Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE IRI NA OTU

“Ka Alụmdi na Nwunye Bụrụ Ihe Kwesịrị Nsọpụrụ”

“Ka Alụmdi na Nwunye Bụrụ Ihe Kwesịrị Nsọpụrụ”

‘Ṅụrịa ọṅụ n’ihi nwunye ị lụrụ n’okorobịa.’—ILU 5:18.

1, 2. Olee ajụjụ anyị ga-atụle, n’ihi gịnịkwa?

Ị̀ LỤỌLA di ma ọ bụ nwunye? Ọ bụrụ na ị lụọla, alụmdi na nwunye gị ọ̀ na-eme gị obi ụtọ, ka ùnu na-enwe nsogbu ndị tara akpụ? Ịhụnanya unu ọ̀ jụọla oyi? Ị̀ na-edi alụmdi na nwunye gị, kama inwe obi ụtọ na ya? Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịbụ na ọ na-ewute gị na obi ụtọ ị na-enwebu n’alụmdi na nwunye gị efunyụọla anya. Ebe ị bụ Onye Kraịst, ị chọrọ n’ezie ka alụmdi na nwunye gị na-ewetara Jehova bụ́ Chineke ị hụrụ n’anya otuto. N’ihi ya, ọnọdụ ị nọ na ya ugbu a nwere ike ịna-echu gị ụra ma na-agbawa gị obi. N’agbanyeghị nke ahụ, biko, echela na ọnọdụ gị enweghị ngwọta.

2 Taa, e nwere ọtụtụ di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị o nwere mgbe ha na-aza na ha lụrụ di na nwunye, ma ha na-eme ihe iche iche. N’agbanyeghị nke ahụ, ha mere ka alụmdi na nwunye ha sie ike. I nwekwara ike inwetakwu obi ụtọ n’alụmdi na nwunye gị. Olee otú ị ga-esi eme ya?

BỊARUKWUO CHINEKE NA ONYE Ị LỤRỤ NSO

3, 4. Gịnị mere di na nwunye ga-eji nọrọ ibe ha nso ma ọ bụrụ na ha na-agbalịsi ike ịbịarukwu Chineke nso? Nye ihe atụ.

3 Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-abịarukwu ibe unu nso ma ọ bụrụ na unu na-agbalịsi ike ịbịarukwu Chineke nso. N’ihi gịnị? Chee echiche banyere ihe atụ a: Ka e were ya na otu nwoke na otu nwaanyị chọrọ ịrịgo n’ọnụ ọnụ otu ugwu. Nke nwoke si n’otu akụkụ ugwu ahụ, nke nwaanyị esi n’akụkụ ya nke ọzọ. Ha abụọ amalite ịrị ugwu ahụ. Ná mmalite, ha abụọ ga-anọ ibe ha n’ebe dị ezigbo anya. Ma, ka onye ọ bụla n’ime ha na-agbalị ịrịgo n’ọnụ ọnụ ugwu ahụ, ha abụọ ga na-abịaru ibe ha nso. Ị̀ ghọtara ihe ihe atụ a na-akụzi?

4 E nwere ike iji otú i si na-agbalịsi ike ijere Jehova ozi tụnyere mgbalị a na-etinye n’ịrị ugwu. Ebe ọ bụ na ị hụrụ Jehova n’anya, e nwere ike ikwu na ị na-agbalịsi ike ịrị ugwu. Otú ọ dị, ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eme ihe iche iche, o yiri ka onye ọ bụla n’ime unu ò si n’akụkụ dị iche na-arị ugwu ahụ. Ma, gịnị ga-eme ma unu rịrị ugwu ahụ na-aga? N’eziokwu, unu abụọ agaghị anọ ibe unu nso ná mmalite. N’agbanyeghị nke ahụ, ka unu na-agbalịkwu ịbịaru Chineke nso, na-arịgokwu n’ugwu ihe atụ ahụ, otú ahụ ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-anọkwu ibe unu nso. N’ezie, ịbịarukwu Chineke nso bụ isi ihe ga-eme ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nọrọ ibe unu nso. Ma, olee otú unu ga-esi eme ya?

