Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE ANỌ

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịsọpụrụ Ndị Isi?

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịsọpụrụ Ndị Isi?

“Sọpụrụnụ ụdị mmadụ niile.” —1 PITA 2:17.

1, 2. (a) Olee ọgụ anyị na obi anyị na-alụ n’ihe banyere ịsọpụrụ ndị isi? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

Ị̀ HỤTỤLA ihe nwatakịrị na-eme ma a sị ya mee ihe ọ na-achọghị ime? I lee ya anya n’ihu, i nwere ike ịmata na ya na obi ya na-alụ ọgụ. Ọ nụrụ ihe nna ya kwuru, marakwa na o kwesịrị irubere nna ya isi. Ma ọ chọghị irube isi ugbu a. Ọgụ ahụ ya na obi ya na-alụ na-egosi ihe na-eme anyị niile mgbe ụfọdụ.

2 Ịsọpụrụ ndị isi anaghị adịrị anyị mfe mgbe niile. Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ ịsọpụrụ ndị ị nọ n’okpuru ha? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị naanị gị ka ọ na-esiri ike. Anyị bi n’oge o yiri ka ọtụtụ mmadụ anaghị asọpụrụ ndị isi. N’agbanyeghị nke ahụ, Baịbụl na-ekwu na anyị kwesịrị ịsọpụrụ ndị na-achị anyị. (Ilu 24:21) N’ezie, ime otú ahụ dị ezigbo mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke. Ya mere, e nwere ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ. Gịnị mere o nwere ike iji siere anyị nnọọ ike ịsọpụrụ ndị isi? Gịnị mere Jehova ji chọọ ka anyị na-asọpụrụ ndị isi, gịnịkwa ga-enyere anyị aka irube isi na nke a? N’ikpeazụ, olee ihe ndị anyị ga-eme iji na-asọpụrụ ndị isi?

IHE MERE O JI ESIRI ANYỊ IKE

3, 4. Olee otú mmehie na ezughị okè si malite, gịnị mere ezughị okè ji eme ka ịsọpụrụ ndị isi na-esiri anyị ike?

3 Ka anyị tụlee ná nkenke ihe abụọ mere ịsọpụrụ ndị isi nwere ike iji na-esiri anyị ike. Nke mbụ, anyị ezughị okè; nke abụọ, ndị mmadụ na-achị anyị ezughị okè. Mmehie na ezughị okè mmadụ malitere n’oge dị anya gara aga, mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi n’ogige Iden. Ya mere, mmehie malitere mgbe e nupụrụ isi. Ruo taa, mmụọ nke nnupụisi dị anyị n’ọbara.—Jenesis 2:15-17; 3:1-7; Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12.

4 Ebe anyị bụ ndị mmehie, ọ naghị ara ọtụtụ n’ime anyị ahụ́ ịdị nganga na mpako. Ma, ịdị umeala n’obi bụ àgwà dị ụkọ nke anyị kwesịrị ịrụsi ọrụ ike ịmụta ma na-enwe mgbe niile. N’agbanyeghị na anyị ejeerela Chineke ozi ruo ọtụtụ afọ, anyị nwere ike itinye aka n’omume isi ike na mpako. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere Kora, bụ́ onye ji ikwesị ntụkwasị obi soro ndị Jehova gabiga ọtụtụ ihe isi ike. Ma, inwetakwu ikike gụrụ ya agụụ, nke mere ka o jiri ịka anya duru ndị mmadụ nupụrụ Mozis isi, bụ́ onye dị umeala n’obi karịa mmadụ niile dị ndụ mgbe ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 12:3; 16:1-3) Cheekwa echiche banyere Eze Ọzaya, bụ́ onye mpako mere ka ọ banye n’ụlọ nsọ Jehova ma jee ozi dị nsọ nke naanị ndị nchụàjà na-eje. (2 Ihe E Mere 26:16-21) E nyere ndị dị otú ahụ ezigbo ntaramahụhụ n’ihi nnupụisi. Ma, ihe nlereanya na-adịghị mma ha setịpụrụ bụ ihe ncheta baara anyị niile uru. Anyị kwesịrị ịlụso mpako ọgụ, bụ́ ihe na-eme ka ịsọpụrụ ndị isi na-esiri anyị ike.

