Inyere Ndị Ọzọ Aka Ime Uche Chineke
Ihe Ọmụmụ nke 15
Inyere Ndị Ọzọ Aka Ime Uche Chineke
N’ihi gịnị ka ị ga-eji gwa ndị ọzọ banyere ihe ndị ị na-amụta? (1)
Olee ndị ka ị pụrụ isoro kerịta ozi ọma ahụ? (2)
Mmetụta dị aṅaa ka àgwà gị pụrụ inwe n’ahụ ndị ọzọ? (2)
Olee mgbe ị pụrụ isoro ọgbakọ mee nkwusa? (3)
1. Ka ọ dị ugbu a, ị mụtawo ọtụtụ ihe dị mma site na Bible. Ihe ọmụma a kwesịrị iduga na gị ịzụlite ọdịdị nke ndị Kraịst. (Ndị Efesọs 4:22-24) Ihe ọmụma dị otú ahụ dị mkpa ka i wee nwee ike inweta ndụ agwụghị agwụ. (Jọn 17:3) Otú ọ dị, ọ dịkwa ndị ọzọ mkpa ịnụ ozi ọma ahụ ka e wee nwee ike ịzọpụtakwa ha. Ezi ndị Kraịst nile aghaghị ịgbara ndị ọzọ àmà. Ọ bụ iwu Chineke.—Ndị Rom 10:10; 1 Ndị Kọrint 9:16; 1 Timoti 4:16.
2. Ị pụrụ ịmalite site n’isoro ndị ọzọ nọ gị nso kerịta ezi ihe ndị ị na-amụta. Kọọrọ ha ndị ezinụlọ, ndị enyi, ụmụ akwụkwọ, na ndị ọrụ ibe gị. Na-enwe obi ebere na ndidi mgbe ị na-eme otú ahụ. (2 Timoti 2:24, 25) Cheta na ndị mmadụ na-elekarị àgwà mmadụ anya karịa ka ha na-ege ntị n’ihe ọ na-ekwu. Ya mere ezi àgwà gị pụrụ ịdọta ndị ọzọ ịṅa ntị n’ozi ị na-ezi ha.—Matiu 5:16; 1 Pita 3:1, 2, 16.
3. Ka oge na-aga, ị pụrụ iru eru ịmalite iso ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị mee nkwusa. Nke a bụ nzọụkwụ dị mkpa n’ọganihu gị. (Matiu 24:14) Lee aha ọṅụ ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na i nwere ike inyere onye ọzọ aka ịghọ ohu Jehova ma nweta ndụ agwụghị agwụ!—1 Ndị Tesalọnaịka 2:19, 20.