Ọ bụrụ na i jiri ihe ọmụma Baịbụl mee ihe, ọ ga-eme ka alụmdi na nwunye gị sie ike

5. (a) Olee otu n’ime ụzọ mmadụ ga-esi bịarukwuo Jehova na di ma ọ bụ nwunye ya nso? (b) Olee otú Jehova si ele alụmdi na nwunye anya?

5 E nwere ike ikwu na otu n’ime ụzọ dị mkpa unu abụọ ga-esi na-arị ugwu ahụ bụ irube isi na ndụmọdụ Okwu Chineke nyere di na nwunye. (Abụ Ọma 25:4; Aịzaya 48:17, 18) Ya mere, chee echiche banyere otu ndụmọdụ doro anya Pọl onyeozi nyere. Ọ sịrị: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile.” (Ndị Hibru 13:4) Gịnị ka ọ pụtara? Okwu ahụ bụ́ “kwesịrị nsọpụrụ” pụtara ihe e ji kpọrọ ihe ma ọ bụ ihe bara oké uru. Otú ahụ ka Jehova si ele alụmdi na nwunye anya, ya bụ, o ji ya kpọrọ ihe dị ka ihe bara oké uru.

IHE GA-AKPALI GỊ BỤ EZIGBO ỊHỤNANYA I NWERE N’EBE JEHOVA NỌ

6. Gịnị ka ihe ndị ọzọ Pọl kwuru mgbe o nyere ndụmọdụ banyere alụmdi na nwunye na-egosi, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka i buru ya n’uche?

6 N’ezie, ebe gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị bụ ndị ohu Chineke, unu amatala na alụmdi na nwunye dị oké ọnụ ahịa, dịrịkwa nsọ. Ọ bụ Jehova malitere alụmdi na nwunye. (Matiu 19:4-6) Otú ọ dị, ọ bụrụ na i nwere nsogbu ugbu a n’alụmdi na nwunye gị, ihe ga-akpali gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị iji ịhụnanya na nkwanye ùgwù na-emeso ibe unu ihe abụghị naanị ịmata na alụmdi na nwunye bụ ihe kwesịrị nsọpụrụ. Gịnịzi ga-akpali gị ime otú ahụ? Buru n’obi nke ọma otú Pọl si kwuo okwu banyere ịsọpụrụ alụmdi na nwunye. Ọ sịghị, “alụmdi na nwunye bụ ihe kwesịrị nsọpụrụ”; kama, ọ sịrị, “ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ.” Ihe Pọl na-akọwa abụghị ihe ọ hụrụ ndị mmadụ na-eme; ọ bụ ndụmọdụ ka ọ na-enye. * Iburu nke ahụ n’uche nwere ike inyere gị aka ịhụ ihe ọzọ ga-akpali gị ime ka ị maliteghachi iji di gị ma ọ bụ nwunye gị kpọrọ ihe. N’ihi gịnị?

7. (a) Olee iwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ anyị na-erube isi na ha, n’ihi gịnị? (b) Olee ihe ọma na-esi n’irube isi apụta?

