Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Ghara Idina M n’Ike?
ISI NKE 32
Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Ghara Idina M n’Ike?
Kwa afọ, a na-edina ọtụtụ nde mmadụ n’ike ma ọ bụ si n’ụzọ ọzọ metọọ ha. Nchọpụta e mere gosiri na ndị a kacha edina n’ike bụ ndị na-eto eto. Dị ka ihe atụ, a chọpụtara na n’Amerịka, ihe dị ka ọkara ndị niile e dinara n’ike bụ ụmụaka na-erubeghị afọ iri na asatọ. Ebe ọ bụ na idina mmadụ n’ike zuru ebe niile, ọ dị mkpa ka i chebara isiokwu a echiche.
“Otu nwoke jidere m. Tupu mụ amata ihe na-eme, ọ tụrụ m n’ala. M mere ihe niile m nwere ike ime ka ọ hapụ m. Ewepụtara m mkpọ̀ ihe na-afụ ose ka m gbaa ya. Ma ọ kụpụrụ ya. Agbalịrị m iti mkpu, ma e nweghị ike ịnụ olu m. Enuru m ya aka, gbaa ya ụkwụ, suo ya aka, gaakwa ya mbọ. Mgbe ahụ ka ọ mara mụ mma, ahụ́ akụnwụọ m.”—Annette.
NDỊ na-edina mmadụ n’ike juru ebe niile taa. Ndị ha na-achọkarị inweta bụ ndị na-eto eto. Dị ka e mere Annette, ndị na-achọ idina ụfọdụ ndị na-eto eto bụ ndị ha na-amabughị. Ụfọdụ bụ ndị onye agbata obi ha na-edina n’ike. Ụdị ihe ahụ mere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Natalie, bụ́ onye dị naanị afọ iri mgbe otu nwa okorobịa bi n’akụkụ ụlọ ha dinara ya n’ike. Natalie sịrị: “Ụjọ na ihere ekweghị m gwa onye ọ bụla ozugbo ahụ.”
E nwere ọtụtụ ndị na-eto eto onye dinara ha n’ike bụ onye ezinụlọ ha. Otu nwaanyị aha ya bụ Carmen sịrị: “Mgbe m dị n’agbata afọ ise na afọ iri na abụọ, papa m nọ na-edina m n’ike. Mgbe m dị afọ iri abụọ, m gwara ya na ihe ọ na-eme
adịghị mma. Ya arịọ m mgbaghara. Ma mgbe ọnwa ole na ole gafere, ọ chụpụrụ m n’ụlọ anyị.”Ihe a na-anụ ebe niile ugbu a nke na-ewute ndị mmadụ bụ na onye agbata obi mmadụ, enyi ya, ma ọ bụ onye ezinụlọ ya dinara ya n’ike. * Ma ịrụsa ụmụaka arụrụala abụghị ihe ọhụrụ. E mere ụdị ihe arụ ahụ n’oge a na-ede Baịbụl. (Joel 3:3; Matiu 2:16) Anyị bi ugbu a n’oge dị oké egwu. Ọtụtụ ndị ‘enweghị obi mmadụ.’ A na-edinakarị ụmụ agbọghọ (ma ụmụ okorobịa) n’ike. (2 Timoti 3:1-3) Ụdị nsogbu ahụ nwere ike ịbịara gị n’agbanyeghị otú i si akpachara anya, ma e nwere ọtụtụ ihe ị ga-eme ka a ghara idina gị n’ike. Chebara ndụmọdụ ndị a echiche:
Kpachara anya. Mgbe ị na-aga n’ụzọ, mata ihe na-eme n’ihu gị, n’azụ gị, n’aka nri gị nakwa n’aka ekpe gị. O nwere ebe ụfọdụ ndị ọjọọ na-anọkarị, nke ka nke, n’abalị. O kwe gị omume, zere ebe ndị ahụ ma ọ bụkwanụ gị agbalịsie ike ka naanị gị ghara ịga ebe ahụ.—Ilu 27:12.
Emela ihe ga-eme ka a ghọtahie gị. Achụla nwoke. Eyila uwe ka ndị akwụna. Ụdị àgwà ahụ nwere ike ime ka mmadụ chee na ị chọrọ inwe mmekọahụ, ma ọ bụkwanụ na ị gaghị asị mba.—1 Timoti 2:9, 10.
