Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Gụọ otu narị akụkọ na iri na isii si na Baịbụl ga-atọ gị ụtọ. Ihe a kọrọ na ha bụ eziokwu, dịkwa mfe nghọta, e jikwa foto ndị mara mma kọwaa ha.
Okwu Mmalite
Akụkọ ndị mere eme si n’akwụkwọ kachanụ n’ụwa a, ya bụ Baịbụl. Ọ kọrọ akụkọ otú e si kee ụwa gawazie.
NKEBI NKE 1
Site n’Okike Ihe Ruo n’Iju Mmiri
AKỤKỌ NKE 1
Chineke Amalite Ike Ihe
Akụkọ a kọrọ na Jenesis gbasara otú e si kee ihe dị ụtọ ọgụgụ ma dịrịkwa mfe nghọta, ụmụaka na-aghọtadị ya.
AKỤKỌ NKE 2
Ogige nke Mara Mma
Dị ka a kọrọ na Jenesis, Chineke kere ogige Iden ka ọ bụrụ ebe pụrụ nnọọ iche. Chineke chọrọ ka ụwa niile dịrị ka ogige a mara mma.
AKỤKỌ NKE 3
Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ
Chineke kere Adam na Iv ma debe ha n’ogige Iden ka ha biri ebe ahụ. Ha abụọ ghọrọ di na nwunye mbụ.
AKỤKỌ NKE 4
Ihe Mere E Ji Chụpụ Ha n’Ebe Obibi Ha
Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jenesis gwara anyị otú paradaịs mbụ ahụ si funahụ anyị.
AKỤKỌ NKE 5
Ndụ Ahụhụ Amalite
Mgbe a chụpụrụ Adam na Iv n’ogige Iden, ha nwere ọtụtụ nsogbu. Ọ bụrụ na ha rubeere Chineke isi, ma ha ma ụmụ ha gaara na-enwe obi ụtọ.
AKỤKỌ NKE 6
Ezi Nwa na Ajọ Nwa
Akụkọ Ken na Ebel, bụ́ nke a kọrọ na Jenesis, na-akụziri anyị ụdị mmadụ anyị kwesịrị ịbụ na ụdị àgwà ndị anyị kwesịrị ịkwụsị ịkpa tupu ihe emebie.
AKỤKỌ NKE 7
Nwoke nke Nwere Obi Ike
Ihe Inọk mere na-egosi anyị na mmadụ nwere ike ịna-eme ihe dị mma ọ sọgodị ya ya bụrụ na ndị niile nọ ya nso na-eme ihe na-adịghị mma.
AKỤKỌ NKE 8
Ndị Dike Nọ n’Ụwa
Jenesis isi isii kọrọ akụkọ gbasara ndị dike na-emerụ ndị mmadụ ahụ́. Ndị dike ahụ, ma ọ bụ ndị Nefilim, bụ ụmụ ndị mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi, ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ eluigwe bịa n’ụwa biri ka mmadụ.
AKỤKỌ NKE 9
Noa Ewuo Ụgbọ
Noa na ndị ezinụlọ ya anwụghị n’Iju Mmiri ahụ n’ihi na ha gere Chineke ntị n’agbanyeghị na ndị ọzọ egeghị ntị.
AKỤKỌ NKE 10
Oké Iju Mmiri Ahụ
Ndị mmadụ chịrị ọchị mgbe Noa na-agwa ha na nnukwu mmiri ga-ezo. Ma mgbe mmiri bidoro izo, ọchị gwụrụ ha n’ezé. Mụta otú ụgbọ Noa si zọpụta ma ya, ma ndị ezinụlọ ya nakwa ọtụtụ ụmụ anụmanụ.
NKEBI NKE 2
Site n’Iju Mmiri ruo ná Mgbapụta n’Ijipt
AKỤKỌ NKE 12
Ụmụ Mmadụ Ewuo Nnukwu Ụlọ Elu
Obi adịghị Chineke mma, ntaramahụhụ o nyere ha ka na-emetụtakwa ụmụ mmadụ taa.
AKỤKỌ NKE 13
Ebreham—Enyi Chineke
Gịnị mere Ebreham ji hapụ ọmarịcha ụlọ o bi, birizie n’ụlọ ntu ndụ ya niile?
AKỤKỌ NKE 14
Chineke Elee Okwukwe Ebreham Ule
Gịnị mere Chineke ji gwa Ebreham ka o jiri Aịzik nwa ya chụọrọ ya àjà?
