Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụ na Onye M Chọrọ Ịlụ Gbasaa, Olee Otú M Ga-esi Die Ya?

Mụ na Onye M Chọrọ Ịlụ Gbasaa, Olee Otú M Ga-esi Die Ya?

ISI NKE 31

Mụ na Onye M Chọrọ Ịlụ Gbasaa, Olee Otú M Ga-esi Die Ya?

“Mụ na nwa okorobịa chọrọ ịlụ m na-akpa kemgbe ọnwa isii, mụ na ya dịkwa ná mma kemgbe afọ ise. Mgbe ọ chọrọ ka anyị gbasaa, ọ maghị otú ọ ga-esi agwa m ya. Ọ nọkatara kwụsị ịtụpụrụ m ọnụ. Amaghị m ihe m ga-eme eme. Atụghị m anya na ọ ga-eme m ụdị ihe ahụ. M nọ na-ajụ onwe m, sị: ‘Gịnị ka m mere ya?’”—Rechel.

GỊ NA onye ị chọrọ ịlụ gbasaa, o nwere ike imebi gị obi, meekwa ka ị na-ebe sọọsọ ákwá. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere Jeff na Susan, bụ́ ndị kpara ruo afọ abụọ. N’ime afọ abụọ ahụ, ha ji nwayọọ nwayọọ rie ibe ha obi. Ọtụtụ ugboro n’ụbọchị, Jeff na-ede ozi n’ekwe ntị zigara Susan ma gwa ya na ọ hụrụ ya n’anya. Ọ na-enye ya onyinye mgbe ụfọdụ iji gosi ya na o bu ya n’obi. Susan sịrị: “Jeff na-agbalị ige m ntị na ịghọta otú obi dị m. Ọ naghị eji m egwu egwu.”

N’egbughị oge, Jeff na Susan amalite ikwu okwu ọlụlụ nakwa ebe ha ga-ebi ma ha lụọ. Jeff gwadịrị Susan na ya ga-azụrụ ya ọla aka. Ma otu ụbọchị, Jeff gwara Susan na o nweghịzi ihe jikọrọ ha abụọ! Obi gbawara Susan. Ọ na-eme ihe ndị o kwesịrị ime n’ụbọchị, ma obi ya anaghị adị n’ihe ọ na-eme, ike ụwa gwụkwara ya. Ọ sịrị: “Isi malitere ịgba m ghara ghara. O nweghịzi ihe ike na-adị m ime.” *

Ihe Mere O Ji Agbawa Obi

Ọ bụrụ na ụdị ihe a mere Susan emetụla gị, i nwere ike ichewe, sị, ‘M̀ ga-emecha chefuo ihe a?’ O doro anya na obi kwesịrị ịgbawa gị. Eze Sọlọmọn dere, sị: “Ịhụnanya siri ike dị ka ọnwụ.” (Abụ Sọlọmọn 8:6) N’ihi ya, gị na onye ị chọrọ ịlụ gbasaa, o nwere ike iso n’ihe kacha agbawa obi metụrụla gị. N’eziokwu, ụfọdụ na-ekwu na mmadụ na onye ọ chọrọ ịlụ gbasaa, ọ na-adị ka nnukwu ihe ọ̀ pụrụ onye ahụ n’ahụ́. I nwedịrị ike ịchọpụta na otú o si ewute gị yiri ihe e kwuru n’okpuru ebe a:

Ekwetaghị. ‘Ekwetaghị m na anyị agbasaala. Ọ ga-agbanwe obi ya n’oge na-adịghị anya.’

Iwe. ‘Olee otú ọ ga-esi mee m ụdị ihe a? Ihe ya na-ewe m iwe!’

Ịda mbà. ‘Ụwa niile kpọrọ m asị. O nweghị onye ga-ahụ m n’anya.’

Ikweta. ‘Ihe ga-emecha dị mma. Ọ na-ewute m, ma m ga-emecha chefuo ya.’

Ihe kwesịrị ime gị obi ụtọ bụ na ị ga-emecha kweta na unu agbasaala. Ihe nwere ike ime ka o wee oge tupu gị ekweta na unu agbasaala bụ ọnwa ole ma ọ bụ afọ ole unu kpara, otú unu dịruru ná mma, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ka ọ dị ugbu a, olee otú i nwere ike isi die ya?

