ISI NKE MBỤ
“Nke a Bụ Ihe Ịhụ Chineke n’Anya Pụtara”
“Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.”—1 JỌN 5:3.
1, 2. Gịnị na-akpali gị ịhụ Jehova Chineke n’anya?
Ị̀ HỤRỤ Chineke n’anya? Ọ bụrụ na ị rarala ndụ gị nye Jehova Chineke, gị na ya ana-enwekwa mmekọrịta, n’ezie ị ga-eji obi gị dum zaa ee—ihe ị zara zikwara ezi! Anyị kwesịrị ịhụ Jehova n’anya. Anyị hụrụ Chineke n’anya n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Baịbụl kwuru, sị: ‘Ma anyị onwe anyị nwere ịhụnanya, n’ihi na Jehova bu ụzọ hụ anyị n’anya.’—1 Jọn 4:19.
2 Jehova bu ụzọ gosi anyị ịhụnanya ya. O nyere anyị ebe obibi mara mma nke bụ́ ụwa. Ọ na-egbo mkpa anụ ahụ́ anyị na mkpa ihe onwunwe anyị. (Matiu 5:43-48) Karịsịa, ọ na-egbo mkpa ime mmụọ anyị. O nyere anyị Okwu ya bụ́ Baịbụl. Ọ gwakwara anyị ka anyị na-ekpeku ya ekpere, kwekwa anyị nkwa na ya ga na-aza ekpere anyị, na-enyekwa anyị mmụọ nsọ ya nke ga na-enyere anyị aka. (Abụ Ọma 65:2; Luk 11:13) Nke ka nke, o zitere Ọkpara ya ọ kacha hụ n’anya ka ọ bụrụ Onye Mgbapụta ga-agbapụta anyị ná mmehie na ọnwụ. Jehova egosiwo anyị ịhụnanya dị ukwuu!—Jọn 3:16; Ndị Rom 5:8.
3. (a) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide n’ịhụnanya Chineke, gịnị ka anyị ga-eme? (b) Olee ajụjụ dị mkpa anyị kwesịrị ichebara echiche, oleekwa ebe anyị ga-ahụ azịza ya?
3 Jehova chọrọ ka anyị na-erite uru n’ịhụnanya ya ruo Jud 21) Okwu ahụ bụ́ “nọrọnụ” gosiri na anyị ga na-agbalịsi ike ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide n’ịhụnanya Chineke. Anyị kwesịrị igosi na anyị hụrụ Chineke n’anya n’ihi ịhụnanya ọ hụrụ anyị. Ya mere, ajụjụ dị mkpa anyị ga-echebara echiche bụ ‘Olee otú m nwere ike isi gosi na m hụrụ Chineke n’anya?’ Anyị ga-ahụ azịza ya n’ihe Jọn onyeozi kwuru site n’ike mmụọ nsọ. O kwuru, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.” (1 Jọn 5:3) Anyị kwesịrị ịtụle nke ọma ihe ihe a o kwuru pụtara, n’ihi na anyị chọrọ igosi Chineke na anyị hụrụ ya n’anya nke ukwuu.
mgbe ebighị ebi. Otú ọ dị, ọ bụ anyị ka ọ dịịrị ikpebi ma ànyị ga-eme otú ahụ ma ọ bụ na anyị agaghị eme. Okwu Chineke na-agba anyị ume, sị: “Nọrọnụ n’ịhụnanya Chineke . . . nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.” (“NKE A BỤ IHE ỊHỤ CHINEKE N’ANYA PỤTARA”
4, 5. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ịhụ Chineke n’anya” pụtara? (b) Kọwaa otú ịhụ Jehova n’anya si malite ịdị gị n’obi.
4 “Ịhụ Chineke n’anya”—gịnị ka Jọn onyeozi bu n’obi mgbe o dere okwu ndị ahụ? Ihe Jọn na-ekwu banyere ya abụghị ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ, kama, ọ na-ekwu banyere ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ. Ì nwere ike icheta mgbe ịhụ Jehova n’anya malitere ịdị gị n’obi?
5 Chetụgodị echiche banyere mgbe ị malitere ịmụ eziokwu banyere Jehova na nzube ya, gị amalite inwe okwukwe. Ị ghọtara mgbe ahụ na ọ bụ ezie na mgbe a mụrụ gị, ị bụ onye mmehie nke ya na Chineke na-adịghị ná mma, Jehova si n’aka Kraịst mepeere gị ụzọ ị ga-esi nweta izu okè ahụ Adam tụfuru, na ụzọ ị ga-esi nweta ndụ ebighị ebi. (Matiu 20:28; Ndị Rom 5:12, 18) Ị malitere ịghọta na ọ bụ àjà dị ukwuu ka Jehova chụrụ mgbe o zitere Ọkpara ya ọ kacha hụ n’anya ka ọ nwụọ n’ihi gị. O ruru gị n’obi. I wee malite inwe ịhụnanya n’ebe Chineke nọ, bụ́ onye hụrụ gị n’anya nke ukwuu otú ahụ.—1 Jọn 4:9, 10.
