Izrel n’Ógbè Ebe Ọ Dị
JEHOVA gwara Ebreham, sị: ‘Si na Ọọ nke dị na Mesopotemia jee nke gị ruo ala ahụ nke M ga-eme ka ị hụ ya anya.’ Ala ahụ bụ nke ndị mmadụ bi na ya na nke mba ndị ọzọ gbara gburugburu.—Je 12:1-3; 15:17-21.
Ka ndị Chineke si Ijipt na-apụ, ha maara na ndị iro ha, dị ka “ebulu nke Moab,” pụrụ iguzogide ha. (Ọp 15:14, 15) Ndị Amalek, Moab, Amọn, na Amọraịt bi n’ụzọ ndị Izrel ga-esi gaa Ala Nkwa ahụ. (Ọg 21:11-13; De 2:17-33; 23:3, 4) Ndị Izrel ga-ezutekwa mba ndị ọzọ bụ́ ndị iro n’ala ahụ Chineke kwere ha ná nkwa.
Chineke sịrị na Izrel “ga-ewepụkwa” ‘mba asaa dị ọtụtụ’—ndị Het, ndị Gegash, ndị Amọraịt, ndị Kenan, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jibọs—bụ́ ndị kwesịrị mbibi. Ha bụ ndị omume ha rere ure nakwa ndị okpukpe ha rụrụ arụ. Chi ha gụnyere Bel (nke e ji ogidi nkume yiri akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ mara), Molek (nke e ji ụmụaka achụrụ àjà), na chi nwanyị ọmụmụ bụ́ Ashtọret (Astarte).—De 7:1-4; 12:31; Ọp 23:23; Le 18:21-25; 20:2-5; Ikp 2:11-14; Ọma 106:37, 38.
Mgbe ụfọdụ, a na-akpọ gburugburu ebe ahụ nile Chineke na-aga inye Izrel “Kenan,” site n’ebe ugwu nke Saịdọn ruo “mmiri iyi Ijipt.” (Ọg 13:2, 21; 34:2-12; Je 10:19) N’oge ndị ọzọ, Bible na-akpọgasị mba, obodo, ma ọ bụ ndị bi n’ala ahụ aha. Ụfọdụ nwere ógbè ndị doro anya, dị ka ndị Filistia bi n’ụsọ oké osimiri na ndị Jibọs bi n’ugwu ndị dị Jeruselem nso. (Ọg 13:29; Jos 13:3) Ndị ọzọ gbanwere ógbè ma ọ bụ ókèala ka oge na-aga.—Je 34:1, 2; 49:30; Jos 1:4; 11:3; Ikp 1:16, 23-26.
N’oge Ọpụpụ ahụ, o yiri ka ọ bụ ndị Amọraịt bụ agbụrụ kasị ike. a (De 1:19-21; Jos 24:15) Ha ejiriwo aka ike nara ala ndị Moab ná mgbada ndagwurugwu mmiri iyi Anọn, ọ bụ ezie na a ka na-akpọ ebe dị n’ófè Jeriko ‘ala ihe na-adịghị nke Moab.’ Ndị eze Amọraịt chịkwara Beshan na Gilied.—Ọg 21:21-23, 33-35; 22:1; 33:46-51.
N’agbanyeghị na ha nwere nkwado Chineke, ndị Izrel ekpochapụghị mba ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ, bụ́ ndị duhiere Izrel ka oge na-aga. (Ọg 33:55; Jos 23:13; Ikp 2:3; 3:5, 6; 2Ez 21:11) Ee, e duhiere ndị Izrel n’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị, bụ́: “Unu ejesola chi ọzọ, ndị sitere na chi nke ndị ahụ ndị nọ unu gburugburu.”—De 6:14; 13:7.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka okwu bụ́ “Onye Kenan,” a pụrụ iji okwu bụ́ “Onye Amọraịt” mee ihe ịgụnye ndị nile bi n’ala ahụ ma ọ bụkwanụ jiri ya mee ihe maka otu agbụrụ.—Je 15:16; 48:22.
[Map dị na peeji 11]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Mba Ndị A Ga-ekpochapụ n’Ala Nkwa Ahụ
FILISTIA (D8)
CH8 Ashkelọn
CH9 Geza
D8 Ashdọd
D8 Gat
D9 Giraa
KENAN (D8)
B10 NDỊ AMALEK
CH12 Heza-ada (Ada?)
CH12 Kedesh (Kedesh-bania)
D8 Lekish
D9 Bia-shiba
D10 NDỊ AMỌRAỊT
D11 NEGEB
E4 Dọọ
E5 Megido
E5 Teanak
E6 Efek
E6 NDỊ HAỊVAỊT
E7 NDỊ JIBỌS
E8 Bet-shimesh
E8 Hibrọn (Kiriat-aba)
E9 NDỊ HET
E9 Diba
E10 Erad (nke Kenan)
E10 NDỊ KENA
E11 Akrabim
F4 NDỊ GEGASH
F6 Shikem
F7 NDỊ PERIZAỊT
F7 Gilgal
F7 Jeriko
F8 Jeruselem
G2 NDỊ HAỊVAỊT
G2 Dan (Leish)
G3 Hezọ
FINISHIA (F2)
E2 Taịa
F1 Saịdọn
IDỌM (F12)
F11 SIA
G11 Bọzra
NDỊ AMỌRAỊT (SAỊHỌN) (G8)
G6 GILIED
G7 Shitim
G7 Heshbọn
G9 Aroa
SIRIA (GB1)
G1 Bel-gad
G2 NDỊ HAỊVAỊT
GH1 Damaskọs
MOAB (H10)
NDỊ AMỌRAỊT (ỌG) (GH5)
G6 GILIED
GB3 BESHAN
GB4 Ashtarọt
GB4 Edraị
AMỌN (GH7)
GB7 Raba
[Ọzara]
GB12 ỌZARA AREBIA
[Ugwu]
E4 Ugwu Kamel
E11 Ugwu Họọ
G1 Ugwu Hemọn
G8 Ugwu Nibo
[Mmiri]
CH6 Oké Osimiri Mediterenian (Osimiri Ukwu)
F9 Oké Osimiri Nnu
G4 Oké Osimiri Galili
[Osimiri na Iyi]
B11 N.M.I. Ijipt
F6 Osimiri Jọdan
G6 N.M.I. Jabọk
G9 N.M.I. Anọn
G11 N.M.I. Zired
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
N’aka nri: Eze Ọg nke Amọraịt chịrị Beshan, bụ́ ebe e ji oké ehi na atụrụ ya mara
N’okpuru: Moab, nke chere ihu n’ófè Oké Osimiri Nnu na ọzara Juda
[Foto dị na peeji nke 11]
Jehova gwara ndị Izrel ka ha bibie mba ndị na-efe chi ụgha ndị dị ka Bel, Molek, na chi nwanyị ọmụmụ bụ́ Ashtọret (nke e gosiri n’ebe a)