7 Chetụdị echiche banyere otú i si ele iwu ndị ọzọ e nyere n’Akwụkwọ Nsọ anya, dị ka iwu ime ndị na-eso ụzọ ma ọ bụ ndụmọdụ izukọta maka ofufe. (Matiu 28:19; Ndị Hibru 10:24, 25) N’ezie, irube isi n’iwu ndị ahụ nwere ike isi ike mgbe ụfọdụ. Ndị ị na-ezi ozi ọma nwere ike ghara inwe mmasị, ma ọ bụ, ọrụ ị na-arụ nwere ike ime ka ike gwụ gị, nke ga-eme ka ịga ọmụmụ ihe bụrụ ọgụ na mgba. N’agbanyeghị nke ahụ, ị ka na-ezisa ozi ọma Alaeze Chineke, na-agakwa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ọ dịghị onye ga-akwụsịli gị—ọbụnadị Setan! N’ihi gịnị? N’ihi na ezigbo ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ na-akpali gị irube isi n’iwu ya. (1 Jọn 5:3) Olee ihe ọma na-esi na ya apụta? Ịga ozi ọma na ịga ọmụmụ ihe na-eme ka obi ruo gị ala, na-emekwa ka i nwee ezigbo ọṅụ n’ihi na ị ma na ị na-eme uche Chineke. Otú ahụ obi na-adị gị na-eme ka i nwee ume. (Nehemaya 8:10) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị?

8, 9. (a) Gịnị ga-eme ka anyị rube isi na ndụmọdụ bụ́ ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee ihe abụọ anyị ga-atụle ugbu a?

8 Dị nnọọ ka ezigbo ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ na-eme ka ị na-erube isi n’iwu o nyere ka a na-ekwusa ozi ọma ma na-aga ọmụmụ ihe n’agbanyeghị ihe isi ike, otú ahụ ka ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ ga-eme ka ị na-erube isi na ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ “ka alụmdi na nwunye [gị] bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ,” ọbụna mgbe o yiri ka ò siri ike. (Ndị Hibru 13:4; Abụ Ọma 18:29; Ekliziastis 5:4) Ihe ọzọkwa bụ na, dị nnọọ ka otú i si na-agbalịsi ike ikwusa ozi ọma na ịga ọmụmụ ihe na-eme ka ị na-enweta ọtụtụ ngọzi Chineke, otú ahụ ka Jehova ga-ahụ otú i si na-agbalịsi ike ime ka alụmdi na nwunye gị bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ, ọ ga-agọzikwa gị.—1 Ndị Tesalonaịka 1:3; Ndị Hibru 6:10.

9 Ya mere, olee otú ị ga-esi eme ka alụmdi na nwunye gị bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ? I kwesịrị izere omume nwere ike imebi alụmdi na nwunye gị. I kwesịkwara ime ihe ndị ga-eme ka alụmdi na nwunye gị bụrụ a kwaa a kwụrụ.

ZERE OKWU NA OMUME NDỊ NA-EMEBI ALỤMDI NA NWUNYE

10, 11. (a) Olee omume ndị na-emebi alụmdi na nwunye? (b) Olee ajụjụ anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị kwesịrị ịtụle?

10 Otu nwaanyị bụ́ Onye Kraịst kwuru n’oge gara aga, sị: “Ekpekuru m Jehova ekpere ka o nye m ike m ga-eji die ya.” Die gịnị? O kwuru, sị: “Di m na-eji ọnụ apịa m ụtarị. Ọ bụ eziokwu na o nweghị ebe o merụrụ m ahụ́, ma okwu ọjọọ ọ na-agwa m mgbe niile na-agbawa m obi. Ọ na-asị m, ‘Ị bụ akpa nsogbu!’ ma ọ bụ ‘O nweghị uru ị bara!’” Nwaanyị a kwuru ihe dị oké mkpa e kwesịrị ichebara echiche, ya bụ, okwu mkparị di na nwunye na-agwa ibe ha.

11 Ọ dị nnọọ mwute ma ọ bụrụ na di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst na-agwa ibe ha okwu ọjọọ, na-akpata obi mgbawa nke na-anaghị adị mfe ngwọta! O doro anya na alụmdi na nwunye e ji okwu ọjọọ mara ekwesịghị nsọpụrụ. Olee otú alụmdi na nwunye gị dị? Otu n’ime ụzọ ị ga-esi chọpụta bụ iji obi umeala jụọ di gị ma ọ bụ nwunye gị, sị, “Olee otú okwu m na-agwa gị na-adị gị n’obi?” Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị echee na ọtụtụ mgbe okwu gị na-agbawa ya obi, i kwesịrị ịgbanwe àgwà gị iji mee ka alụmdi na nwunye gị ka mma.—Ndị Galeshia 5:15; Ndị Efesọs 4:31.