Otú Ị Ga-esi Chefuo Ya

Ikekwe, ị nụla ka e kwuru, sị: ‘E mechaa, ọ ga-adị mma.’ Ozugbo unu gbasara, ụdị okwu ahụ nwere ike ịdị gị ka ihe na-agaghị eme eme, n’ihi na ọ bụghị naanị oge ga-eme ka i chefuo ya. Dị ka ihe atụ: I merụọ ahụ́, ọ ga na-afụ gị ụfụ ugbu a, ma e mechaa, ọ ga-ala. I kwesịrị ite ya ihe ga-eme ka ọ kwụsị ịgba ọbara, kwụsịkwa ịfụ gị ụfụ. I kwesịghị ikwe ka nje baa na ya. E nwere ike iji ya tụnyere mgbe obi gbawara gị. Ọ ga na-afụ gị ụfụ n’obi ugbu a. Ma e nwere ihe ndị ị ga-eme ka mwute ọ na-ewute gị belata nakwa ka ị ghara ibu iwe n’obi. Ihe ga-emecha dị mma, ma olee ihe gịnwa kwesịrị ime? Gbalịa ime ihe ndị a.

Ákwá gụọ gị, bee ya. Ibe ákwá abụghị ihe ọjọọ. Baịbụl kwudịrị na e nwere ma “oge ịkwa ákwá” ma “oge ịkwa ákwá arịrị.” (Ekliziastis 3:1, 4) I bee ákwá, ọ pụtaghị na ị bụghị dimkpa. Devid bụ dike obi kara. Ma mgbe nsogbu kowere ya obi n’elu, o kwuru, sị: “N’ogologo abalị dum, m na-eme ka ihe ndina m dee mmiri; m na-eme ka ihe ndina m jupụta n’anya mmiri m.”—Abụ Ọma 6:6.

Na-elekọta onwe gị anya. Ihe ahụ merenụ nwere ike ime ka ị na-eche oké echiche. Ma imega ahụ́ na iri ezigbo nri ga-enyere gị aka inweta onwe gị. Baịbụl kwuru, sị: ‘Ọzụzụ nke ahụ́ bara uru.’—1 Timoti 4:8.

Olee ihe ndị i nwere ike ịna-eme ka i nweta onwe gị?

․․․․․

Anọla nkịtị. Akwụsịla ime ihe na-eme gị obi ụtọ. Ọ bụ ugbu a ka ọ kacha mkpa ka ị ghara ịna-akpa iche. (Ilu 18:1) Ọ bụrụ na gị na ndị hụrụ gị n’anya na-anọrị, ọ ga-eme ka obi gị na-adị n’ihe dị mma.

Olee ihe ndị i nwere ike ikpebi ime?

․․․․․

Gwa Chineke otú ọ dị gị n’obi. Ime otú ahụ nwere ike isiri gị ike. Ụfọdụ ndị ụdị ihe ahụ mere na-eche na Chineke mere ha ihe ọjọọ. Ha na-eche, sị: ‘Ekpechara m ekpere niile m kpere ka m nweta onye ọ ga-abụ mụ na ya, lezienụ ihe mere ugbu a!’ (Abụ Ọma 10:1) Ma, ànyị kwesịrị iche na ihe Chineke na-arụ bụ ịnọ n’eluigwe na-achọtara mmadụ onye ọ ga-alụ? Mbanụ; e kwesịghịkwa ịta ya ụta ma mmadụ kpebie ịhapụ onye o kwere nkwa ịlụ. Otu ihe anyị ma banyere Jehova bụ na: ‘Ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) N’ihi ya, kpee ekpere gwa ya otú ọ dị gị n’obi. Baịbụl kwuru, sị: “Mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Olee ihe ụfọdụ ị ga-agwa Jehova n’ekpere ka ị na-agbalị idi mwute ị na-enwe n’ihi na unu agbasaala?

․․․․․

Ilepụ Anya n’Ihu

I nwetachaa onwe gị, o nwere ike ịdị mma ka i chee echiche nke ọma banyere ihe ndị mere mgbe ahụ gị na onye ahụ ka na-akpa. Mgbe i jikeere ime ya, o nwere ike ịbara gị uru ma ị zaa ajụjụ ndị a jụrụ n’igbe dị na peeji nke 224, bụ́ “ Gịnị Ka M Nwere Ike Ịmụta ná Mgbasa Anyị Gbasara?

