziri ezi i kwesịrị ime. Gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’ihe a? Na-agbalịsi ike izere onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka i mee ihe ị ma na ọ dịghị mma!—Ilu 13:20.

[Foto dị na peeji nke 69]

Mgbe ọ bụla i kwere ka ọnwụnwa merie gị, ị na-agbara ọchịchọ gị ohu