6. Olee otú e si egosi ezi ịhụnanya, gịnịkwa ka i mere n’ihi ịhụnanya ị hụrụ Chineke?
6 Otú ọ dị, naanị ihe ịhụnanya ahụ dị gị n’obi gosiri bụ na ị malitela inwe ezi ịhụnanya n’ebe Jehova nọ. Ịhụnanya anaghị adị mmadụ naanị n’obi; a naghịkwa ekwu ya naanị n’ọnụ. Inwe ezi ịhụnanya n’ebe Chineke nọ abụghị naanị ịsị, “Ahụrụ m Jehova n’anya.” Dị ka okwukwe, ihe e ji amata ezi ịhụnanya bụ ihe ọ kpaliri mmadụ ime. (Jems 2:26) E kwuo ya kpọmkwem, otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere ịhụnanya bụ imere onye anyị hụrụ n’anya ihe ga-adị ya mma. N’ihi ya, mgbe ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ gbanyere mgbọrọgwụ n’obi gị, o mere ka ị chọọ ibi ndụ nke ga-adị Nna gị nke eluigwe mma. Ị̀ bụ Onyeàmà e mere baptizim? Ọ bụrụ na ị bụ, ezigbo ịhụnanya ahụ na ntụkwasị obi i nwere n’ebe Chineke nọ mere ka i mee mkpebi kasị mkpa ị ga-eme ná ndụ gị. Ị raara onwe gị nye Jehova na ị ga-eme uche ya. I gosikwara ya site n’ịbụ onye e mere baptizim. (Ndị Rom 14:7, 8) Otu n’ime ụzọ anyị ga-esi emezu nkwa a dị mkpa anyị kwere Jehova bụ ihe ọzọ Jọn onyeozi kwuru.
“ANYỊ NA-EDEBE IHE O NYERE N’IWU”
7. Olee ụfọdụ n’ime ihe Chineke nyere n’iwu, gịnịkwa ka idebe ha pụtara?
7 Jọn kọwara ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara: “Anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu.” Olee ihe Chineke nyere n’iwu? Jehova nyere anyị iwu dị iche iche a kapịrị ọnụ site n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị anyị emela ihe ndị dị ka ịṅụbiga mmanya okè, ịkwa iko, ikpere arụsị, izu ohi, na ịgha ụgha. (1 Ndị Kọrịnt 5:11; 6:18; 10:14; Ndị Efesọs 4:28; Ndị Kọlọsi 3:9) Idebe ihe Chineke nyere n’iwu pụtara ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị doro anya o nyere na Baịbụl banyere omume ọma.
8, 9. Olee otú anyị pụrụ isi mata ihe dị Jehova mma ọbụna n’ebe iwu Baịbụl na-ekwughị ihe ọ bụla kpọmkwem? Nye ihe atụ.
8 Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma, ihe anyị ga-eme abụghị naanị irube isi n’ihe o kwuru bụ́ iwu ya. Jehova ejighị iwu ga-eduzi ihe niile anyị na-eme ná ndụ kwa ụbọchị kee anyị agbụ. Ya mere, kwa ụbọchị, anyị pụrụ ịhụ ọtụtụ ihe iwu Baịbụl na-ekwughị ihe ọ bụla banyere ha. N’ihe ndị dị otú ahụ, olee otú anyị ga-esi mata ihe ga-adị Jehova mma? N’ime Baịbụl, e nwere ọtụtụ ihe na-eme ka ihe bụ́ echiche Chineke doo anya. Ka anyị na-amụ Baịbụl, anyị na-amata ihe Jehova hụrụ n’anya na ihe ọ kpọrọ asị. (Abụ Ọma 97:10; Ilu 6:16-19) Anyị na-aghọta àgwà na omume na-atọ ya ụtọ. Ka anyị na-amụkwu banyere àgwà Jehova na ụzọ ya, otú ahụ ka anyị ga-enwekwu ike ime ka echiche ya na-eduzi mkpebi anyị nakwa ihe anyị na-eme. Ya mere, ọbụna mgbe a na-enweghị iwu a kapịrị ọnụ Baịbụl nyere, anyị nwere ike ịghọta “ihe uche Jehova bụ.”—Ndị Efesọs 5:17.