AKỤKỌ NKE 16
Aịzik Alụta Ezigbo Nwunye
Gịnị mere Ribeka ji bụrụ ezigbo nwaanyị? Ọ̀ bụ mma ya, ka è nwere ihe ọzọ?
AKỤKỌ NKE 17
Ụmụ Ejima Ndị Na-eyighị
Papa ha bụ́ Aịzik, hụrụ Ịsọ n’anya karịa Jekọb ma mama ha, bụ́ Ribeka, ka hụ Jekọb n’anya.
AKỤKỌ NKE 19
Jekọb Enwee Ezinụlọ Buru Ibu
È si n’aha ụmụ Jekọb iri na abụọ ndị nwoke nweta ebo iri na abụọ nke Izrel?
AKỤKỌ NKE 21
Ụmụnne Josef Akpọ Ya Asị
Gịnị nwere ike ime ka ụfọdụ n’ime ụmụnne Josef chewe echiche igbu nwanne ha?
AKỤKỌ NKE 22
A Tụọ Josef Mkpọrọ
A tụrụ ya mkpọrọ, ọ bụghị n’ihi na o mere ihe ọjọọ, kama n’ihi na o mere ihe dị mma.
AKỤKỌ NKE 24
Josef Elee Ụmụnne Ya Ule
Olee otú ọ ga-esi ama ma ụmụnne ya hà agbanweela kemgbe ahụ ha rere ya ka ọ bụrụ ohu?
AKỤKỌ NKE 25
Ezinụlọ Ahụ Akwaga Ijipt
Gịnị mere e ji akpọ ndị ezinụlọ Jekọb ndị Izrel kama ịkpọ ha ndị Jekọb?
AKỤKỌ NKE 26
Job Kwesịrị Ntụkwasị Obi Nye Chineke
Akụnụba Job niile lara n’iyi, ụmụ ya niile nwụkwara, ọ dakwara nnukwu ọrịa. Ọ̀ bụ Chineke na-ata ya ahụhụ?
AKỤKỌ NKE 27
Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt
Gịnị mere o ji gwa ndị obodo ya ka ha gbuo nwa nwoke ọhụrụ ọ bụla ndị Izrel mụrụ?
AKỤKỌ NKE 27
Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt
Gịnị mere o ji gwa ndị obodo ya ka ha gbuo nwa nwoke ọhụrụ ọ bụla ndị Izrel mụrụ?
AKỤKỌ NKE 29
Ihe Mere Mozis Ji Gbaa Ọsọ
Mgbe Mozis dị iri afọ anọ, o chere na ya etoruola ịzọpụta ndị Izrel ka ha kwụsị ịgbara ndị Ijipt ohu, ma ọ maghị na oge erubeghị.
AKỤKỌ NKE 30
Osisi nke Na-ere Ọkụ
Chineke ji ọrụ ebube dị iche iche mee ka Mozis mara na oge eruola ka ọ gaa dupụta ndị Izrel n’Ijipt.
AKỤKỌ NKE 31
Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero
Gịnị mere na Fero egeghị Mozis ntị ma hapụ ndị Izrel ka ha laa?
AKỤKỌ NKE 32
Ihe Otiti Iri Ahụ
Chineke mere ka nnukwu nsogbu iri bịakwasị obodo Ijipt n’ihi na Fero bụ́ eze Ijipt siri ọnwụ na ọ gaghị ahapụ ndị Izrel ka ha laa.
AKỤKỌ NKE 33
Ịgafe Oké Osimiri Uhie
Mozis ji ike Chineke nyere ya kewaa Oké Osimiri Uhie, ndị Izrel enwee ike ịgafe n’ala akọrọ.
NKEBI NKE 3
Site ná Mgbapụta n’Ijipt Ruo n’Eze Mbụ nke Izrel
AKỤKỌ NKE 36
Nwa Ehi Ọlaedo
Gịnị mere ndị mmadụ ga-eji fewe ihe a kpụrụ akpụ e ji ọla ntị a gbazere agbaze mee?
AKỤKỌ NKE 37
Ụlọ Ntu A Na-anọ Efe Ofufe
Ọ bụ n’ọnụ ụlọ nke dị n’ime ime ka e dowere igbe ọgbụgba ndụ.
AKỤKỌ NKE 38
Ndị Nledo Iri na Abụọ
Mmadụ iri ná ndị nledo iri na abụọ ahụ kwuru otu ihe, mmadụ abụọ ndị nke ọzọ ekwuo ihe ọzọ. Ònye ka ndị Izrel kweere ihe ha kwuru?