Unu abụọ kpebie ihe unu na-agaghị eme. Ọ bụrụ na e nwere onye gị na ya na-akpa, gị na ya kpebie ụdị ihe unu kwesịrị ịna-eme na nke unu na-ekwesịghị ime. * Ozugbo unu kpebiri ya, emela ihe ị na-ekwesịghị ime, nke nwere ike ime ka o dinaa gị n’ike.—Ilu 13:10.
Kwusie okwu ike. Ọ bụghị ihe ọjọọ ma i kwusie okwu ike, sị, “Kwụsị ya!” ma ọ bụ “Wepụ aka gị n’ahụ́ m!” Agbachila nkịtị n’ihi ịtụ ụjọ na nwa okorobịa gị na ya na-akpa ga-ahapụ gị. Ọ hapụ gị n’ihi ya, ọ pụtara na ọ bụghị onye gị na ya kwesịrị ịna-akpa! A sị ka e kwuwe, onye gị na ya na-akpa *
kwesịrị ịbụ ezigbo nwoke, onye ga na-akwanyere ahụ́ gị na ihe i kweere ùgwù.Ị gaa n’Ịntanet, kpachara anya. Etinyela ihe ndị dị ka adres gị ma ọ bụ foto gị n’Ịntanet. * I nweta ozi iberiibe, ọ ga-akacha mma ka ị ghara ịza ya. Ịgba nkịtị na-eme ka ike gwụ ndị na-anọ n’Ịntanet achọ ndị ha ga-aghọgbu.
I mee ihe ndị ahụ e kwuru, o nwere ike ime ka a ghara idina gị n’ike. (Ilu 22:3) Ma i kwesịrị ịghọta na ọ bụghị mgbe niile ka i nwere ike ịgbara nsogbu ọsọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụghị mgbe niile ka gị na mmadụ nwere ike iso na-aga ebe ọ bụla ị na-aga, ọ bụghịkwa mgbe niile ka ị ga-enwe ike izere ebe niile ndị ọjọọ na-anọ. O nwere ike ịbụ na ndị ọjọọ juru n’ebe i bi.
Ihe e mere gị nwere ike ime ka ị mata na ihe nwere ike ime mmadụ n’agbanyeghị otú o si agbalị ịgbara nsogbu ọsọ. Dị ka Annette, bụ́ onye e dere ihe o kwuru ná mmalite, onye ka gị ike nwere ike ijide gị na mberede. Ma ọ bụkwanụ, dị ka Carmen, o nwere ike ịbụ na e dinara gị n’ike mgbe ị bụ nwata. N’ihi ya, o nweghị ihe ị ma ị ga-eme mgbe ahụ. O nwedịrị ike ịbụ na ị ghọtaghị ihe na-eme. Gịnị ka ị ga-eme ugbu a obi na-ama gị ikpe dị ka ọ na-amakarị ndị e dinara n’ike?
Ihe Ị Ga-eme Mgbe Obi Na-ama Gị Ikpe
Obi Annette ka na-ama ya ikpe n’ihi ihe e mere ya. O kwuru, sị: “Ike onwe m gwụrụ m. Mgbe niile, m na-eche banyere ihe mere n’abalị ụbọchị ahụ. Ọ na-adị m ka m̀ gaara agbalịsikwu ike ime ka ọ hapụ m. Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ọ mara mụ mma, egwu ekweghị m mee ihe ọ bụla. Ike adịghịzi m ime ihe ọ bụla, ma ọ dị m ka m̀ gaara agbalịkwu.”
Obi Natalie ka na-amakwa ya ikpe. O kwuru, sị: “A sị na m ma, m gaaraghị atụkwasị onye ahụ obi. Ndị mụrụ m nyere mụ na nwanne m nwaanyị iwu ka anyị na-anọkọ ọnụ mgbe ọ bụla anyị na-egwuri egwu n’èzí. Ma egeghị m ha ntị. Ọ bụ ya mere o ji adị m ka ọ̀ bụ m nyere onye agbata obi anyị ohere inweta m. Ihe ahụ merenụ kpataara ezinụlọ anyị nsogbu. Obi na-ama m ikpe na ọ bụ m kpataara ha obi mgbawa. Ọ bụ ya kacha enye m nsogbu n’obi.”
