Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwe Mmekọahụ Ọ̀ Ga-eme Ka Anyị Dịkwuo ná Mma?

Inwe Mmekọahụ Ọ̀ Ga-eme Ka Anyị Dịkwuo ná Mma?

ISI NKE 24

Inwe Mmekọahụ Ọ̀ Ga-eme Ka Anyị Dịkwuo ná Mma?

Mgbe Sera na Devid kpara naanị ọnwa abụọ, ọ dị Sera ka ò ruola ọtụtụ afọ ha kpawara. Ha na-eji ekwe ntị edegara ibe ha ozi ọtụtụ ugboro, na-anọkwa ọtụtụ awa ma ha kwurịtawa okwu n’ekwe ntị. Otu onye kwuwe okwu, onye nke ọzọ na-amadị ihe ọ chọrọ ikwu! Ma n’otu abalị ha nọ n’ụgbọala a dọwara n’otu ebe, ihe Devid chọrọ abụghị naanị ịkparịta ụka.

N’ime ọnwa abụọ ahụ ha kpawara, ihe ha na-eme bụ naanị ijide ibe ha aka na isusutụ ọnụ. Sera achọghị ka ọ gafee otú ahụ. Ma ọ chọghị ihe ga-eme ka ya na Devid gbasaa. E nweghị nwa okorobịa ọzọ na-eme ya obi ụtọ otú Devid si eme ya, na-emekwa ya ka ọ̀ bụ àkwá ugo. Sera gwara onwe ya, sị: ‘Ihe ọzọ bụ na Devid hụrụ m n’anya, mụnwa ahụkwa ya n’anya.’

OBI gị nwere ike ịgwa gị ihe ga-emecha mee n’akụkọ a. Ma o nwere ike obi gị agaghị agwa gị ụdị nsogbu Devid na Sera ga-enwe ma ọ bụrụ na ha enwee mmekọahụ. Chegodị ihe a:

Chineke mere iwu dị iche iche na-achị ihe ndị o kere. N’ihi ya, mmadụ si n’ebe dị oké elu wụtuo, o nwere ike ịgbaji ụkwụ. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ga-eme ma mmadụ mebie iwu Chineke nyere banyere omume, dị ka iwu ahụ sịrị: “Zere ịkwa iko.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:3) Gịnị ga-eme onye dara iwu ahụ? Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.” (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Olee otú o si bụrụ eziokwu? N’okpuru ebe a, lee ma ị̀ ga-edeli nsogbu atọ nwoke na nwaanyị nwere ike inwe ma ha nwee mmekọahụ tupu ha alụọ.

1 ․․․․․

2 ․․․․․

3 ․․․․․

Leruo ihe ndị ahụ i dere anya. Ì dere ọrịa a na-ebute ná mmekọahụ, ịtụrụ ime ọkwà ma ọ bụ ịkpasu Chineke iwe? Ihe ndị ahụ so ná nnukwu nsogbu mmadụ nwere ike inwe ma onye ahụ mebie iwu Chineke nyere gbasara ịkwa iko.

Ma ọnwụnwa nwere ike ịbịara gị, gị ana-eche, sị, ‘O nweghị ihe ga-eme mụnwa.’ Ọ̀ bụ na mmadụ niile anaghị enwe mmekọahụ? Ụmụ akwụkwọ ibe gị na-ejikarịkwa inwe mmekọahụ etu ọnụ, o yikwara ka o nweghị ihe na-eme ha. I nwere ike iche na inwe mmekọahụ ga-eme ka gị na onye gị na ya na-akpa dịkwuo ná mma otú ahụ Sera anyị kọrọ akụkọ ya ná mmalite chere. Ònyekwanụ chọrọ ka a na-akọ ya ọnụ na ọ mabeghị nwoke ma ọ bụ na ọ mabeghị nwaanyị? Ọ́ kaghị mma ime ihe ndị ọzọ na-eme?

