Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 10
Jehova bụ Eze kachanụ n’eluigwe na ụwa. Kemgbe ụwa, ihe o kwuru na-eme, ọ ga na-emekwa ruo mgbe ebighị ebi. Dị ka ihe atụ, ọ napụtara Jeremaya mgbe a chọrọ igbu ya. Ọ napụtakwara Shedrak, Mishak na Abednego mgbe a tụbara ha n’ọkụ, napụtakwa Daniel n’olulu ọdụm. Jehova chebekwara Esta ka o nwee ike isi n’aka ya napụta ndị obodo ya. Ọ gaghị ekwe ka ihe ọjọọ dịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ihe ndị e kwuru na Baịbụl gbasara otu nnukwu ihe a kpụrụ akpụ na otu nnukwu osisi Nebukadneza rọrọ ná nrọ gosiri na Alaeze Chineke ga-eme ka ihe ọjọọ niile kwụsị n’oge na-adịghị anya ma chịwa ụwa niile.
NÁ NKEBI A
ISI NKE 57
Jehova Eziga Jeremaya Ka O Kwusaa Okwu Ya
Ihe onye amụma a bụ́ obere nwa gwara ndị okenye Juda were ha ezigbo iwe.
ISI NKE 59
Ụmụ Okorobịa Anọ Erubere Jehova Isi
Ụmụ okorobịa Hibru ekpebisie ike ịna-erubere Jehova isi, ma mgbe ha nọ n’obí eze Babịlọn.
ISI NKE 60
Alaeze nke Ga-adịru Mgbe Ebighị Ebi
Daniel akọwaa ihe nrọ na-atụ ụjọ Nebukadneza rọrọ pụtara.
ISI NKE 61
Ha Akpọghị Isiala
Shedrak, Mishak, na Abednego jụrụ ịkpọrọ ihe eze Babịlọn ji ọlaedo kpụọ isiala.
ISI NKE 65
Esta Anapụta Ndị Obodo Ha
Ọ bụ eziokwu na Esta bụ onye mba ọzọ, bụrụkwa nwa na-enweghị nne na nna, o mechara bụrụ nwunye eze.
ISI NKE 66
Ezra Kụziri Iwu Chineke
Mgbe ndị Izrel gechara Ezra ntị, ha kwere Chineke nkwa pụrụ iche.
ISI NKE 67
Mgbidi Jeruselem
Nehemaya nụrụ na ndị iro ya chọrọ ịbịa mesie ha ike. Gịnị mere ọ tụghị ụjọ?