9 Dị ka ihe atụ, ọ dịghị iwu Baịbụl nyere nke sịrị ka anyị ghara ile vidio ma ọ bụ TV ebe a na-egosi ime ihe ike jọgburu onwe ya ma ọ bụ mmekọahụ rụrụ arụ. Ma, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịma na ile ihe ndị ahụ adịghị mma, ọ bụrụgodị na ọ dịghị iwu ọ bụla sịrị ka anyị ghara ile ha? Anyị ma otú Jehova si ele ihe ndị ahụ anya. Okwu ya gwara anyị hoo haa, sị: ‘Mkpụrụ obi Jehova kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.’ (Abụ Ọma 11:5) Baịbụl kwukwara, sị: “Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.” (Ndị Hibru 13:4) Ọ bụrụ na anyị echebara okwu ndị ahụ si n’ike mmụọ nsọ echiche, anyị pụrụ ịghọta n’ụzọ doro anya ihe bụ́ uche Jehova. Ọ bụ ya mere anyị ji kpebie na anyị agaghị ele TV ebe a na-egosi ụdị omume ndị ahụ n’ezoghị ihe ọ bụla ezo, bụ́ ihe Chineke anyị kpọrọ asị. Anyị ma na ọ ga-adị Jehova mma ma ọ bụrụ na anyị ezere omume retọrọ eretọ, nke ụwa a na-agbalị igosi ndị mmadụ, na-asị na ọ bụ ntụrụndụ dị mma. *
10, 11. Gịnị mere anyị ji kpebie irubere Jehova isi mgbe niile, oleekwa ụdị isi anyị na-erubere ya?
10 Olee isi ihe mere anyị ji edebe ihe Chineke nyere n’iwu? Gịnị mere anyị ji kpebie ibi ndụ kwa ụbọchị n’ụzọ kwekọrọ n’ihe anyị ma na ọ bụ otú Chineke si eche echiche? Ihe mere anyị ji kpebie ime otú ahụ abụghị naanị ka a ghara inye anyị ntaramahụhụ ma ọ bụ ka anyị zere ihe ndị leghaara iwu Chineke anya na-eji aka ha ekotere onwe ha. (Ndị Galeshia 6:7) Kama nke ahụ, anyị ghọtara na irubere Jehova isi bụ ohere anyị ga-eji gosi na anyị hụrụ ya n’anya. Otú ahụ o si anụ nwatakịrị ọkụ n’obi ime ihe ga-adị nna ya mma, otú ahụ ka anyị chọrọ isi na-eme ihe dị Jehova mma. (Abụ Ọma ) Ọ bụ Nna anyị. Anyị hụkwara ya n’anya. Ọ dịghị ihe na-eme ka anyị nwee ọṅụ ma ọ bụ afọ ojuju dị ukwuu karịa ịma na otú anyị si ebi ndụ ga-eme ka anyị ‘nweta ihu ọma Jehova.’— 5:12Ilu 12:2.
11 Ya mere, isi anyị na-erubere Chineke abụghị ihe na-esighị anyị n’obi; anyị adịghịkwa erubere ya isi naanị n’ihe ole na ole. * Anyị adịghị ahọrọ mgbe anyị ga-erubere ya isi, ya bụ, irube isi naanị mgbe ọ dị anyị mma ma ọ bụ mgbe irube isi na-agaghị esiri anyị ike. Kama nke ahụ, anyị ‘na-esi n’obi anyị erube isi.’ (Ndị Rom 6:17) Anyị kwetara ihe ọbụ abụ so dee Baịbụl kwuru, bụ́ onye dere, sị: “Ihe i nyere n’iwu, bụ́ nke m hụrụ n’anya, ga na-atọ m ụtọ.” (Abụ Ọma 119:47) N’ezie, anyị hụrụ irubere Jehova isi n’anya. Anyị ghọtara na ọ bụ ya ka anyị kwesịrị iji obi anyị dum na-erubere isi n’ihe niile. Nke ahụ bụkwa ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme. (Diuterọnọmi 12:32) Ihe Okwu Jehova kwuru banyere Noa ka anyị chọrọ ka Jehova kwuo banyere anyị. Nna ochie ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi gosiri na ọ hụrụ Chineke n’anya site n’irubere ya isi ruo ọtụtụ iri afọ. Baịbụl kwuru banyere ya, sị: “Noa wee mee dị ka ihe niile Chineke nyere ya n’iwu si dị. O mere nnọọ otú ahụ.”—Jenesis 6:22.