AKỤKỌ NKE 39
Okooko Osisi Epuo na Mkpanaka Erọn
Olee otú okooko osisi ga-esi puo n’osisi kpọrọ nkụ naanị n’otu abalị?
AKỤKỌ NKE 40
Mozis Etie Nkume Ihe
Mozis kụrụ mkpanaka ya na nkume, mmiri wee gbapụta, gịnịzi mere Jehova ji wee iwe.
AKỤKỌ NKE 44
Rehab Ezobe Ndị Nledo
Olee otú Rehab si nyere ụmụ nwoke abụọ aka, oleekwa ihe ọ rịọrọ ka ha meere ya?
AKỤKỌ NKE 45
Ịgafe Osimiri Jọdan
E nwere ọrụ ebube Chineke rụrụ mgbe ndị nchụàjà zọnyere ụkwụ n’Osimiri Jọdan.
AKỤKỌ NKE 48
Ndị Gibiọn Bụ́ Ndị Maara Ihe
Ha ghọgburu Jọshụa na ndị Izrel ndị ọzọ, ha ekwe ha nkwa, ma ndị Izrel mezuru nkwa ha kwere.
AKỤKỌ NKE 49
Anyanwụ Akwụrụ Otu Ebe
Jehova meere Jọshụa ihe ọ na-emetụbeghị mbụ, o mebeghịkwa ya ọzọ kemgbe ahụ.
AKỤKỌ NKE 50
Ndị Inyom Abụọ Ndị Nwere Obi Ike
Berak du ndị agha Izrel gaa agha, gịnịzi mere o ji bụrụ Jel ka e nyere otuto ya?
AKỤKỌ NKE 51
Rut na Neomi
Rut hapụrụ obodo ya na ndị ezinụlọ ya ka ya na Neomi nọrọ nakwa ka o fee Jehova.
AKỤKỌ NKE 52
Gidiọn Na Narị Ndị Ikom Atọ Ya
Chineke kwuru ụzọ dị ịtụnanya e si họrọ ìgwè ndị agha a dị ntakịrị.
AKỤKỌ NKE 55
Nwatakịrị Nke Na-ejere Chineke Ozi
Mgbe Samuel ka dị obere, Chineke si n’ọnụ ya zie Ilaị bụ́ Onyeisi Nchụàjà ozi na-agba agba ná ntị.
AKỤKỌ NKE 56
Sọl—Eze Mbụ nke Izrel
Ná mbido Chineke họpụtara Sọl, ma mechaa jụ ya, olee ihe dị mkpa anyị na-amụta n’ihe mere Sọl.
AKỤKỌ NKE 58
Devid na Golayat
Ọ bụghị naanị katapọọtụ ka Devid ji lụso Golayat ọgụ, o nwere ihe ọzọ ka ike o ji bịa.
AKỤKỌ NKE 59
Ihe Mere Devid Ji Gbaa Ọsọ
Sọl nweburu nnọọ mmasị n’ebe Devid nọ, gịnị meziri o ji nwewara Devid anyaụfụ ma chọọ igbu ya?
AKỤKỌ NKE 60
Abigel na Devid
Abigel kwuru na di ya bụ nwoke na-abaghị n’ihe nke na-eme ihe nzuzu, ma ihe a o kwuru mere ka a ghara igbu di ya mgbe ahụ.
AKỤKỌ NKE 61
E Chie Devid Eze
Devid si n’ihe ndị o mere na ihe ndị ọ na-ekweghị eme gosi na ya ruru eru ịbụ eze Izrel.
AKỤKỌ NKE 62
Nsogbu Adị n’Ụlọ Devid
Devid si n’otu mmehie o mere butere ya na ndị ezinụlọ ya nsogbu ruo ọtụtụ afọ.
AKỤKỌ NKE 64
Solomọn Ewuo Ụlọ Nsọ
N’agbanyeghị na Solomọn maara ihe, a rabara ya ime ihe nzuzu na ihe na-adịghị mma.
AKỤKỌ NKE 65
E Kewaa Alaeze Ahụ
Ozugbo Jeroboam bidoro ịchị, ya emee ka ndị Izrel bido inupụ isi n’iwu Chineke.
AKỤKỌ NKE 67
Jehoshafat Atụkwasị Jehova Obi
Gịnị mere ndị agha ga-eji gawa agha ya abụrụ ndị na-abụ abụ na-ejighị ngwá ọgụ ga-ebute ụzọ?
