Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE IRI NA ISE

Na-ahụ Ihe Ọma n’Ihi Ịrụsi Ọrụ Ike Gị

Na-ahụ Ihe Ọma n’Ihi Ịrụsi Ọrụ Ike Gị

‘Ka onye ọ bụla na-ahụ ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile.’—EKLIZIASTIS 3:13.

1-3. (a) Olee otú ọtụtụ ndị si ele ọrụ ha anya? (b) Olee otú Baịbụl si ele ọrụ anya, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

ỌTỤTỤ ndị n’ụwa taa na-ewere ya na ọrụ bụ ịta ahụhụ. Ha cheta ogologo oge ha na-anọ n’ọrụ na-anaghị atọ ha ụtọ, ịga ọrụ kwa ụbọchị ana-agwụ ha ike. Gịnị ga-enyere ndị dị otú ahụ aka inwe mmasị n’ọrụ ha, nweekwa obi ụtọ na ọṅụ na ya?

2 Baịbụl kwuru okwu ọma banyere ịrụsi ọrụ ike. O kwuru na ọrụ na ihe a na-arụpụta na ya bụ onyinye Chineke. Sọlọmọn dere, sị: “Ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-ahụkwa ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile. Ọ bụ onyinye Chineke.” (Ekliziastis 3:13) Jehova hụrụ anyị n’anya ma buru ọdịmma anyị n’obi mgbe niile. Ọ chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ n’ọrụ anyị, chọọkwa ka anyị na-ekpori ndụ n’ihe anyị rụpụtara. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya ya, anyị kwesịrị ịna-ele ihe anya otú o si ele ya anya, na-elekwa ọrụ anya otú o si ele ya anya.—Ekliziastis 2:24; 5:18.

3 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ajụjụ anọ, ya bụ, Olee otú anyị ga-esi na-ahụ ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike anyị? Olee ụdị ọrụ ezi Ndị Kraịst na-ekwesịghị ịrụ? Olee otú anyị ga-esi hazie ọrụ ego anyị ka ọ ghara imegide ofufe anyị na-efe Chineke? Olee ọrụ kacha mkpa anyị kwesịrị ịrụ? Ma, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe atụ abụọ nke ndị kacha arụ ọrụ n’eluigwe na n’ụwa, ya bụ, Jehova Chineke na Jizọs Kraịst.

ONYE ỌRỤ KACHA ELU NA ONYE ỌKÀ ỌRỤ

4, 5. Olee otú Baịbụl si gosi na Jehova bụ onye ọrụ na-arụpụta ihe?

4 Jehova bụ Onye Ọrụ kacha elu. Jenesis 1:1 kwuru, sị: “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.” Mgbe Chineke kechara ihe niile n’ụwa, o kwuru na ihe ọ rụrụ “dị nnọọ mma.” (Jenesis 1:31) Nke ahụ pụtara na ihe niile ọ rụrụ n’ụwa tọrọ ya ụtọ. O doro anya na Jehova, bụ́ ‘Chineke onye obi ụtọ,’ nwere ezigbo ọṅụ n’ihi na ọ bụ onye ọrụ na-arụpụta ihe.—1 Timoti 1:11.

5 Chineke anyị nke na-arụsi ọrụ ike na-arụ ọrụ mgbe niile. Mgbe ogologo oge gachara e kechara ụwa na ihe niile dị n’ime ya, Jizọs sịrị: “Nna m anọwo na-arụ ọrụ ruo ugbu a.” (Jọn 5:17) Gịnị ka Nna ya nọ na-arụ kemgbe ahụ? O bi n’eluigwe na-eduzi ụmụ mmadụ ma na-elekọta ha. O keela ‘ihe ọhụrụ,’ ya bụ, Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, bụ́ ndị ha na Jizọs ga-emecha chịa n’eluigwe. (2 Ndị Kọrịnt 5:17) Ọ nọ kemgbe na-arụsi ọrụ ike iji hụ na o mezuru ihe o zubere maka ụmụ mmadụ, ya bụ na ndị hụrụ ya n’anya ga-enweta ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ. (Ndị Rom 6:23) O doro anya na Jehova na-enwe obi ụtọ n’ihi ihe a rụrụla n’ọrụ ahụ. Ọtụtụ nde mmadụ anabatala ozi Alaeze ahụ. Chineke na-adọta ha, ha agbanwee ndụ ha ka ha nọrọ n’ịhụnanya ya.—Jọn 6:44.