5. Olee otú ndị mmadụ na-ezughị okè sirila jiri ikike ha nwere mee ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị?

5 N’aka nke ọzọ, ndị na-ezughị okè bụ́ ndị na-achị achị na-eme ka ọ na-esiri ndị mmadụ ike nke ukwuu ịsọpụrụ ha. Obi tara ọtụtụ n’ime ha mmiri. Ha na-eme mpụ, ma ọ bụ na-achị n’aka ike. N’ezie, akụkọ ihe mere eme na-egosi na ndị mmadụ na-eji ikike ha nwere eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. (Ekliziastis 8:9) Dị ka ihe atụ, Sọl bụ ezigbo mmadụ nke dị umeala n’obi mgbe Jehova họọrọ ya ka ọ bụrụ eze. Otú ọ dị, ọ malitere ịdị mpako, nwewekwa anyaụfụ; nke mere ka ọ malite ịkpagbu Devid bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi. (1 Samuel 9:20, 21; 10:20-22; 18:7-11) Ka oge na-aga, Devid ghọrọ otu n’ime ezigbo ndị eze chịrị Izrel. Ma, o ji ikike o nwere mee ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị mgbe ọ naara Yuraya onye Het nwunye ya ma ziga nwoke ahụ aka ya dị ọcha n’ihu agha ka e gbuo ya. (2 Samuel 11:1-17) N’ezie, ezughị okè na-eme ka ọ na-esiri ndị mmadụ ike iji ikike ha mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ihe na-aka njọ ma ọ bụrụ na ndị na-achị achị adịghị asọpụrụ Jehova. Mgbe otu onye ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị Britain kọwachara otú ndị poopu Katọlik ụfọdụ si na-akpagbu ndị mmadụ n’ebe niile, o dere, sị: “Ike na-emebi mmadụ, ike a na-akparaghị ókè na-emebikwa mmadụ n’ụzọ a na-akparaghị ókè.” Ka anyị buru otú ụmụ mmadụ sirila jiri ikike ha nwere mee ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị n’uche tụlee ajụjụ bụ́: Gịnị mere anyị ji kwesị ịsọpụrụ ndị isi?

GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊSỌPỤRỤ NDỊ ISI?

6, 7. (a) Gịnị ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ ga-akpali anyị ime, ọ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee àgwà na-egosi na mmadụ na-edo onwe ya n’okpuru onye ọzọ, oleekwa otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere àgwà ahụ?

6 Ihe kacha n’ime ihe niile mere anyị ji kwesị ịsọpụrụ ndị isi bụ ịhụnanya, ya bụ, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ, ịhụnanya anyị nwere n’ebe mmadụ ibe anyị nọ, tinyere ịhụnanya anyị nwere n’ebe anyị onwe anyị nọ. Anyị kwesịrị ime ka obi Jehova ṅụrịa n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya karịa onye ọ bụla ọzọ. (Ilu 27:11; Mak 12:29, 30) Anyị ma na a mara ọchịchị ya aka n’ụwa, ya bụ, oruru o ruuru ya ịchị eluigwe na ụwa, mgbe ahụ e nupụụrụ ya isi n’Iden. Anyị makwa na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-akwado Setan ma jụ ọchịchị Jehova. Obi dị anyị ụtọ ịkwado Jehova. Mgbe ọ bụla anyị gụrụ ọmarịcha ihe e dere ná Mkpughe 4:11, ọ na-emetụ anyị n’obi. Ọ na-eme ka anyị ghọta nke ọma na ọ bụ Jehova ka o ruuru ịchị eluigwe na ụwa! Anyị na-akwado ọbụbụeze Jehova, na-anabata ọchịchị ya ná ndụ anyị na-ebi kwa ụbọchị.

7 Inye ya nsọpụrụ dị otú ahụ pụtara nrubeisi nakwa ihe karịrị nrubeisi. Anyị na-adị njikere irubere Jehova isi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. Otú ọ dị, e nwere mgbe ụfọdụ irubere ya isi ga-esiri anyị nnọọ ike. N’oge ndị dị otú ahụ, anyị onwe anyị, dị ka nwatakịrị ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite, kwesịrị ido onwe anyị n’okpuru Jehova. Anyị ga-echeta na Jizọs mere uche Nna ya, ọbụna mgbe o yiri ka ime otú ahụ siiri ya nnọọ ike. Ọ gwara Nna ya, sị, “Ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.”—Luk 22:42.