N’eziokwu, ihe adabaraghị gị na onye ahụ otú ị tụrụ anya ya. Ma cheta na nnukwu mmiri zowe, ihe a na-ahụkarị bụ otú eluigwe si gbajie na otú mmiri si ezosi ike. Ma mmiri ahụ ga-emecha kwụsị, eluigwe agbachapụ. Ụmụ agbọghọ ndị ahụ e dere ihe ha kwuru ná mmalite isiokwu a mechara die ihe ahụ mere ha, chefuokwa ya. Ka obi sie gị ike na nke gị ga-adịkwa otú ahụ!

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Olee ihe ndị i nwere ike ime ka a ghara idina gị n’ike?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ọ bụ ezie na ọ bụ ụmụ nwaanyị ka e dere ihe ha kwuru n’isiokwu a, ihe ndị e kwuru ebe a gbasara ụmụ nwoke.

AMAOKWU BAỊBỤL

“[Jehova] na-agwọ ndị e tiwara obi, ọ na-ekechikwa ọnyá na-egbu ha mgbu.”—Abụ Ọma 147:3.

NDỤMỌDỤ

Susan ahụ e dere ihe o kwuru ná mmalite isiokwu a depụtara amaokwu Baịbụl ụfọdụ ma debe ya n’ebe ọ ga na-ahụ ya ka o nwee ike ịgụ ha mgbe ọ dị ya ka o bewe ákwá. I nwekwara ike idepụta ụfọdụ amaokwu Baịbụl ndị dị n’isiokwu a ma na-agụ ha.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọtụtụ ndị dị afọ iri na ụma ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-akpa anaghị emecha lụọ. Ndị lụkwaranụ alụ na-agbakarị alụkwaghịm.

IHE M GA-EME!

Mụ na onye m chọrọ ịlụ gbasaa, ihe m ga-eme nke ga-enyere m aka ichefu ya bụ ․․․․․

Àgwà m chọrọ ịmụtakwu nke ga-enyere m aka ịbụ ezigbo mmadụ ma mụ na onye ọzọ kpawa b ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị ka ị mụtara banyere onwe gị ma i cheta otú unu si kpaa tupu unu agbasaa?

● Gịnị ka ị mụtara banyere ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 227]

“Ka oge na-aga, ị ga-aghọtakwu otú i kwesịrị isi lee ihe ahụ merenụ anya. Iwe gị ga-adajụ, nke ga-eme ka i chee echiche nke ọma banyere ihe ahụ merenụ ma were ya otú ị hụrụ ya. Ihe ọzọ bụ na ị ga-aghọtakwu ụdị onye ị bụ nakwa ụdị àgwà onye ị ga-alụ kwesịrị inwe nakwa ihe ị ga-eme ka ihe ahụ mere mbụ ghara ime gị ọzọ.”—Corrina

[Igbe dị na peeji nke 224]

 Ebe M Dere Ihe

Gịnị Ka M Nwere Ike Ịmụta ná Mgbasa Anyị Gbasara?

Ọ̀ gwara gị ihe mere unu ji gbasaa? Ọ bụrụ na ọ gwara gị, dee ya n’okpuru ebe a, ọ bụrụgodị na i chere na ihe ahụ ekwesịghị ime ka unu gbasaa. ․․․․․

Olee ihe ndị ọzọ i chere mere unu ji gbasaa? ․․․․․

I cheta ihe ahụ merenụ, è nwere ihe i chere ị gaara eme ka unu ghara ịgbasa? Ọ bụrụ na e nwere, gịnị ka ọ bụ? ․․․․․

Ihe ahụ mere gị ò meela ka ị hụ ebe ndị i kwesịrị imekwu nke ọma, ma n’adịm ná mma gị na Chineke ma n’otú i si eche echiche? ․․․․․

Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ akpawa, olee ihe ndị i chere ị na-ekwesịghị ime? ․․․․․

[Foto dị na peeji nke 223]

Gị na onye ị chọrọ ịlụ gbasaa, ọ na-adị ka ebe e merụrụ gị ahụ́—ọ ga na-afụ gị ụfụ, ma ị ga-emecha nweta onwe gị