12. Olee otú ofufe mmadụ na-efe Chineke ga-esi bụrụ ihe efu n’anya Chineke?

12 Buru n’obi na otú i si eji ire gị agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu na-emetụta mmekọrịta gị na Jehova. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chere na ya na-efe Chineke n’ụzọ ziri ezi ma ọ dịghị achịkwa ire ya, kama na-aghọgbu obi ya, ụdị ofufe onye a na-efe bụ ihe efu.” (Jems 1:26) Okwu gị adịghị iche n’ofufe ị na-efe Chineke. Baịbụl akwadoghị echiche ahụ bụ́ na ihe ọ bụla nke mere n’ezinụlọ mmadụ adịghị ihe o mere ma ọ bụrụhaala na onye ahụ sịrị na ya na-efe Chineke. Biko, aghọgbula onwe gị. Ihe a abụghị okwu egwuregwu. (1 Pita 3:7) O nwere ike ịbụ na i nwere nkà ma na-anụ ọkụ n’obi, ma ọ bụrụ na ị kpachara anya na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu na-agbawa obi, ị na-emebi alụmdi na nwunye gị, Chineke nwekwara ike ile ofufe ị na-efe ya anya dị ka ihe efu.

13. Olee otú mmadụ nwere ike isi mee ka obi gbawaa di ya ma ọ bụ nwunye ya?

13 Di na nwunye kwesịkwara ilezi anya ka ha ghara isi n’ụzọ ndị ọzọ na-eme ihe ga na-agbawa ibe ha obi. Chegodị echiche banyere ihe atụ abụọ a: Otu nne naanị ya na-azụ ụmụ na-akpọkarị otu nwanna nwoke lụrụ nwaanyị nọ n’ọgbakọ ya n’ekwe ntị ka ọ tụọrọ ya aro, ha na-anọte aka ná mkparịta ụka ha; otu nwanna nwoke na-alụbeghị nwaanyị na otu nwanna nwaanyị lụrụ di na-arụ kwa izu ruo ogologo oge ma ha gaa ozi ọma. O nwere ike ịbụ na mmadụ abụọ a bụ́ ndị lụrụ di na nwunye n’ihe atụ abụọ a enweghị ihe ọjọọ ha bu n’obi; n’agbanyeghị nke ahụ, olee otú omume ha si emetụta di ha ma ọ bụ nwunye ha? Otu nwunye nke nọ n’ụdị ọnọdụ ahụ sịrị: “Ọ na-ewute m ịhụ na di m na nwanna nwaanyị ọzọ nọ n’ọgbakọ anyị na-akpachi anya. Ọ na-adị m ka abaghị m uru.”

14. (a) Olee ọrụ dịịrị di na nwunye e kwuru banyere ya na Jenesis 2:24? (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

14 O doro anya na ihe ahụ na-ewute ma nwaanyị ahụ ma ndị ọzọ nọ n’ụdị ọnọdụ ahụ n’alụmdi na nwunye ha. Di ha ma ọ bụ nwunye ha na-eleghara ndụmọdụ bụ́ isi Chineke nyere di na nwunye anya, nke bụ́: ‘Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya.’ (Jenesis 2:24) N’ezie, ndị lụrụ di na nwunye ka ga na-akwanyere nne ha na nna ha ùgwù; otú ọ dị, Chineke kwuru na onye mbụ ha ga-elebara anya bụ di ha ma ọ bụ nwunye ha. N’otu aka ahụ, Ndị Kraịst hụrụ ndị kwere ekwe ibe ha n’anya nke ukwuu; ma, onye mbụ ha kwesịrị ịhụ n’anya bụ di ha ma ọ bụ nwunye ha. N’ihi ya, mgbe Ndị Kraịst bụ́ di ma ọ bụ nwunye na ndị kwere ekwe ibe ha na-akpachi anya gabiga ókè, karịsịa ha na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha, ha na-akpata nsogbu n’alụmdi na nwunye ha. Ọ̀ ga-abụ ya kpatara nsogbu unu na-enwe n’alụmdi na nwunye unu? Jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ na-ewepụtara di m ma ọ bụ nwunye m oge m kwesịrị iwepụtara ya n’ezie, na-elebara ya anya ma na-ahụ ya n’anya otú m kwesịrị ịhụ ya?’