6, 7. Olee otú Jizọs si bụrụ onye a ma ama n’ịrụsi ọrụ ike?

6 A ma Jizọs ama dị ka onye na-arụsi ọrụ ike. Tupu ya abịa n’ụwa bụrụ mmadụ, ọ bụ “onye ọkà ọrụ” nke Chineke n’ike ihe niile “n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Ilu 8:22-31; Ndị Kọlọsi 1:15-17) Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ọ nọ na-arụsi ọrụ ike. Mgbe ọ bụ nwata, ọ mụrụ aka ọrụ, nke mere e ji mara ya dị ka “ọkwá nkà.” * (Mak 6:3) Ọrụ a bụ ọrụ ike nke chọrọ nkà dị iche iche—nke ka nke, ebe ọ bụ na e nweghị ígwè e ji awa osisi, ebe a na-ere osisi, na ngwá ọrụ na-eji eletrik arụ ọrụ. Jiri anya nke uche gị hụ ebe Jizọs na-aga inweta osisi ọ ga-eji arụ ọrụ—ma eleghị anya, ebe ọ na-egbutusị osisi ma kwara ha na-aga ebe ọ bụla ọ na-arụ ọrụ. Jirikwa anya nke uche gị hụ ebe ọ na-arụ ụlọ—ebe ọ na-akwa osisi ma na-akụnye ha n’elu ụlọ, ebe ọ na-arụ ibo ụzọ, nakwa ebe ọ na-arụ oche na ihe ndị ọzọ. O doro anya na Jizọs nwetara obi ụtọ a na-enweta n’iji nkà arụsi ọrụ ike.

7 Jizọs bụ ezi onye ọrụ rụsiri ọrụ ike n’ozi ya. Ọ rụsiri ọrụ a dị mkpa ike ruo afọ atọ na ọkara. Ebe ọ bụ na ọ chọrọ izi ọtụtụ mmadụ ozi ọma, ọ rụsiri ọrụ ike, na-ebili n’isi ụtụtụ ma rụrụ ọrụ ya ruo n’abalị. (Luk 21:37, 38; Jọn 3:2) Ọ gara “site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 8:1) Jizọs ji ụkwụ gaa ọtụtụ narị kilomita n’okporo ụzọ dị uzuzu uzuzu, na-ezi ndị mmadụ ozi ọma.

8, 9. Olee otú Jizọs si hụ ihe ọma n’ịrụsi ọrụ ike ya?

8 Jizọs ọ̀ hụrụ ihe ọma n’ịrụsi ọrụ ike n’ozi ya? Ee! Ọ kụrụ mkpụrụ nke eziokwu Alaeze, mee ka e nwee ubi chara acha maka iwe ihe ubi. Ịrụ ọrụ Chineke mere ka Jizọs nweta ume na afọ ojuju nke na ọ dị njikere ịhapụ nri iji hụ na ọ rụchara ya. (Jọn 4:31-38) Cheedị echiche banyere obi ụtọ o nwere mgbe o jechara ozi ya n’ụwa, o nweziri ike ịgwa Nna ya n’eziokwu, sị: “Emewo m ka ị dị ebube n’ụwa, ebe ọ bụ na arụchaala m ọrụ i nyere m ka m rụọ.”—Jọn 17:4.

9 N’ezie, Jehova na Jizọs bụ ihe atụ kacha ná ndị hụrụ ihe ọma n’ịrụsi ọrụ ha ike. Ịhụnanya anyị hụrụ Jehova na-akpali anyị ‘ịghọ ndị na-eṅomi Chineke.’ (Ndị Efesọs 5:1) Ịhụnanya anyị hụrụ Jizọs na-eme ka anyị “sochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) N’ihi ya, ka anyị lebazie anya n’otú anyị ga-esi na-ahụ ihe ọma n’ịrụsi ọrụ ike anyị.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-AHỤ IHE ỌMA N’ỊRỤSI ỌRỤ IKE ANYỊ

Ime ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ịhụ ihe ọma n’ọrụ ị na-arụsi ike

10, 11. Gịnị ga-enyere anyị aka ịmụta ile ọrụ anyị anya otú kwesịrị ekwesị?