12. Gịnị ga-eme ka isi anyị na-erube mee ka obi Jehova ṅụrịa?
12 Olee otú obi na-adị Jehova ma anyị jiri obi anyị dum na-erubere ya isi? Okwu ya kwuru na ‘obi ya na-aṅụrị’ ma anyị na-eme otú ahụ. (Ilu 27:11) Ọ bụrụ na anyị erube isi, ọ̀ ga-eme ka obi Ọkaakaa Onyenwe eluigwe na ụwa ṅụrịa n’ezie? Ee, ọ ga-eme ka ọ ṅụrịa—e nwekwara ezi ihe kpatara ya! Jehova kere anyị, kwe ka anyị na-ahọrọ ihe anyị chọrọ ime. Nke a pụtara na anyị nwere ikike ikpebi ihe anyị ga-eme; anyị nwere ike ikpebi irubere Chineke isi, ma ọ bụkwanụ kpebie inupụrụ ya isi. (Diuterọnọmi 30:15, 16, 19, 20) Ọ bụrụ na anyị ekpebie iji obi anyị dum na-erubere Jehova isi, ọ bụrụkwa na anyị ekpebie ime otú ahụ n’ihi na anyị ji obi anyị dum hụ Chineke n’anya, anyị ga-eme ka obi tọọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ nke ukwuu, meekwa ka o nwee ọṅụ. (Ilu 11:20) Ọ pụtakwara na anyị ahọrọla ụzọ ndụ nke kacha mma.
“IHE O NYERE N’IWU ADỊGHỊ ARỌ”
13, 14. Gịnị mere a ga-eji kwuo na ‘ihe Chineke nyere n’iwu adịghị arọ’? Olee ihe atụ e nwere ike iji kọwaa ya?
13 Jọn onyeozi gwara anyị ihe ga-eme ka obi sie anyị ike nke ukwuu n’ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme: “Ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.” Otú e si dee okwu Grik a sụgharịrị “arọ” na 1 Jọn 5:3 bụ “ịnyị arọ.” * Otú e si sụgharịa ya na Baịbụl ọzọ bụ: ‘Idebezu iwu Chineke nile adịghị enye nsogbu.’ (Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme abụghị ihe ezi uche na-adịghị na ya ma ọ bụ ihe dị arọ. Iwu ya abụghị ihe ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-enweghị ike idebe.
14 Dị ka ihe atụ, otu ezigbo enyi gị gwara gị ka ị bịa nyere ya aka mgbe ọ chọrọ ịkwapụ ebe o bi. E nwere ọtụtụ igbe a ga-ebu. Ụfọdụ n’ime ha dị mfe nke na ha agaghị esiri otu onye ike obubu. Ma, ndị ọzọ dị arọ nke na ọ bụ mmadụ abụọ ga-enwe ike ibu ha. Enyi gị agwa gị igbe ndị ọ chọrọ ka i buru. Ọ̀ ga-agwa gị ka i buru igbe ndị ọ ma na ị gaghị ebuli? Ee e. Ọ gaghị achọ ka i merụọ onwe gị ahụ́ n’ebe ị na-agbalị ka naanị gị buru igbe ndị ahụ. N’otu aka ahụ, Chineke anyị bụ́ onye nwere ịhụnanya na obiọma agwaghị anyị Diuterọnọmi 30:11-14) Ọ dịghị mgbe ọ ga-agwa anyị ka anyị buru ibu arọ dị otú ahụ. Jehova ma adịghị ike anyị, n’ihi na “ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.”—Abụ Ọma 103:14.
ka anyị debe iwu ndị siri ike bụ́ ndị anyị na-agaghị enwe ike idebe. (15. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na ihe Jehova nyere n’iwu bụ maka ọdịmma anyị?
15 Ihe Jehova nyere n’iwu adịghị arọ ma ọlị; o nyere ya maka ọdịmma anyị. (Aịzaya 48:17) Ọ bụ ya mere Mozis ji gwa ndị Izrel oge ochie, sị: “Jehova nyere anyị iwu ka anyị debe ụkpụrụ ndị a niile, ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke anyị ka o wee dịrị anyị mma mgbe niile, ka anyị wee dịrị ndụ dị ka anyị dị taa.” (Deuterọnọmi 6:24) Obi kwesịkwara isi anyị ike na ihe Jehova bu n’obi nye anyị iwu ya bụ ka ọ dịrị anyị mma ruo ogologo oge—ọbụna ruo mgbe ebighị ebi. N’ezie, ọ̀ dị ihe mere anyị ga-eji nwee obi abụọ? Jehova bụ Chineke nke nwere amamihe na-enweghị nsọtụ. (Ndị Rom 11:33) Ya mere, ọ ma ihe ga-akacha baara anyị uru. Jehova bụkwa ịhụnanya n’onwe ya. (1 Jọn 4:8) Ịhụnanya bụ isi sekpụ ntị n’àgwà ya. Ọ bụ ihe na-emetụta ihe niile ọ na-ekwu na ihe niile ọ na-eme. Ọ bụ ebe iwu niile o nyere ndị ohu ya dabeere.