8. (a) Gịnị ka ido onwe anyị n’okpuru Jehova pụtara taa, gịnịkwa na-egosi otú Jehova si ele nke ahụ anya? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ịnụ ndụmọdụ ma nara ịdọ aka ná ntị? (Gụọ  igbe dị na peeji nke 46-47.)

8 Otú ọ dị, Jehova adịghị esi n’eluigwe agwa anyị okwu taa; ọ na-eji Okwu ya na ndị mmadụ na-anọchite anya ya n’ụwa agwa anyị okwu. Ya mere, anyị na-egosi na anyị na-edo onwe anyị n’okpuru Jehova site n’irubere ndị mmadụ isi, bụ́ ndị o mere ka anyị nọrọ n’okpuru ha ma ọ bụkwanụ ndị o kwere ka anyị nọrọ n’okpuru ha. Ọ bụrụ na anyị enupụrụ ndị ahụ isi—dị ka ihe atụ, site n’ịjụ ndụmọdụ na mgbazi sitere n’Akwụkwọ Nsọ ha na-enye anyị—anyị ga-akpasu Chineke iwe. Mgbe ụmụ Izrel tamuru ntamu megide Mozis ma nupụrụ ya isi, Jehova weere ya na ọ bụ ya ka ha mehiere.—Ọnụ Ọgụgụ 14:26, 27.

9. Gịnị mere ịhụnanya anyị nwere n’ebe mmadụ ibe anyị nọ ga-eji kpalie anyị ịsọpụrụ ndị isi? Nye ihe atụ.

9 Anyị na-asọpụkwara ndị isi n’ihi na anyị hụrụ mmadụ ibe anyị n’anya. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Ka e were ya na ị bụ otu n’ime ndị agha. Ọganihu nke ndị agha ahụ nakwa ndụ ha nwere ike ịdabere n’otú onye agha nke ọ bụla si edo onwe ya n’okpuru ndị isi, n’otú o si asọpụrụ ha, nakwa n’otú o si erubere ha isi. Ọ bụrụ na ị na-agba ndị agha ibe gị mgba okpuru site n’inupụ isi, ha niile nwere ike ịnọ n’ihe ize ndụ. N’ezie, ndị agha na-emebisị ihe n’ụwa taa. Otú ọ dị, Jehova nwere ndị agha na-eme naanị ihe dị mma. Baịbụl kpọrọ Chineke “Jehova nke ụsụụ ndị agha” ọtụtụ ugboro. (1 Samuel 1:3) Ọ bụ Ọchịagha nke ụsụụ ndị mmụọ ozi dị ike. Mgbe ụfọdụ, Jehova na-eji ndị ohu ya nọ n’ụwa atụnyere ụsụụ ndị agha. (Ezikiel 37:1-10) Ọ bụrụ na anyị enupụrụ ndị Jehova mere ka anyị nọrọ n’okpuru ha isi, ọ̀ bụ na anyị adịghị etinye ndị agha ime mmụọ ibe anyị n’ihe ize ndụ? Ọ bụrụ na Onye Kraịst enupụrụ ndị okenye a họpụtara ahọpụta isi, ọ ga-emetụta ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrịnt 12:14, 25, 26) Mgbe nwatakịrị nupụrụ isi, nnupụisi ahụ nwere ike imetụta ndị ezinụlọ ya niile. Ya mere, anyị na-egosi na anyị hụrụ mmadụ ibe anyị n’anya site n’inwe mmụọ nrubeisi na mmụọ nsọpụrụ.

10, 11. Olee otú ọchịchọ ziri ezi anyị nwere ime ihe ga-abara anyị uru ga-esi mee ka anyị na-erubere ndị isi isi?

