Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 5
Ọnwa abụọ ndị Izrel gafechara Oké Osimiri Uhie, ha rutere n’Ugwu Saịnaị. Ha na Jehova nọ ebe ahụ gbaa ndụ, ha aghọọrọ ya mba pụrụ iche. O chebere ha ma nye ha ihe niile ha chọrọ. O nyere ha mana ka ha rie, nyekwa ha ebe ndị dị mma ha mara ụlọikwuu. O mekwara ka uwe ha yi ghara ịka aka. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta ihe mere Jehova ji nye ndị Izrel Iwu, nye ha ndị nchụàjà, ma gwa ha rụọ ụlọikwuu. Mee ka ọ ghọta ihe mere anyị ji kwesị ịna-emezu nkwa anyị kwere, ịna-adị umeala n’obi ma na-erubere Jehova isi mgbe niile.
NÁ NKEBI A
ISI NKE 23
Ndị Izrel Ekwe Jehova Nkwa
Ndị Izrel kwere Chineke nkwa pụrụ iche mgbe ha mara ụlọikwuu n’Ugwu Saịnaị.
ISI NKE 24
Ha Emeghị Ihe Ha Kwuru
Ndị Izrel mere mmehie jọgburu onwe ya mgbe Mozis gara n’ugwu ka Chineke nye ya Iwu Iri ahụ.
ISI NKE 25
Ndị Izrel Arụọ Ụlọikwuu Ha Ga-anọ Na-efe Chineke
Igbe ọgbụgba ndụ dị n’ụlọikwuu a pụrụ iche.
ISI NKE 27
Ha Nupụụrụ Jehova Isi
E nwere ihe dị mkpa banyere Jehova, Detan, Abaịram na narị ndị ikom abụọ na iri ise chefuru.