15. Dị ka e kwuru na Matiu 5:28, gịnị mere Ndị Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ha na-ekwesịghị ịkpachi anya gabiga ókè?

15 Ndị Kraịst bụ́ di ma ọ bụ nwunye, ndị ha na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-akpachi anya gabiga ókè, na-akpatara onwe ha nsogbu n’echeghị echiche. Ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ di ma ọ bụ nwunye enweela mmasị na-ezighị ezi n’ebe ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha ha na ha na-akpachi anya gabiga ókè nọ. (Matiu 5:28) N’ihi ya, mmasị dị otú ahụ ha nwere emeela ka ha mee omume na-emebikwu alụmdi na nwunye ha. Chee echiche ihe Pọl onyeozi kwuru banyere nke a.

‘KA IHE NDINA ALỤMDI NA NWUNYE GHARA ỊBỤ IHE E MERỤRỤ EMERỤ’

16. Olee iwu Pọl nyere banyere alụmdi na nwunye?

16 Ozugbo Pọl nyechara ndụmọdụ “ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ,” ọ dọkwara aka ná ntị, sị: “Ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ, n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.” (Ndị Hibru 13:4) Pọl kpọrọ mmekọahụ “ihe ndina alụmdi na nwunye.” Mmekọahụ dị otú ahụ abụghị “ihe e merụrụ emerụ,” nke o ji abụ omume rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na ọ bụ naanị di na nwunye nwere ya. Ya mere, Ndị Kraịst na-ege ntị n’okwu ahụ e si n’ike mmụọ nso kwuo, nke bụ́: ‘Ṅụrịa ọṅụ n’ihi nwunye ị lụrụ n’okorobịa.’—Ilu 5:18.

17. (a) Gịnị mere Ndị Kraịst ekwesịghị ịmụta otú ụwa si ele ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye anya? (b) Olee otú anyị ga-esi soro ihe nlereanya Job setịpụrụ?

17 Ndị ha na onye na-abụghị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-enwe mmekọahụ anaghị akwanyere iwu Chineke nyere banyere omume ọma ùgwù ma otu ma otu. N’eziokwu, ọtụtụ ndị taa na-ewere ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye dị ka ihe na-adịghị njọ. Ma, otú ndị ọzọ si ele ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye anya ekwesịghị ịgbanwe otú Ndị Kraịst si ele ya anya. Ha ghọtara na n’ikpeazụ, ọ bụ “Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe,” ọ bụghị mmadụ. (Ndị Hibru 10:31; 12:29) N’ihi ya, ezi Ndị Kraịst na-ele ịkwa iko anya otú Jehova si ele ya anya. (Ndị Rom 12:9) Cheta na nna ochie bụ́ Job sịrị: “Mụ na anya m agbawo ndụ.” (Job 31:1) N’ezie, iji zere ọbụna ihe ọ bụla nke nwere ike ime ka mmadụ kwaa iko, ezi Ndị Kraịst na-achịkwa anya ha, ha anaghịkwa ele nwoke ma ọ bụ nwaanyị na-abụghị di ha ma ọ bụ nwunye ha anya gabiga ókè.—Gụọ isiokwu dị na peeji 219-221.

18. (a) Olee otú ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye jọruru ná njọ n’anya Jehova? (b) Olee otú ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye na ikpere arụsị si yie?