10 Anyị na-asọpụkwara ndị isi n’ihi na ime otú ahụ bụ maka ọdịmma anyị. Mgbe ọ bụla Jehova gwara anyị ka anyị na-asọpụrụ ndị isi, ọ na-ekwukarị uru ndị anyị ga-erite n’ime otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ndị bụ́ ụmụ ka ha na-asọpụrụ nne ha na nna ha ka ha wee dị ogologo ndụ, biekwa ndụ obi ụtọ. (Diuterọnọmi 5:16; Ndị Efesọs 6:2, 3) Jehova gwara anyị ka anyị na-asọpụrụ ndị okenye ọgbakọ n’ihi na ọ bụrụ na anyị emeghị otú ahụ, anyị ga-emebi mmekọrịta anyị na ya. (Ndị Hibru 13:7, 17) Ọ gwakwara anyị ka anyị na-erubere ndị ọchịchị isi n’ihi na ime otú ahụ ga-echebe anyị.—Ndị Rom 13:4.

11 Ọ̀ bụ na i kwetaghị na anyị ịmara ihe mere Jehova ji chọọ ka anyị na-erube isi ga-enyere anyị aka ịsọpụrụ ndị isi? Ka anyị tụlezie otú anyị ga-esi na-asọpụrụ ndị isi n’ebe atọ dị mkpa ná ndụ.

IRUBE ISI N’EZINỤLỌ

12. Gịnị bụ ọrụ Jehova nyere onye bụ́ di na nna n’ezinụlọ, oleekwa otu ọ ga-esi na-arụ ọrụ ahụ?

12 Ọ bụ Jehova malitere ezinụlọ. Ebe ọ bụ Chineke nke na-eme ihe n’usoro, ọ haziri ezinụlọ ka ọ na-aga nke ọma. (1 Ndị Kọrịnt 14:33) O nyere onye bụ́ di na nna ikike ịbụ onyeisi ezinụlọ. Di ga na-asọpụrụ Onyeisi ya, bụ́ Kraịst Jizọs, site n’iṅomi otú Jizọs si achị ọgbakọ ya. (Ndị Efesọs 5:23) Ya mere, di ekwesịghị ileghara ọrụ ya anya, kama, ọ ga na-arụsi ya ike; o kwesịghịkwa iji aka ike na-achị ma ọ bụ bụrụ onye obi tara mmiri, kama, o kwesịrị ịbụ onye nwere ịhụnanya, ezi uche, na obiọma. O kwesịrị iburu n’uche na o nwere onye ọ nọ n’okpuru ya—na ikike Jehova karịrị nke ya.

Nna bụ́ Onye Kraịst na-eṅomi otú Kraịst si achị isi

13. Olee otú onye bụ́ nwunye na nne ga-esi na-arụ ọrụ ya n’ụzọ dị Jehova mma?

13 Onye bụ́ nwunye na nne bụ onye inyeaka di ya ma ọ bụ onye na-eme ka di ya zuo ezu. E nyekwara ya onwe ya ikike n’ezinụlọ, n’ihi na Baịbụl kwuru okwu banyere “iwu nne gị.” (Ilu 1:8) Otú ọ dị, ikike e nyere di ya karịrị nke ya. Onye Kraịst bụ́ nwunye na-asọpụrụ ikike di ya site n’inyere ya aka ka ọ na-arụ ọrụ ya dị ka onyeisi ezinụlọ. Ọ dịghị eleda di ya anya, na-achị ya, ma ọ bụ na-eweghara ọrụ ya. Kama nke ahụ, ọ na-akwado ya ma na-erubere ya isi. Mgbe di ya mere mkpebi na-adịghị ya mma, o nwere ike iji nkwanye ùgwù kwuo ihe o chere, ma o kwesịrị ịkwado mkpebi ahụ. Ọ bụrụ na di ya abụghị onye kwere ekwe, o nwere ike ịna-enwe ọnwụnwa. N’agbanyeghị nke ahụ, di ya nwere ike ịchọ ife Jehova ma ọ bụrụ na ọ na-asọpụrụ ya.—1 Pita 3:1.

14. Olee otú ụmụaka ga-esi wetara nne ha na nna ha ọṅụ, wetakwara Jehova ọṅụ?

14 Ụmụaka na-eme ka obi dị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na ha na-erubere nne ha na nna ha isi. Ha na-ewetakwara nne ha na nna ha nsọpụrụ na ọṅụ. (Ilu 10:1) N’ezinụlọ nke e nwere naanị nne ma ọ bụ nna, ụmụaka kwesịkwara ịsọpụrụ nne ha ma ọ bụ nna ha, n’ihi na nkwado na nrubeisi ha dị nne ha ma ọ bụ nna ha mkpa n’ọnọdụ ahụ karị. A na-enwe ezigbo udo na ọṅụ dị ukwuu n’ezinụlọ mmadụ niile na-arụ ọrụ Chineke nyere ha. Nke a na-ewetara Onye ezinụlọ niile si n’aka ya, bụ́ Jehova Chineke, nsọpụrụ.—Ndị Efesọs 3:14, 15.

