Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Mmụọ Ọjọọ Na-agba Ume Inupụrụ Chineke Isi

Ndị Mmụọ Ọjọọ Na-agba Ume Inupụrụ Chineke Isi

Ndị Mmụọ Ọjọọ Na-agba Ume Inupụrụ Chineke Isi

Ma n’ihi gịnị ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eji arụsi ọrụ ike otú a iduhie ụmụ mmadụ? N’ihi na ha chọrọ ka anyị sonye ná nnupụisi ha. Ha chọrọ ka anyị fee ha ofufe. Ha chọrọ ka anyị kwere okwu ụgha ha nile, ka nyị meekwa ihe ndị na-amasịghị Jehova. Ọtụtụ n’ime ihe ndị a metụtara omenala ndị e jikọrọ ha na ndị nwụrụ anwụ.

Ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya bụ ahụmahụ na-eweta mmetụta ihe mgbu, ọ bụkwa ihe ziri ezi, kwesịkwa ekwesị igosipụta mwute. Mgbe enyi ya bụ Lazarọs nwụsịrị, “anya mmiri pụrụ n’anya Jisọs.”​—Jọn 11:35.

E nwere ọtụtụ omenala e jikọtara ha na ọnwụ, ndị a na-adịkwa iche iche n’akụkụ dị iche iche nke ụwa. Ọtụtụ n’ime ha adịghị emegide ụkpụrụ Bible. Otú ọ dị, ihe omume ụfọdụ dabeere n’echiche ahụ nke bụ na ndị nwụrụ anwụ dị ndụ, na ha nwekwara ike ịhụ ndị dị ndụ. Ịmụ anya abalị, iru újú a na-akparaghị ókè, na oké akwamozu gbanyechara mkpọrọgwụ n’egwu nke imejọ mmụọ ndị nwụrụ anwụ. Ma ebe ọ bụ na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla,” ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ na-akwalite okwu ụgha nke Setan.​—Eklisiastis 9:5.

Omenala ma ọ bụ ememe ndị ọzọ na-adabere na nkwenkwe ahụ nke bụ na ndị nwụrụ anwụ nwere mkpa enyemaka site n’aka ndị dị ndụ, na ha ga-emerụkwa ndị dị ndụ ahụ ma ọ bụrụ na e medaghị ha obi. N’ala ụfọdụ, a na-eme oké oriri, chụọkwa àjà ihe dị ka 40 ụbọchị ma ọ bụ otu afọ mgbe mmadụ nwụsịrị. A na-eche na nke a na-enyere onye ahụ nwụrụ anwụ aka ‘ịgabiga’ banye n’ógbè nke ndị bụ mmụọ. Ihe ọzọ a na-emekarị bụ inye ndị nwụrụ anwụ nri ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ.

Ihe ndị a ezighị ezi n’ihi na ha na-akwalite okwu ụgha ndị Setan kwuru banyere ndị nwụrụ anwụ. Jehova ọ̀ ga-akwado anyị inwe ihe ọ bụla jikọrọ anyị na omenala ndị dabeere n’ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ? Ọ dịghị ma ọlị!​—2 Ndị Kọrint 6:​14-18.

Ndị ohu nke ezi Chineke ahụ adịghị ekere òkè ọ bụla n’ihe omume ndị na-akwado okwu ụgha nile nke Setan. Kama nke ahụ, ha na-eji ịhụnanya lekwasị anya n’inyere ndị dị ndụ aka na ịkasi ha obi. Ha maara na ozugbo mmadụ nwụrụ, ọ bụ nanị Jehova pụrụ inyere onye ahụ aka.​—Job 14:​14, 15.

Chineke Katọrọ Mgbaasị

Ụfọdụ ndị na-enwe mmekọrịta n’etiti ha na ndị mmụọ ọjọọ kpọmkwem n’onwe ha ma ọ bụ site n’aka mmadụ nke na-ajụ ndị mmụọ ase. A na-akpọ nke a ime mgbaasị. Ihe omume voodoo, iri amoosu, majik, ịkọ ọdịnihu, na ịjụta ndị nwụrụ anwụ ihe bụcha ụdị dị iche iche nke mgbaasị.

Bible katọrọ ihe ndị a, na-asị: “A gaghị ahụta n’etiti gị onye . . . na-ajụ ase, ma ọ bụ onye na-eji igwe ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ, ma ọ bụ onye na-agba afa, ma ọ bụ onye mgbaasị, ma ọ bụ dibia nrafu, ma ọ bụ onye na-ajụ mmụọ ihe, ma ọ bụ dibia afa, ma ọ bụ onye na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ihe. N’ihi na ihe arụ nke Jehova ka onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ.”​—Deuterọnọmi 18:​10-12.

N’ihi gịnị ka Jehova ji na-adọsi anyị aka ná ntị ike megide ihe omume ndị a?

Maka ọdịmma nke onwe anyị, Jehova na-adọ anyị aka ná ntị megide ụdị nile nke mgbaasị. Ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, na-elekọtakwa ha, ọ maakwara na ndị na-etinye aka ná mmekọrịta ndị mmụọ ọjọọ aghaghị ịta ahụhụ.

Otu onye dị otú ahụ bụ Nilda, onye bụbu onye na-ajụ mmụọ ase na Brazil. Ndị mmụọ ọjọọ mere ka ndụ ya bụrụ nke oké ahụhụ. Ọ kọrọ, sị: “Ndị mmụọ . . . weghaara m, na-edugharị m. Ana m esi n’ọnọdụ nke ịma onwe m banye na nke amaghị onwe m mgbe mgbe, a kpọjekwara m ụlọ ọgwụ n’ihi ọrịa uche. Ndị mmụọ ọjọọ kpagburu m nke ukwuu nke na o metụtara akwara m. Ana m aṅụ ọgwụ nkụjụ ahụ, malitekwa ịṅụ mmanya na ise sịga n’esepụghị aka. Nke a gara n’ihu ruo ọtụtụ afọ.”

Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, site n’enyemaka nke Jehova na Ndịàmà ya nọ n’elu ala, Nilda nweere onwe ya site ná mmetụta ndị mmụọ ọjọọ, ugbu a, ọ na-ebikwa ndụ dị mma, na-ejukwa afọ. Ọ na-asị: “Ana m agba mmadụ nile ume ka ha ghara ịmalitedị amalite itinye aka ná mmekọrịta ndị mmụọ [ọjọọ].”

[Foto dị na peeji nke 19]

Omenala ụfọdụ dabeere n’okwu ụgha nke bụ na ndị nwụrụ anwụ pụrụ ịhụ anyị

[Foto dị na peeji nke 20]

Omenala ndị ọzọ dabeere n’okwu ụgha ahụ nke bụ na ndị nwụrụ anwụ nwere mkpa enyemaka anyị

[Foto dị na peeji nke 21]

Chineke na-emegide ajọ ihe ndị a. Ọ chọrọ ka a rara ofufe nye nanị ya.​—Ọpụpụ 20:5

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

Ndị na-eme mgbaasị na-ezutekarị ihe ọjọọ. Ụlọ ha, nnwere onwe ha, na ọbụna ndụ ha pụrụ ifunarị ha