18 Olee otú ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye jọruru ná njọ n’anya Jehova? Iwu Mozis na-enyere anyị aka ịghọta otú Jehova si ele ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye anya. N’Izrel, ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye na ikpere arụsị so n’ihe ọjọọ ndị ọ bụ mmadụ mee, e gbuo ya. (Levitikọs 20:2, 10) Olee otú ha abụọ si yie? Onye Izrel nke kpeere arụsị emebiela ọgbụgba ndụ ya na Jehova. N’otu aka ahụ, onye Izrel nke lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma kwaa iko emebiela ọgbụgba ndụ ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya gbara. Mmadụ abụọ ahụ ghọrọ aghụghọ. (Ọpụpụ 19:5, 6; Diuterọnọmi 5:9; Malakaị 2:14) Ya mere, ha abụọ mere ihe jọgburu onwe ya n’anya Jehova, bụ́ Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi.—Abụ Ọma 33:4.

19. Gịnị nwere ike ime ka di ma ọ bụ nwunye kpebisikwuo ike na ya agaghị akwa iko, n’ihi gịnịkwa?

19 N’ezie, Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mozis. Ma, ọ bụrụ na Ndị Kraịst echeta na ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye bụ ihe jọgburu onwe ya n’Izrel oge ochie, ọ ga-eme ka ha kpebisikwuo ike na ha agaghị eme ya. N’ihi gịnị? Chee echiche banyere ihe atụ a: Ị̀ ga-anọkata banye n’ụlọ chọọchị, gbuo ikpere n’ala n’ihu ihe a kpụrụ akpụ ma kpee ekpere? Ị ga-asị, ‘Mbanụ!’ Ma, ị̀ ga-achọ ime ya ma ọ bụrụ na e nye gị ego buru ibu? Ị ga-asịkwa, ‘Tụfịakwa!’ N’ezie, ọ na-asọ ezi Onye Kraịst oyi ichetụdị echiche imejọ Jehova site n’ikpere arụsị. N’otu aka ahụ, o kwesịrị ịsọ Ndị Kraịst oyi ichetụdị echiche imejọ Chineke ha bụ́ Jehova, nakwa di ha ma ọ bụ nwunye ha, site n’ịkwa iko—n’agbanyeghị ihe e nwere ike iji nwaa ha ọnwụnwa. (Abụ Ọma 51:1, 4; Ndị Kọlọsi 3:5) Anyị ekwesịghị ime ihe ga-eme ka Setan ṅụrịa ọṅụ ma anyị emechuo Jehova ihu nke ukwuu, merụọkwa alụmdi na nwunye dị nsọ.

OTÚ Ị GA-ESI MEE KA ALỤMDI NA NWUNYE GỊ SIKWUO IKE

20. Olee ihe na-eme n’ụfọdụ alụmdi na nwunye? Nye ihe atụ.

20 E wezụga izere omume na-emebi alụmdi na nwunye, olee ihe ndị ị ga-eme iji na-akwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù? Iji zaa ajụjụ ahụ, were ya na alụmdi na nwunye bụ ụlọ. Werekwa ya na okwu ọma, omume ọma, na ihe ndị na-egosi na mmadụ na-akwanyere di ya ma ọ bụ nwunye ya ùgwù bụ ihe ndị e ji achọ ụlọ mma. Ọ bụrụ na unu na-akpachi anya, alụmdi na nwunye unu yiri ụlọ e ji ihe dị iche iche chọọ mma, nke mere ka ọ maa mma ma na-eme ka ahụ́ ruo mmadụ ala. Ọ bụrụ na ịhụnanya unu ajụwala oyi, ihe ndị ahụ e ji chọọ ya mma ga-eji nwayọọ nwayọọ funyụọ anya ma mee ka alụmdi na nwunye unu ghara ịma mma, dị ka ụlọ a na-achọghị mma. Ebe ọ bụ na ị chọrọ irube isi n’iwu Chineke nke bụ́ “ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ,” ọ ga-emetụ gị n’obi imezi alụmdi na nwunye gị. A si ka e kwuwe, e kwesịrị imezi ihe dị oké ọnụ ahịa nakwa ihe kwesịrị nsọpụrụ. Olee otú ị ga-esi eme ya? Okwu Chineke sịrị: “A ga-eji amamihe wulite ezinụlọ, a ga-ejikwa nghọta mee ka o guzosie ike. A ga-ejikwa ihe ọmụma mee ka ihe dị oké ọnụ ahịa na ihe ọma niile bara uru jupụta n’ime ime ụlọ.” (Ilu 24:3, 4) Chee echiche otú ihe a e kwuru si gbasa alụmdi na nwunye gị.