IRUBE ISI N’ỌGBAKỌ

15. (a) N’ọgbakọ, olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-asọpụrụ ikike Jehova? (b) Olee ụkpụrụ ndị nwere ike ime ka anyị na-erubere ndị na-edu ndú isi? (Gụọ  igbe dị na peeji nke 48-49.)

15 Jehova họpụtara Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye na-achị ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ndị Kọlọsi 1:13) Jizọs nyekwara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ọrụ igbo mkpa ime mmụọ nke ndị Chineke nọ n’ụwa. (Matiu 24:45-47) Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-anọchite anya ohu ahụ. Dị ka ọ dị n’ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ, taa, Òtù Na-achị Isi na-enye ndị okenye ntụziaka na ndụmọdụ n’onwe ha ma ọ bụkwanụ site n’aka ndị nnọchiteanya ha, dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ọ bụ Jehova ka anyị na-erubere isi mgbe anyị na-asọpụrụ ndị okenye ọgbakọ.—Ndị Hibru 13:17.

16. Olee otú o si bụrụ na ọ bụ mmụọ nsọ na-ahọpụta ndị okenye?

16 Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ezughị okè. Ha na-emehie ihe dị ka anyị onwe anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, ha bụ “onyinye n’ụdị mmadụ,” ya bụ, onyinye e nyere ọgbakọ iji nyere ha aka mee ka mmekọrịta ha na Chineke sie ike. (Ndị Efesọs 4:8) Ọ bụ mmụọ nsọ na-ahọpụta ndị okenye. (Ọrụ 20:28) Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? N’ihi na ha na-ebu ụzọ eme ihe ndị e ji ike mmụọ nsọ dee n’Okwu Chineke tupu ha eruo eru ịbụ ndị a họpụtara. (1 Timoti 3:1-7, 12; Taịtọs 1:5-9) Ihe ọzọkwa bụ na ndị okenye bụ́ ndị na-atụle ma nwanna ò ruru eru ịbụ okenye na-ekpesi ekpere ike ka mmụọ nsọ Jehova duzie ha.

17. Olee ihe mere ụmụnna nwaanyị ji ekpuchi isi ha mgbe ụfọdụ ma ha na-arụ ọrụ n’ọgbakọ?

17 N’ọgbakọ, o nwere mgbe ụfọdụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-agaghị anọ ya ịrụ ọrụ ha, dị ka iduzi nzukọ maka ozi ubi. Ya dịrị otú ahụ, ụmụnna ndị ikom e mere baptizim nwere ike ịrụ ọrụ ndị dị otú ahụ. Ọ bụrụ na ha anọghị, ụmụnna nwaanyị ndị ruru eru nwere ike ịrụ ọrụ ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, nwanna nwaanyị kwesịrị ikpuchi isi ya mgbe ọ na-arụ ọrụ nwanna nwoke e mere baptizim kwesịrị ịrụ. * (1 Ndị Kọrịnt 11:3-10) Ime otú ahụ abụghị iweda ndị inyom ala. Kama nke ahụ, ọ na-enye ha ohere irube isi ná ndokwa Jehova mere maka ịbụisi, ma n’ezinụlọ ma n’ọgbakọ.

ỊSỌPỤRỤ NDỊ ỌCHỊCHỊ

18, 19. (a) Olee otú ị ga-esi akọwa ụkpụrụ ndị ahụ dị ná Ndị Rom 13:1-7? (b) Olee otú anyị si asọpụrụ ndị ọchịchị?