10 Ezi Ndị Kraịst nwere ike ịrụ ọrụ ego. Anyị chọrọ inweta obi ụtọ na ọṅụ n’ọrụ anyị. Ma nke ahụ nwere ike isiri anyị nnọọ ike ma ọ bụrụ na ọrụ ego anyị na-arụ anaghị atọ anyị ụtọ. Olee otú ọ ga-esi kwe anyị omume ịhụ ihe ọma n’ọrụ anyị n’ọnọdụ dị otú ahụ?

11 Site n’ịmụta ile ọrụ anya otú kwesịrị ekwesị. Mgbe ụfọdụ, anyị enweghị ike ịgbanwe ọnọdụ anyị, ma anyị nwere ike ịgbanwe àgwà anyị. Ịtụgharị uche n’otú Chineke si ele ọrụ anya ga-enyere anyị aka ịmụta ile ọrụ anya otú kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị bụ onyeisi ezinụlọ, cheta na n’agbanyeghị otú ọrụ gị si yie ihe a na-eleda anya, ọ na-enyere gị aka igbo mkpa ezinụlọ gị. N’ihi ya, igboro ndị ị hụrụ n’anya mkpa ha abụghị obere ihe n’anya Chineke. Okwu ya kwuru na onye na-anaghị egboro ezinụlọ ya mkpa ha ‘jọkarịrị onye na-ekweghị ekwe ná njọ.’ (1 Timoti 5:8) Ọ bụrụ na ị ghọta na ọrụ gị bụ ụzọ i si arụ ọrụ dịịrị gị, ya bụ, na ọ na-eme ka ị na-arụ ọrụ Chineke nyere gị, ọ ga-enyere gị aka inweta obi ụtọ na ọṅụ n’ọrụ gị, nke o nwere ike ịbụ na ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ enweghị.

12. Olee uru ndị anyị ga-erite n’ịrụsi ọrụ ike na n’ime ihe n’eziokwu n’ọrụ anyị?

12 Site n’ịrụsi ọrụ ike na ime ihe n’eziokwu. Ịrụsi ọrụ ike na ịmụta otú anyị ga-esi na-arụ ọrụ anyị nke ọma ga-ewetara anyị ọtụtụ ngọzi. Ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ anaghị eji ndị ọrụ na-arụsi ọrụ ike ma nwee nkà egwuri egwu. (Ilu 12:24; 22:29) Ebe anyị bụ ezi Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịna-eme ihe n’eziokwu n’ebe anyị na-arụ ọrụ, ya bụ na anyị agaghị ezu ego onye anyị na-arụrụ ọrụ, ngwá ọrụ ya ma ọ bụ oge ya. (Ndị Efesọs 4:28) Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Iri na Anọ, ime ihe n’eziokwu na-aba uru. E nwere ike ịtụkwasị onye ọrụ a ma na ọ na-eme ihe n’eziokwu obi. Ma onye anyị na-arụrụ ọrụ ọ̀ hụrụ na anyị na-arụsi ọrụ ike ma ọ bụ na ọ hụghị, anyị ga-enwe obi ụtọ a na-enweta n’inwe ‘akọnuche ziri ezi.’ Obi ga-atọkwa anyị ụtọ n’ihi na anyị ma na anyị na-eme ihe dị Chineke anyị bụ́ onye anyị hụrụ n’anya mma.—Ndị Hibru 13:18; Ndị Kọlọsi 3:22-24.

13. Olee ihe àgwà ọma anyị na-akpa n’ebe anyị na-arụ ọrụ nwere ike ịrụpụta?

13 Site n’ịghọta na omume anyị nwere ike inye Chineke otuto. Ọ bụrụ na anyị na-akpa ezi àgwà e ji mara Ndị Kraịst n’ebe anyị na-arụ ọrụ, ndị ọzọ ga-ahụrịrị ya. Gịnị ga-esi n’ime ya pụta? Anyị nwere ike isi otú ahụ “chọọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe niile.” (Taịtọs 2:9, 10) N’ezie, omume ọma anyị nwere ike ime ka ndị ọzọ hụ na otú anyị si efe Chineke dị mma, mee ka ha nwekwuo mmasị na ya. Chegodị echiche otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na onye gị na ya na-arụkọ ọrụ natara eziokwu ahụ n’ihi àgwà ọma ị na-akpa n’ebe ị na-arụ ọrụ! Nke ka nke, cheedị echiche: Ọ̀ dị ihe ga-aka aba uru karịa ịma na àgwà ọma anyị na-ewetara Jehova otuto, na-emekwa ka obi ya ṅụrịa ọṅụ?—Ilu 27:11; 1 Pita 2:12.