Chetụgodị echiche! Mara na ọ bụghị mmadụ niile na-eme ya. N’eziokwu, i nwere ike ịgụ ebe e dere na ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwe mmekọahụ. Dị ka ihe atụ, otu nchọpụta e mere n’Amerịka gosiri na e kee ndị eto eto ụzọ atọ, ụzọ abụọ enwewela mmekọahụ tupu ha agachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Nchọpụta ahụ pụtakwara na otu ụzọ n’ime ha anaghị eme ya. O gosiri na e nwere ọtụtụ ndị na-anaghị eme ya. Gịnị na-eme ndị ahụ na-enwe mmekọahụ? A chọpụtala na ọtụtụ ndị na-eto eto nwerela mmekọahụ na-emecha nwee ụfọdụ nsogbu ndị a.

NSOGBU NKE MBỤ OBI ERUGHỊ ALA. Ọtụtụ ndị na-eto eto, bụ́ ndị nwere mmekọahụ mgbe ha na-alụbeghị, kwuru na ha mechara kwaa mmakwaara.

NSOGBU NKE ABỤỌ ATỤKWASỊGHỊ IBE HA OBI. Nwoke na nwaanyị nwee mmekọahụ mgbe ha na-akpa, ihe onye ọ bụla n’ime ha ga-echewe bụ, ‘Ònye makwanụ onye ọzọ ya na ya nwerela mmekọahụ?’

NSOGBU NKE ATỌ ỊKWA MMAKWAARA. N’eziokwu, ọtụtụ ụmụ agbọghọ chọrọ ka ụmụ okorobịa ha na ha na-akpa na-elekọta ha, ọ bụghị imebi ha. Ọtụtụ ụmụ okorobịa na-achọpụtakwa na ụmụ agbọghọ ndị kwere ka ha na ha nwee mmekọahụ anaghịzi amasịcha ha.

E wezụga ihe ndị a anyị kwurula, ọtụtụ ụmụ okorobịa ekwuola na o nweghị ihe ga-eme ka ha lụọ nwa agbọghọ ha na ya nwetụrụla mmekọahụ. Gịnị mere ha ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ha chọrọ ịlụ onye na-emebibeghị!

Ọ bụrụ na ị bụ nwaanyị, ihe ahụ ha kwuru ò juru gị anya ma ọ bụdị wee gị iwe? Cheta na ihe ndị na-eme ma nwa okorobịa na nwa agbọghọ nwee mmekọahụ mgbe ha na-alụbeghị dị iche n’ihe a na-egosi na fim nakwa na tiivi. Ndị na-eme fim na-eme ka ndị na-eto eto chee na mmadụ inwe mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye bụ ezigbo ihe nakwa na ọ bụ otú e si egosi ezigbo ịhụnanya. Ma ekwela ka a ghọgbuo gị! Ndị chọrọ ịrata gị ka i nwee mmekọahụ na-achọ naanị ọdịmma nke ha. (1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5) A sị ka e kwuwe, onye hụrụ gị n’anya n’eziokwu ọ̀ ga-eme ihe nwere ike ịkpatara gị nsogbu ọ bụla? (Ilu 5:3, 4) Onye na-echere gị echiche ọma n’eziokwu ọ̀ ga-anwa gị ọnwụnwa ka i mee ihe ga-eme ka gị na Chineke ghara ịdị ná mma?—Ndị Hibru 13:4.

Ọ bụrụ na ị bụ nwa okorobịa nwere nwa agbọghọ ya na ya na-akpa, ihe e kwuru n’isiokwu a kwesịrị ime ka i chebara adịm ná mma gị na onye ahụ echiche. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ hụrụ ya n’anya n’eziokwu?’ Ọ bụrụ na ị hụrụ ya n’anya, olee otú kacha mma i nwere ike isi gosi ya? Ihe ị ga-eme bụ ịkata obi na-edebe iwu Chineke, inwe amamihe nke ga-eme ka i zere ọnwụnwa, na ịhụnanya nke ga-eme ka ị na-eme ihe ga-abara onye ahụ uru. I nwee àgwà ndị ahụ, obi nwere ike ịdị nwa agbọghọ ahụ otú ọ dị nwa agbọghọ Shulem ahụ na-emebighị onwe ya, bụ́ onye kwuru, sị: “Onye m hụrụ n’anya bụ nke m, abụkwa m nke ya.” (Abụ Sọlọmọn 2:16) N’eziokwu, ọ ga-eji gị na-eme ọnụ!

