AJỤJỤ NKE 1
Olee Ụdị Onye M Bụ?
GỊNỊ KA Ị GA-EME?
Chegodị banyere ihe atụ a: Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Karen gara oriri na nkwari. Ọ nọfebeghị nkeji iri, ya anụ olu enyi ya nwaanyị bụ́ Jessica ka o si n’azụ jụọ ya, sị:
“Nke a i guzokwanụ ebe ahụ?”
Karen tụgharịrị hụ ka Jessica bu karama mmanya biya abụọ a ka kwụpere akwụpe. Jessica nyewere Karen otu karama mmanya ma sị ya, “Ị̀ ga-asị na i torubeghị ikporitụ ndụ?”
Karen chọrọ ịsị mba. Ma, cheta na Jessica bụ enyi ya. Karen achọghị ka o chewe na ọ bụ Mgbeeke. Ihe ọzọ bụ na Jessica so ná ndị e weere ka ezigbo mmadụ. Ebe ọ na-aṅụ mmanya, ọ pụtara na ọ bụghị ihe ọjọọ. Karen kwuru n’obi ya, sị: ‘Ọ bụ naanị mmanya. Ya na ịṅụ ọgwụ ọjọọ abụghị otu.’
Ọ bụrụ na ị bụ Karen, gịnị ka ị ga-eme?
CHEGODỊ ECHICHE
Ka i nwee ike ime ihe dị́ mma ma ụdị ihe a mee gị, i kwesịrị ịmata ụdị onye ị bụ. Ịmata ụdị onye ị bụ pụtara na ị ga-ama ihe ndị i kpebiri ịna-eme na ihe ndị i kweere. Ọ ga-eme ka ị kata obi na-eme ihe i kpebiri ime kama ime ihe ndị ọzọ chọrọ ka i mee.
Gịnị ga-enyere gị aka ịna-akata obi? Ịza ajụjụ ndị anyị ga-atụle ugbu a ga-enyere gị aka.
1 OLEE IHE NDỊ M GA-EMELI?
Ịmata ihe ị ga-emeli ga-eme ka ị na-akata obi.
IHE Ị GA-AMỤTA NA BAỊBỤL: Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụgodị na abụghị m ọkà n’ikwu okwu, n’ezie, adịghị m otú ahụ n’ihe ọmụma.” (2 Ndị Kọrịnt 11:6) Pọl ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ọ bụ ya mere na o kweghị ka ọnụ ndị mmadụ na-akọ ya mee ka ọ daa mbà. O kweghịkwa ka okwu ọjọọ ha na-agwa ya mee ka ọ ghara ịkata obi mee ihe dị́ mma.
CHEBARA ONWE GỊ ECHICHE: Dee otu ihe ị ma eme nke ọma.
Dee otu ezigbo àgwà ị na-akpa. (Dị ka ihe atụ, ị̀ dị obiọma? Ị̀ na-emesapụ aka? À na-atụkwasịli gị obi? Ị̀ na-abịa ihe n’oge?)
2 OLEE EBE NDỊ M NA-ANAGHỊ EME NKE ỌMA?
Ọ bụrụ na ị kpacharaghị anya, ebe ị na-anaghị eme nke ọma nwere ike ime ka ị ghara ịbụ ụdị onye ị chọrọ ịbụ.
IHE Ị GA-AMỤTA NA BAỊBỤL: Pọl ma ebe ndị ọ na-anaghị eme nke ọma. O dere, sị: “N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ, dị ka mmadụ m bụ n’ime si dị, ma ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie.”
CHEBARA ONWE GỊ ECHICHE: Olee ebe ị na-anaghị eme nke ọma nke i kwesịrị ịgba mbọ ka i mezie?
3 OLEE IHE NDỊ M KPEBIRI IME?
Ị̀ ga-abanye n’ụgbọala gwa onye na-anya ya ka o buru gị gbawa gburugburu n’otu ebe ruo mgbe mmanụ ụgbọala ya gwụrụ? Onye mere ụdị ihe ahụ dara iberiibe. Ọ bụ ịla ego n’iyi.
Gịnị ka ihe a na-akụziri gị? I nwee ihe ndị i kpebiri ime, ọ ga-eme ka ị na-eme ihe ndị bara uru ma ghara ịna-eme ihe na-enweghị isi na ọdụ.
IHE Ị GA-AMỤTA NA BAỊBỤL: Pọl dere, sị: “Otú m si agba ọsọ abụghị ihe a na-ejighị n’aka.” (1 Ndị Kọrịnt 9:26) Pọl kpebiri ihe ndị ọ ga-eme, gbalịsiekwa ike mee ha kama ịfanye aka n’ụkwụ na-eche ka ihe ọma bịara ya.
CHEBARA ONWE GỊ ECHICHE: N’okpuru ebe a, dee ihe atọ ị chọrọ ime n’afọ na-abịanụ.
4 OLEE IHE NDỊ M KWEERE?
Ọ bụrụ na e nweghị ihe ndị i kweere, ị gaghị ama ihe ị ga-eme eme. Ị ga na-agbanwe ka ogwumagala ka obi dị́ ndị ọgbọ gị mma. I mee otú ahụ, ọ ga-egosi na ị gaghị abụ ụdị onye ị chọrọ ịbụ.
Ma, ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị i kweere, ọ ga-eme ka ị bụrụ ụdị onye ị chọrọ ịbụ n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ na-eme.
IHE Ị GA-AMỤTA NA BAỊBỤL: O nwere ike ịbụ mgbe Daniel onye amụma ka na-eto eto ka o “kpebisiri ike n’obi ya” na ya ga-erubere iwu Chineke isi n’agbanyeghị na ọ bụghị ya na ndị ezinụlọ ya bi. (Daniel 1:8) Ihe a o mere gosiri na ọ chọrọ ịbụ ụdị mmadụ ọ chọrọ ịbụ. Daniel mere ihe ndị o kweere.
CHEBARA ONWE GỊ ECHICHE: Olee ihe ndị i kweere? Dị ka ihe atụ: Ì kweere na Chineke dị? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị mere i ji kwere? Olee ihe ndị mere ka obi sie gị ike na Chineke dị?
Ì kwetara na irubere iwu Chineke isi ga-abara gị uru? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị mere i ji kweta?
Mee elu mee ala, ọ bụ gị ga-ekpebi ụdị onye ị chọrọ ịbụ. Ị̀ ga-adị ka akwụkwọ kpọrọ nkụ nke ikuku na-ebugharị, ka ị̀ ga-adị ka osisi siri ike, nke oké ifufe na-agaghị emeli ihe ọ bụla? I kpebisie ike na ị ga-abụ ụdị onye ị chọrọ ịbụ, ị ga-adị ka osisi ahụ. Ọ ga-enyere gị aka ịza ajụjụ bụ́ Olee ụdị onye m bụ?