Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 77

Otu Nwaanyị Abịa Isere Mmiri n’Olulu Mmiri

Otu Nwaanyị Abịa Isere Mmiri n’Olulu Mmiri

Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya mechara Ememme Ngabiga na Jeruselem, ha si ebe ahụ na-alaghachi Galili. Ma ha ga-esi na Sameria gafere. Mgbe ha na-aga, ha kwụsịrị n’olulu mmiri Jekọb. Olulu mmiri a dị nso n’obodo Sameria a na-akpọ Saịka. Jizọs nọ na-ezu ike, ndị na-eso ụzọ ya agawa n’obodo ahụ ka ha zụta nri.

Ka Jizọs na-ezuru ike, otu nwaanyị bịara n’olulu mmiri ahụ isere mmiri. Jizọs sịrị ya: “Nye m mmiri ka m ṅụọ.” Ọ jụrụ Jizọs, sị: ‘Gịnị mere i ji na-arịọ m mmiri, ebe m bụ nwaanyị Sameria? Ndị Juu na ndị Sameria anaghị ekwurịta okwu.’ Jizọs gwara ya, sị: ‘A si na ị ma onye m bụ, ị ga-arịọ m ka m nye gị mmiri, m ga-enyekwa gị mmiri na-enye ndụ.’ Nwaanyị ahụ jụrụ Jizọs, sị: ‘Gịnị ka ị na-ekwu? I nwedịghị ihe e ji esere mmiri.’ Jizọs sịrị ya: ‘Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri nke m ga-enye ya, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ọzọ.’ Nwaanyị ahụ gwara ya, sị: “Nna anyị ukwu, nye m mmiri a.”

Jizọs gwaziri nwaanyị ahụ, sị: ‘Gaa kpọrọ di gị bịa n’olulu mmiri a.’ Ya agwa Jizọs, sị: ‘Enweghị m di.’ Jizọs sịrị ya: ‘I kwuru eziokwu. Ị lụọla di ugboro ise, ma onye gị na ya bi ugbu a abụghị di gị.’ Nwaanyị ahụ sịrị ya: ‘Ana m aghọta na ị bụ onye amụma. Ndị obodo anyị kweere na anyị nwere ike ịnọ n’ugwu a fee Chineke, ma ndị Juu sịrị na ọ bụ naanị na Jeruselem ka mmadụ ga-anọ fee Chineke. Ma, ekwetara m na Mezaya bịa, ọ ga-akụziri anyị otú e si efe Chineke.’ Jizọs gwaziri ya ihe ọ na-agwabeghị mmadụ ọ bụla. Ọ sịrị ya: ‘Abụ m Mezaya ahụ.’

Nwaanyị ahụ gbaara ọsọ gaa n’obodo ya ma gwa ndị mmadụ, sị: ‘Ọ dị m ka ahụla m Mezaya ahụ. Ọ ma ihe niile banyere m. Bịanụ ka unu hụ ya.’ Ha sooro ya gaghachi n’olulu mmiri ahụ ma gee Jizọs ntị ka ọ na-akụziri ha ihe.

Ndị Sameria gwara Jizọs ka ọ bịa nọrọ n’obodo ha. Jizọs nọrọ ebe ahụ abalị abụọ, kụziere ha ihe, ọtụtụ ndị kwekwaara na ya. Ha gwara nwaanyị ahụ, sị: ‘Ugbu a anyị gechara nwoke a ntị, anyị amatala na ọ bụ onye nzọpụta nke ụwa.’

“‘Bịa!’ Onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwa; onye ọ bụla nke chọrọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”​—⁠Mkpughe 22:17