21. Olee otú anyị ga-esi jiri nwayọọ nwayọọ mee ka alụmdi na nwunye anyị sie ike? (Gụọ  igbe dị na peeji nke 131.)

21 Ụfọdụ n’ime “ihe dị oké ọnụ ahịa” na-adị n’ezinụlọ nwere obi ụtọ bụ àgwà ndị dị ka ezi ịhụnanya, ịtụ egwu Chineke, na okwukwe siri ike. (Ilu 15:16, 17; 1 Pita 1:7) Ihe ndị a na-eme ka alụmdi na nwunye sie ike. Ma, ị̀ ghọtara ihe e ji mee ka ihe dị oké ọnụ ahịa jupụta n’ụlọ ahụ e kwuru banyere ya n’Ilu 24:3, 4? Ọ bụ “ihe ọmụma.” N’ezie, ọ bụrụ na e jiri ihe ọmụma dị na Baịbụl mee ihe, ọ ga-agbanwe otú ndị mmadụ si eche echiche ma mee ka ha hụ ibe ha n’anya. (Ndị Rom 12:2; Ndị Filipaị 1:9) N’ihi ya, mgbe ọ bụla gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nọkọrọ ọnụ ma jiri nwayọọ gụọ otu ebe na Baịbụl, dị ka mgbe unu na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ma ọ bụ isiokwu si na Baịbụl e dere n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Teta! banyere alụmdi na nwunye, ọ dị nnọọ ka ùnu na-atụle ihe mara mma e nwere ike iji chọọ ụlọ unu mma. Ọ bụrụ na ịhụnanya ị hụrụ Jehova emee ka i rube isi na ndụmọdụ ahụ unu ka tụlechara n’alụmdi na nwunye unu, ọ dị nnọọ ka ùnu na-ewebata ihe e ji achọ ụlọ mma “n’ime ime ụlọ” unu. Ọ ga-eme ka alụmdi na nwunye unu maa mma otú ọ maburu, na-atọkwa ụtọ otú ọ na-atọbu.

22. Olee obi ụtọ anyị ga-enwe ma ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ime ihe anyị kwesịrị ime iji mee ka alụmdi na nwunye anyị sie ike?

22 N’ezie, iji nwayọọ nwayọọ weghachi ihe ndị ga-eme ka alụmdi na nwunye gị maa mma nwere ike iwe oge buru ibu na ezigbo mgbalị. Ma, ọ bụrụ na ị na-agbalịsi ike ime ihe i kwesịrị ime, ị ga-enwe ezigbo obi ụtọ ịmara na ị na-erube isi n’iwu Baịbụl bụ́: “N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Ndị Rom 12:10; Abụ Ọma 147:11) Nke ka nke bụ na otú i si na-agbalịsi ike ime ka alụmdi na nwunye gị bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ ga-eme ka ị nọrọ n’ịhụnanya Chineke.

^ par. 6 Ihe ndị ọzọ Pọl kwuru gosiri na ndụmọdụ o nyere banyere alụmdi na nwunye bụ otu n’ime agbamume ndị o nyere.—Ndị Hibru 13:1-5.