18 Ezi Ndị Kraịst na-eso ụkpụrụ ahụ dị ná Ndị Rom 13:1-7. Ọ bụrụ na ị gụọ ebe ahụ, ị ga-ahụ na “ndị ọchịchị” e kwuru okwu ha bụ ndị mmadụ na-achị achị. Ebe ọ bụ na Jehova kwere ka ndị ọchịchị a na-achị, ha na-eme ihe ndị dị mkpa. Ha na-eme ka e nwetụ udo. Ha na-arụkwa ọrụ ndị dị mkpa. Anyị na-asọpụrụ ndị ọchịchị a site n’idebe iwu ha nyere. Anyị kwesịrị ijide n’aka na anyị na-atụ ụtụ isi ọ bụla ha chọrọ ka anyị na-atụ, na-edejupụta akwụkwọ ọ bụla ha chọrọ ka anyị dejupụta, na-erubekwa isi n’iwu ọ bụla metụtara anyị, ezinụlọ anyị, ọrụ anyị, ma ọ bụ ihe onwunwe anyị. Otú ọ dị, anyị ekwesịghị irubere ndị ọchịchị isi ma ọ bụrụ na ha agwa anyị ka anyị mee ihe na-adịghị Chineke mma. Kama nke ahụ, anyị ga-ekwu ihe ahụ ndịozi oge ochie kwuru, ya bụ: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:28, 29; gụọ igbe dị na peeji nke 42, bụ́ “ Olee Onye M Ga-erubere Isi?

19 Anyị na-asọpụkwara ndị ọchịchị site n’ịkpaso ndị ọzọ àgwà ọma. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịbịa n’ihu ndị ọchịchị. Pọl onyeozi bịara n’ihu ndị ọchịchị dị ka Eze Herọd Agrịpa na Gọvanọ Festọs. Ọ dịghị onye n’ime ha bụ́ ezigbo mmadụ, ma Pọl kwanyeere ha ùgwù mgbe ọ na-agwa ha okwu. (Ọrụ 26:2, 25) Anyị kwesịrị iṅomi ihe nlereanya Pọl gosiri, ma onye ahụ ọ̀ bụ onye ọchịchị dị elu ma ọ bụ onye uwe ojii. Ụmụ akwụkwọ bụ́ Ndị Kraịst kwesịkwara ịsọpụrụ ndị nkụzi ha, tinyere ndị isi ụlọ akwụkwọ ha na ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ akwụkwọ ha. N’ezie, ndị anyị ga na-asọpụrụ ekwesịghị ịbụ naanị ndị okpukpe anyị dị mma; anyị kwesịkwara ịsọpụrụ ndị na-emegide Ndịàmà Jehova. N’ezie, ndị na-ekweghị ekwe kwesịrị ịhụ na anyị na-asọpụrụ ndị ọzọ.—Ndị Rom 12:17, 18; 1 Pita 3:15.

20, 21. Olee ụfọdụ n’ime ngọzi ndị a na-enweta n’ịsọpụrụ ndị ọchịchị n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

20 Ka anyị na-asọpụrụ mmadụ niile. Pita onyeozi dere, sị: “Sọpụrụnụ ụdị mmadụ niile.” (1 Pita 2:17) Ọ bụrụ na ndị mmadụ achọpụta na anyị na-enye ha ezigbo nsọpụrụ, ha nwere ike inwe nnọọ mmasị n’ebe anyị nọ. Cheta na àgwà a dị ezigbo ụkọ taa. Ịsọpụrụ ndị mmadụ bụ otu n’ime ụzọ anyị si erube isi n’iwu Jizọs nyere, ya bụ: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.”—Matiu 5:16.

21 N’ụwa a nọ n’ọchịchịrị, a na-adọta ndị nwere ezi obi n’ìhè ime mmụọ. Ya mere, ọ bụrụ na anyị na-erube isi n’ezinụlọ, n’ọgbakọ, na-asọpụkwara ndị ọchịchị, o nwere ike ime ka ndị ụfọdụ malite inwe mmasị n’ìhè ahụ, meekwa ka ha soro anyị jewe ije na ya. Nke a bụ nnọọ atụmanya magburu onwe ya! Ma ọ bụrụgodị na ha emeghị otú ahụ, otu ihe doro anya bụ na nsọpụrụ anyị na-asọpụrụ ndị mmadụ na-atọ Jehova Chineke ụtọ. Ọ na-enyekwara anyị aka ịnọrọ n’ịhụnanya ya. Ò nwere uru karịrị nke ahụ?

^ par. 17 Isiokwu ọzọ dị na peeji nke 209-212 tụlere ụzọ ole na ole pụtara ìhè a ga-esi mee ihe a e kwuru.