IJI NGHỌTA NA-AHỌRỌ ỌRỤ ANYỊ GA-ARỤ

14-16. Mgbe anyị na-ekpebi ihe gbasara ọrụ anyị ga-arụ, olee ajụjụ ndị dị mkpa anyị kwesịrị ichebara echiche?

14 Baịbụl ekwughị ihe niile banyere ọrụ dị mma na ọrụ na-adịghị mma. Nke a apụtaghị na anyị ga na-arụ ụdị ọrụ ọ bụla n’agbanyeghị ihe a na-arụ na ya. Akwụkwọ Nsọ ga-enyere anyị aka ịhọrọ ọrụ bara uru na nke ziri ezi ga-adị Chineke mma, nyekwara anyị aka izere ọrụ na-agaghị adị ya mma. (Ilu 2:6) Mgbe anyị chọrọ ikpebi ihe gbasara ọrụ anyị ga-arụ, e nwere ajụjụ abụọ dị mkpa anyị ga-elebara anya.

15 Nke mbụ, ọrụ a ọ̀ ga-eme ka m mee ihe Baịbụl kwuru na ọ dịghị mma? O doro anya na Okwu Chineke kwuru na izu ohi, ịgha ụgha, na ikpere arụsị adịghị mma. (Ọpụpụ 20:4; Ọrụ 15:29; Ndị Efesọs 4:28; Mkpughe 21:8) Anyị ga-ajụ ọrụ ọ bụla ga-eme ka anyị mee ihe ndị dị otú ahụ. N’ihi ịhụnanya anyị hụrụ Jehova, anyị agaghị arụ ọrụ ga-eme ka anyị mebie iwu Chineke.—1 Jọn 5:3.

16 Nke abụọ, ịrụ ọrụ a ọ̀ ga-eme ka anyị mee omume ọjọọ ma ọ bụ mee ka anyị gbaa ndị ọzọ ume ịmụta ime ya? Dị ka ihe atụ, ịrụ ọrụ dị ka onye na-anabata ndị ọbịa n’ụlọ ọrụ abụghị ihe ọjọọ. Ọ́ bụrụkwanụ na e nyere Onye Kraịst ụdị ọrụ ahụ n’ụlọ ọgwụ na-ete ime? N’ezie, ọrụ ya agaghị abụ inyere dọkịta aka ite ndị mmadụ ime. N’agbanyeghị nke ahụ, ọrụ ọ na-arụ ebe ahụ kwa ụbọchị ọ́ naghị akwado ime ahụ ụlọ ọgwụ ahụ na-ete ndị mmadụ—nke bụkwanụ ihe megidere Okwu Chineke? (Ọpụpụ 21:22-24) Ebe anyị hụrụ Jehova n’anya, anyị achọghị ime ihe ga-ejikọ anyị na omume megidere Akwụkwọ Nsọ.

17. (a) Olee ihe ndị anyị ga-echebara echiche mgbe anyị na-ekpebi ihe gbasara ọrụ? (Gụọ  igbe dị na peeji nke 177.) (b) Olee otú akọnuche anyị ga-esi enyere anyị aka ime mkpebi ndị ga-adị Chineke mma?

17 Ọ bụrụ na anyị emeda obi chee echiche banyere azịza nke ajụjụ abụọ ndị ahụ dị mkpa a jụrụ na paragraf nke 15 na nke 16, anyị ga-enwe ike ịza ọtụtụ ajụjụ a na-ajụ banyere ọrụ. E nwekwara ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị ichebara echiche mgbe anyị na-ekpebi ọrụ anyị ga-arụ. * Anyị agaghị atụ anya na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-agwa anyị ihe anyị ga-eme n’ọnọdụ niile. Ebe a ka nghọta dị anyị mkpa. Dị ka anyị mụrụ n’Isi nke Abụọ, anyị kwesịrị ịzụ akọnuche anyị site n’ịmụta otú anyị ga-esi na-eme ihe Okwu Chineke kwuru ná ndụ anyị na-ebi kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na anyị esi otú ahụ zụọ “ikike nghọta” anyị “site n’iji ya eme ihe,” akọnuche anyị ga-enyere anyị aka ime mkpebi ga-adị Chineke mma, meekwa ka anyị nọrọ n’ịhụnanya ya.—Ndị Hibru 5:14.