Ọ bụrụ na obi na-ama gị ikpe otú ahụ ọ na-ama Annette ma ọ bụ Natalie, gịnị ka ị ga-eme? Ihe mbụ ị ga-eme bụ ijisi ike na-echeta na ọ bụrụ na e dinara gị n’ike, a manyere gị amanye. Ụfọdụ na-ekwu na o nweghị ihe o mere, na ọ bụ “ihe ụmụ okorobịa na-eme,” nakwa na ndị e dinara n’ike chọrọ ka e dinaa ha. Ma, o nweghị onye e kwesịrị idina n’ike. Ọ bụrụ na a rụsara gị ụdị arụrụala ahụ, e kwesịghị ịta gị ụta!
N’eziokwu, ọ dị mfe ịgụ “e kwesịghị ịta gị ụta”; ma ikweta ya nwere ike isi ezigbo ike. Ụfọdụ na-eburu ihe mere ha n’obi, obi ana-ama ha ikpe, iwe ana-ewekwa ha. Ma, ị gbachi nkịtị, ònye ka ọ ga-abara uru? Ọ̀ bụ gị ka ọ̀ bụ onye dinara gị n’ike? Kama ịgbachi nkịtị, mee ihe i kwesịrị ime.
Ịkọrọ Mmadụ Ihe E Mere Gị
Baịbụl gwara anyị na mgbe Job bụ́ onye ezi omume hụrụ na nsogbu ya esiela ezigbo ike, o kwuru, sị: “M ga-ekwupụta nchegbu m na-enwe banyere onwe m. M ga-ekwu okwu dị ka o si ewute mkpụrụ obi m!” (Job 10:1) Ọ ga-abara gị uru ma i mee otú ahụ. Ịkọrọ onye ị tụkwasịrị obi ihe merenụ nwere ike inyere gị aka idi ndina e dinara gị n’ike, meekwa ka obi ruo gị ala.
N’eziokwu, ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst, ọ dị mkpa ka ị gwa okenye ọgbakọ ihe merenụ. Okwu nkasi obi onye ọzụzụ atụrụ hụrụ gị n’anya ga-agwa gị nwere ike ime ka obi sie gị ike na ndina e dinara gị n’ike apụtaghị na mmehie onye ọzọ emerụọla gị. Annette chọpụtara na ọ bụ eziokwu. O kwuru, sị: “M kọọrọ ya otu ezigbo enyi m nwaanyị, ya agwa m ka m kọọrọ ya ndị okenye ọgbakọ anyị. Obi dị m ụtọ na m mere otú ahụ. Mụ na ha nọkọrọ ọtụtụ ugboro, ha agwa m ihe mere ka obi tọọ m ụtọ, ya bụ na ihe ahụ merenụ esighị m n’aka. O nweghị ihe m mejọrọ.”
Abụ Ọma 37:8) O nwekwara ike ime ka i nwetatụ onwe gị, ikekwe ya abụrụ nke mbụ obi na-eru gị ala kemgbe ọtụtụ afọ. Natalie chọpụtara na ihe a bụ eziokwu mgbe ọ gwachara ndị mụrụ ya na e dinara ya n’ike. O kwuru, sị: “Ha nyeere m aka, gbaakwa m ume ka m gwa ha banyere ya. Ime otú ahụ mere ka obi dịtụwa mụ mma, meekwa ka iwe m dajụọ.” Ekpere bụ ihe ọzọ kasiri Natalie obi. O kwuru, sị: “Ịgwa Chineke okwu nyeere m aka, nke ka nke, n’oge ndị m na-achọghị ịkọrọ ya onye ọzọ. Mgbe m na-ekpe ekpere, m na-ekwu otú ọ dị m n’obi. Ọ na-eme ka obi ruo m ala.” *
Ịkọ ihe merenụ na ikwu otú ọ dị gị n’obi nwere ike ime ka iwe gị na ọnụma gị dajụọ. (Gịnwa nwekwara ike ịchọpụta na obi ga-akwụsị ịma gị ikpe ka oge na-aga. (Ekliziastis 3:3) Gakwuru ndị enyi ga-enyere gị aka, bụ́ ndị yiri ndị okenye ahụ Baịbụl kwuru na ha dị ka “ebe izere ifufe na ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo.” (Aịzaya 32:2) Na-elebara onwe gị anya, na-emekwa ihe ga-eme ka obi dị gị mma. Na-ehi ụra nke ọma. Ihe kacha mkpa bụ ịtụkwasị Jehova, bụ́ Chineke nkasi obi niile, obi. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eweta ụwa ọhụrụ. Ọ “ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ọ bụ ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa.”—Abụ Ọma 37:9.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Mgbe ụfọdụ, nwa okorobịa nwere ike idina nwa agbọghọ n’ike mgbe ha abụọ na-akpa, ma ọ bụ nye ya ọgwụ ọjọọ ma dinaa ya.