Ma ị̀ bụ nwoke ma ị̀ bụ nwaanyị, i nwee mmekọahụ mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, i reela ùgwù gị n’ihi na ị tụfuola ihe bara ezigbo uru i nwere. (Ndị Rom 1:24) Ka a sịkwa ihe mere obi ji ajọ ọtụtụ ndị na-eto eto njọ ma ha nwechaa mmekọahụ, ya adị ha ka ha abaghịzi uru, dịkwa ha ka hà mere iberiibe tụfuo ihe bara ezigbo uru ha nwere! Ekwela ka ụdị ihe ahụ mee gị. Mmadụ chọọ ịrata gị ka gị na ya nwee mmekọahụ ma sị gị, “Ọ bụrụ na ị hụrụ m n’anya, ị ga-ekwe,” gwa ya hoo haa, sị, “Ọ bụrụ na ị hụrụ m n’anya, ị gaghị agwa m mee ya!”

Ahụ́ gị bara ezigbo uru. I kwesịghị ikwe ka e mebie ya. Gosi na i kpebisiri ike irube isi n’iwu ahụ Chineke nyere ka anyị zere ịkwa iko. I mechaa lụọ di ma ọ bụ nwunye, ị ga-enwezi ike inwe mmekọahụ. Obi ga-adị gị ụtọ inwe ya mgbe ahụ n’ihi na ị gaghị na-echegbu onwe gị, na-akwa mmakwaara, ma ọ bụ nwee nsogbu ndị ọzọ ịkwa iko na-akpatakarị.—Ilu 7:22, 23; 1 Ndị Kọrịnt 7:3.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A N’ISI NKE 4 NA NKE 5 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Mmadụ iji aka ya egbo onwe ya agụụ mmekọahụ ọ̀ dị njọ?

AMAOKWU BAỊBỤL

“Gbaaranụ ịkwa iko ọsọ. . . . Onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.”—1 Ndị Kọrịnt 6:18.

NDỤMỌDỤ

Ihe i kwesịrị ikpebi ịna-eme mgbe gị na onye na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nọ bụ: Emela ihe ọ bụla ị na-achọghị ka ndị mụrụ gị hụ ka ị na-eme ya.

Ị̀ MA NA . . . ?

Nwoke na nwaanyị kpawa ma nwee mmekọahụ, nke nwoke nwere ike ịhapụ nke nwaanyị, chọrọ nwa agbọghọ ọzọ.

IHE M GA-EME!

Ebe mụ na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m na-ekwesịghị ịnọ naanị anyị bụ ․․․․․

Onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m chọọ ka anyị nọrọ naanị anyị, ihe m ga-ekwu bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịna-agụsi gị ike ka i nwee mmekọahụ tupu ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, gịnị mere na i kwesịghị ime ya?

● Gịnị ka ị ga-eme ma mmadụ gwa gị ka i nwee mmekọahụ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 176]

“Ebe ị bụ Onye Kraịst, i nwere àgwà ọma ndị ga-eme ka ihe gị na-amasị ndị ọzọ. N’ihi ya, i kwesịrị ịsa anya ná mmiri ma gbaara onye ọ bụla chọrọ ka gị na ya mee omume rụrụ arụ ọsọ. Jiri àgwà ọma ndị ahụ kpọrọ ihe. Ekwela ka onye ọ bụla mebie ha!”—Jọshụa

[Foto dị na peeji nke 176, 177]

Mmadụ inwe mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye yiri iji foto mara mma mere ihe e ji ehicha ụkwụ