INWE ECHICHE ZIRI EZI BANYERE ỌRỤ

18. Gịnị mere na ọ dịghị mfe ime ka ọrụ anyị ghara imegide ozi anyị na-ejere Chineke?

18 Ime ka ọrụ anyị ghara imegide ozi anyị na-ejere Chineke adịghị mfe ‘n’oge ikpeazụ a,’ bụ́ mgbe e nwere “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” (2 Timoti 3:1) Ịchọta ọrụ na ịnọgide na ya nwere ike isi ezigbo ike. Ebe anyị bụ ezi Ndị Kraịst, anyị ma na ịrụsi ọrụ ike ga-eme ka anyị nwee ike igboro ezinụlọ anyị mkpa ha. Ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, nsogbu a na-enwe n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ àgwà ịhụ ihe onwunwe n’anya e ji mara ụwa, nke mmadụ nwere ike ịmụta, ga-egbochi anyị ijere Chineke ozi. (1 Timoti 6:9, 10) Ka anyị leba anya n’otú anyị ga-esi mee ka ọrụ anyị ghara imegide ozi anyị na-ejere Chineke, ya bụ, ‘ịchọpụta ihe ndị ka mkpa.’—Ndị Filipaị 1:10.

19. Gịnị mere Jehova ji kwesị ka anyị tụkwasị ya obi kpamkpam, gịnịkwa ka ntụkwasị obi dị otú ahụ ga-enyere anyị aka izere?

19 Tụkwasị Jehova obi kpamkpam. (Ilu 3:5, 6) Ó kwesịghị ka anyị tụkwasị ya obi otú ahụ? A sị ka e kwuwe, ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi. (1 Pita 5:7) Ọ ma mkpa anyị karịa anyị, aka ya adịghịkwa mkpụmkpụ. (Abụ Ọma 37:25) Ya mere, anyị kwesịrị ige ntị mgbe Okwu ya na-echetara anyị, sị: ‘Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na Chineke ekwuwo, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”’ (Ndị Hibru 13:5) Ọtụtụ ndị ozi oge niile nwere ike ịgba akaebe na Chineke na-egboro ndị ohu ya mkpa ha. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị, anyị agaghị echegbubiga onwe anyị ókè banyere igbo mkpa ezinụlọ anyị. (Matiu 6:25-32) Anyị agaghị ekwe ka ọrụ anyị na-arụ mee ka anyị leghara ihe metụtara ofufe Chineke anya, dị ka ịga ozi ọma na ịga ọmụmụ ihe.—Matiu 24:14; Ndị Hibru 10:24, 25.

20. Gịnị ka ilegide anya otu ebe pụtara, oleekwa otú ị ga-esi mee otú ahụ?

20 Legide anya otu ebe. (Matiu 6:22, 23) Ilegide anya otu ebe na-eme ka anyị ghara ibi ndụ gbalụ gbalụ. Onye Kraịst ilegide anya otu ebe pụtara na ọ ga-elegide otu ihe anya, ya bụ, ime uche Chineke. Ọ bụrụ na anyị lekwasịrị anya n’ebe kwesịrị ekwesị, anyị agaghị ekwe ka inweta ọrụ a na-akwụ ego buru ibu na ya nakwa ibi ndụ okomoko bụrụ mkpa anyị. Anyị agaghịkwa eji oge anyị niile na-achụ ihe ọgbara ọhụrụ na ihe kacha mma, bụ́ ihe ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-agbalị ime ka anyị kweta na anyị agaghị enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị enwetaghị ha. Olee otú ị ga-esi elegide anya otu ebe? Zere ikoro ụgwọ na-enweghị isi na ọdụ. Emela ka ndụ gị nọrọ ná nsogbu n’ihi ihe onwunwe ndị ga-ewe gị oké oge ilekọta. Gee ntị na ndụmọdụ Baịbụl bụ́ ka “ihe oriri na uwe” ju gị afọ. (1 Timoti 6:8) Gbalịsie ike ka ị ghara ibi ndụ gbalụ gbalụ.