^ par. 10 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 4 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2.
^ par. 11 N’eziokwu, ndụmọdụ ahụ bakwara uru ma ọ bụrụ na nwa agbọghọ na-enye nwa okorobịa nsogbu ka ya na ya nwee mmekọahụ.
^ par. 12 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 11 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2.
^ par. 23 Mgbe ụfọdụ, ike ụwa na-agwụ ndị e dinara n’ike. Ụdị ihe ahụ mee, o nwere ike ịba uru ka onye ahụ gaa hụ dọkịta. Ị chọọ ịgụkwu banyere ihe i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na obi na-ajọkarị gị njọ, gụọ Isi nke 13 na nke 14 n’akwụkwọ a.
AMAOKWU BAỊBỤL
“N’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, . . . ndị na-enweghị obi mmadụ, . . . ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya.”—2 Timoti 3:1-3.
NDỤMỌDỤ
Ọ bụrụ na e dinara gị n’ike, depụta amaokwu Baịbụl ndị nwere ike ịkasi gị obi. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ Abụ Ọma 37:28; 46:1; 118:5-9; Ilu 17:17; na Ndị Filipaị 4:6, 7.
Ị̀ MA NA . . . ?
N’Amerịka, e kee ndị na-eto eto e dinara n’ike ụzọ iri, ihe karịrị ụzọ itoolu n’ime ha ma onye dinara ha n’ike ama.
IHE M GA-EME!
Obi mawa m ikpe n’ihi ihe merenụ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Ọ bụrụ na e dinara gị n’ike, olee uru ndị ị ga-erite ma ị gwa onye ọzọ ihe e mere gị?
● Ị gba nkịtị, olee nsogbu o nwere ike ịkpatara gị na ndị ọzọ?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 232]
“E dinaa mmadụ n’ike, ọ ga-esiri ya ezigbo ike ịkọrọ ya onye ọzọ. Ma, ọ bụ ihe kacha mma o nwere ike ime. Ịkọrọ ya onye ọzọ ga-eme ka obi dịtụ ya mma, iwe ya adajụọkwa, meekwa ka o nweta onwe ya.”—Natalie
[Igbe dị na peeji nke 230]
“Ọ Bụrụ na Ị Hụrụ M n’Anya . . . ”
Ụfọdụ n’ime ndị na-edina ụmụ agbọghọ anaghị amanye ha amanye, kama ha na-eji aghụghọ enweta obi ha. Olee otú ha na-esi eme ya? Ha nwere ike ịsị nwa agbọghọ, “O nweghị onye na-anaghị enwe mmekọahụ,” “I mee ya, o nweghị onye ga-ama,” ma ọ bụ, dị ka e kwuru n’Isi nke 24 n’akwụkwọ a, “Ọ bụrụ na ị hụrụ m n’anya, ị ga-ekwe.” Ekwela ka nwa okorobịa ghọgbuo gị ka i kweta na ọ bụ mmekọahụ ka e ji amata ịhụnanya. Nke bụ́ eziokwu bụ na onye na-eche otú ahụ na-achọ naanị ka o nwee mmekọahụ na-agụ ya. Ọ naghị eche banyere gị ma ọ bụ banyere ọdịmma gị. Kama ime otú ahụ, onye bụ́ ezigbo nwoke ga na-eche banyere ọdịmma gị karịa ọdịmma nke ya. Ọ ga-akata obi debe iwu Chineke nyere banyere omume ọma. (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Ezigbo nwoke agaghị eche na naanị uru ụmụ agbọghọ bara bụ ka e jiri ha na-enwe mmekọahụ. Kama ime otú ahụ, ọ ga ‘na-emeso ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne ya ndị nwaanyị n’ịdị ọcha niile.’—1 Timoti 5:1, 2.
[Foto dị na peeji nke 233]
E dinaa gị n’ike, mwute ọ na-ewute gị nwere ike ịna-anyịgbu gị ka ibu arọ. Ọ́ gaghị adị mma ka onye ọzọ nyere gị aka?