16. N’agbanyeghị otú ụwa a rụrụ arụ si akpa ike n’ahụ́ ndị mmadụ, n’agbanyeghịkwa ihe na-agụkarị anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè, gịnị mere anyị ga-eji nwee ike irube isi mgbe niile?
16 Nke a apụtaghị na irubere Chineke isi bụ ihe dị mfe. Anyị aghaghị ịlụso ụwa a rụrụ arụ ọgụ, ya bụ, ụwa nke “dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Anyị aghaghịkwa ịlụso anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè ọgụ, ya bụ, anụ ahụ́ nke na-achọkarị ka anyị mebie iwu Chineke. (Ndị Rom 7:21-25) Ma, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ pụrụ ime ka anyị merie. Jehova na-agọzi ndị chọrọ igosi na ha hụrụ ya n’anya site n’irubere ya isi. Ọ na-ewere mmụọ nsọ ya nye “ndị na-erubere ya isi dị ka onye na-achị achị.” (Ọrụ 5:32) Mmụọ ahụ na-amịpụta mkpụrụ ndị magburu onwe ha n’ime anyị, ya bụ, àgwà ndị pụrụ inyere anyị aka irubere Chineke isi mgbe niile.—Ndị Galeshia 5:22, 23.
17, 18. (a) Gịnị ka anyị ga-atụle n’akwụkwọ a? Mgbe anyị na-atụle ya, gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’Isi nke Abụọ?
17 N’akwụkwọ a, anyị ga-eleba anya n’ụkpụrụ dị iche iche Jehova nyere na iwu ndị o nyere banyere omume ọma, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-egosi ihe bụ́ uche ya. Ka anyị na-eleba anya n’ihe ndị a, anyị kwesịrị iburu ihe ụfọdụ dị mkpa n’uche. Ka anyị cheta na Jehova anaghị amanye anyị ka anyị rube isi n’iwu ya nakwa n’ụkpụrụ ya; ọ chọrọ ka isi anyị na-erubere ya si anyị n’ala ala obi. Ka anyị ghara ichefu na Jehova na-agwa anyị ka anyị na-ebi ndụ n’ụzọ ga-eme ka anyị nweta ngọzi dị ukwuu ugbu a, nwetakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Ka anyị mara na isi anyị ji obi anyị dum na-erubere Jehova bụ ohere na-enweghị atụ anyị ga-eji gosi ya na anyị hụrụ ya n’anya nke ukwuu.
18 Iji nyere anyị aka ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, Jehova nyere anyị akọnuche n’ihi ịhụnanya ya. Ma, ọ bụrụ na akọnuche anyị ga-abụ ezigbo ihe nduzi, e kwesịrị ịzụ ya azụ, dị ka a ga-atụle n’Isi nke Abụọ.
^ par. 9 Gụọ Isi nke Isii n’akwụkwọ a, ka ị hụ ebe a tụlere otú anyị ga-esi na-ahọrọ ntụrụndụ dị mma.
^ par. 11 Ọbụna ndị mmụọ ọjọọ nwere ike irube isi nke na-esighị ha n’obi. Mgbe Jizọs nyere ndị mmụọ ọjọọ iwu ka ha si n’ime ụfọdụ ndị mmụọ ọjọọ ji pụta, a manyere ndị mmụọ ọjọọ ahụ ime ihe o kwuru. Ha rubere isi, n’agbanyeghị na o sighị ha n’obi.—Mak 1:27; 5:7-13.
^ par. 13 Na Matiu 23:4, e ji okwu a kọwaa “ibu dị arọ,” ya bụ, iwu ndị dị rịgọ rịgọ na ọdịnala ndị mmadụ chepụtara nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii bokwasịrị ndị mmadụ. N’Ọrụ Ndị Ozi 20:29, 30, a kpọrọ okwu ahụ “ndị obi tara mmiri.” E jikwa ya kọwaa ndị dị aka ike si n’ezi ofufe dapụ, ndị ga “na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ,” na-agbalịkwa iduhie ndị ọzọ.