21. Gịnị mere anyị ji kwesị ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ anyị?

21 Bute ihe ime mmụọ ụzọ ma nọgide na ya. Ebe ọ bụ na anyị enweghị ike ime ihe niile anyị chọrọ ime ná ndụ, anyị kwesịrị ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ. Ma ọ́ bụghị ya, ihe ndị na-adịghị mkpa nwere ike iri oge bara uru anyị nwere, mee ka anyị leghara ihe ndị ka mkpa anya. Gịnị ka anyị kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ anyị? Ihe bụ́ mkpa ọtụtụ ndị n’ụwa bụ ịgụ oké akwụkwọ iji nweta ọrụ na-enye ezigbo ego n’ụwa ochie a. Ma, Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha ‘buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ.’ (Matiu 6:33) N’ezie, ebe anyị bụ ezi Ndị Kraịst, anyị na-ebute Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ anyị. Otú anyị si ebi ndụ, ya bụ, ihe ndị anyị na-ahọrọ, ihe mgbaru ọsọ anyị, na ihe ndị anyị na-eme, kwesịrị igosi na ihe metụtara Alaeze ahụ na ime uche Chineke dị anyị mkpa karịa ichegbu onwe anyị maka ihe onwunwe na ihe ụwa.

ỊRỤSI ỌRỤ IKE N’OZI ỌMA

Anyị ga-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma ọ bụrụ na anyị ewere ikwusa ozi ọma dị ka ihe kacha mkpa ná ndụ anyị

22, 23. (a) Olee ọrụ bụ́ isi ezi Ndị Kraịst na-arụ, oleekwa otú anyị ga-esi egosi na ọrụ a dị anyị mkpa? (Gụọ  igbe dị na peeji nke 180.) (b) Gịnị ka i kpebiri ime n’ihe gbasara ọrụ ego?

22 Ebe anyị ma na anyị bi ná ngwụcha ngwụcha mgbe ikpeazụ, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ọrụ bụ́ isi e ji mara ezi Ndị Kraịst, ya bụ, ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Dị ka Jizọs bụ́ Onye Nlereanya anyị, anyị chọrọ ịrụsi ọrụ a e ji azọpụta ndụ ike. Olee otú anyị ga-esi egosi na ọrụ a dị anyị mkpa? Ọtụtụ ndị Chineke bụ ndị nkwusa ọgbakọ, ndị ji obi ha dum na-ekwusa ozi ọma ahụ. Ụfọdụ ahaziela ihe ha na-arụ ka ha nwee ike ịbụ ndị ọsụ ụzọ ma ọ bụ ndị ozi ala ọzọ. Ọtụtụ ndị nne na nna, bụ́ ndị ma uru inwe ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ bara, agbaala ụmụ ha ume ịbanye n’ozi oge niile. Ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi hà na-ahụ ihe ọma n’ọrụ ha na-arụsi ike n’ozi ọma? À na-ajụkwa nke ahụ ajụ? Iji obi dum na-ejere Jehova ozi bụ ụzọ kacha mma ị ga-esi na-enweta ọṅụ, obi ụtọ na ọtụtụ ngọzi ná ndụ.—Ilu 10:22.

23 Ọtụtụ n’ime anyị na-eji ọtụtụ awa arụ ọrụ ego anyị ji egboro ezinụlọ anyị mkpa ha. Cheta na Jehova chọrọ ka anyị na-ahụ ihe ọma n’ọrụ anyị na-arụsi ike. Ọ bụrụ na anyị emee ka echiche anyị na omume anyị kwekọọ n’echiche Chineke nakwa n’ụkpụrụ ya, anyị ga-enweta obi ụtọ n’ọrụ anyị. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị ekwe ka ọrụ ego anyị dọpụ uche anyị n’ọrụ bụ́ isi anyị na-arụ, ya bụ, ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na anyị ebute ọrụ a ụzọ ná ndụ anyị, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya, anyị ga-esikwa otú ahụ nọrọ n’ịhụnanya ya.

^ par. 6 Otu akwụkwọ kwuru na okwu Grik e si sụgharịta “ọkwá nkà” bụ “okwu e ji akọwa onye ọ bụla na-arụ ọrụ osisi, ma ọ̀ na-akụ osisi n’elu ụlọ, ma ọ̀ na-arụ oche, ma ọ bụkwanụ ihe ọ bụla ọzọ e ji osisi arụ.”

^ par. 17 Ị chọọ ịhụ ebe a tụlekwuru ihe ndị a ga-echebara echiche n’ihe gbasara ọrụ, gụọ Ụlọ Nche, April 15, 1999, peeji nke 28-30, na nke January 15, 1983, peeji nke 20.