AKỤKỌ NKE 68
Ụmụntakịrị Nwoke Abụọ Ndị Dịghachiri Ndụ
È nwere ike ime ka onye nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ? O nweela mgbe o mere!
AKỤKỌ NKE 69
Otu Nwa Agbọghọ Nta Enyere Otu Dike Aka
Ọ katara obi kwuo okwu, o mekwara ka Chineke rụọ ọrụ ebube.
AKỤKỌ NKE 70
Jona na Azụ̀ Ukwu Ahụ
Jona mụtara na ọ dị ezigbo mkpa ka mmadụ na-eme ihe Jehova gwara ya mee.
AKỤKỌ NKE 71
Chineke Ekwe Nkwa Iweta Paradaịs
Paradaịs mbụ dị naanị n’otu ebe n’ụwa; nke ugbu a ga-ezu ụwa niile.
AKỤKỌ NKE 72
Chineke Enyere Eze Hezekaya Aka
N’otu abalị, otu mmụọ ozi gburu ndị agha Asiria dị otu narị puku na puku iri asatọ na ise.
AKỤKỌ NKE 73
Eze Ọma Ikpeazụ Chịrị Izrel
Josaya bidoro mgbe ọ ka dị obere mewe ihe gosiri na o nwere obi ike.
AKỤKỌ NKE 74
Nwoke nke Na-atụghị Egwu
Jeremaya chere na ya etorubeghị ịbụ onye amụma, ma Chineke ma na ọ ga-emeli ya.
AKỤKỌ NKE 75
Ụmụ Okorobịa Anọ Ndị Nọ na Babilọn
Ha mere ihe dị Chineke mma n’agbanyeghị na ha na ndị ezinụlọ ha anọghị.
AKỤKỌ NKE 76
E Bibie Jeruselem
Gịnị mere Chineke ji kwe ka ndị Babilọn, bụ́ ndị iro ndị Izrel, bibie Jeruselem?
AKỤKỌ NKE 77
Ha Ekweghị Akpọ Isi Ala
Chineke ọ̀ ga-esi n’ime ọkụ zọpụta ụmụ okorobịa atọ ahụ rubeere ya isi?
AKỤKỌ NKE 78
Ihe Aka Dere ná Mgbidi
Daniel onye amụma akọwaa ihe mkpụrụ okwu anọ ahụ dị mgbagwoju anya pụtara.
AKỤKỌ NKE 79
Daniel Nọ n’Olulu Ọdụm
E kwuola na a ga-egbu Daniel, ò nwere ihe ọ gaara eme ka a ghara igbu ya?
AKỤKỌ NKE 80
Ndị Chineke Ahapụ Babilọn
Saịrọs, eze Peshia mezuru otu amụma e buru na Baịbụl mgbe o meriri obodo Babilọn, ugbu a o mezuwakwala amụma ọzọ.
AKỤKỌ NKE 81
Ha Tụkwasịrị Chineke Obi na Ọ Ga-enyere Ha Aka
Ndị Izrel nupụrụ isi n’iwu mmadụ ka ha nwee ike irubere Chineke isi. Chineke ọ̀ ga-agọzi ha?
AKỤKỌ NKE 82
Mọdekaị na Esta
Vashtaị, nwunye Eze Ahazuirọs, mara ezigbo mma ma gịnị mere eze ji chọọ nwaanyị ọzọ ga-anọchi ya?
AKỤKỌ NKE 83
Mgbidi Jeruselem
Mgbe ha na-arụghachi mgbidi ahụ, ndị ahụ na-arụ ya na-edowe mma agha ha na ube ha nso ma n’ehihie ma n’abalị.
NKEBI NKE 6
Site n’Ọmụmụ Jizọs Ruo n’Ọnwụ Ya
AKỤKỌ NKE 84
Otu Mmụọ Ozi Eleta Meri
O wetaara ya ozi si n’aka Chineke: Meri ga-amụ nwa nwoke ga-achị ruo mgbe ebighị ebi.
AKỤKỌ NKE 86
Ndị Ikom Otu Kpakpando Duziri
Ònye dugara ndị ahụ na-agụ kpakpando n’ebe Jizọs nọ? Azịza ya nwere ike iju gị anya.
AKỤKỌ NKE 87
Mgbe Nwata Bụ́ Jizọs Nọ n’Ụlọ Nsọ
Otú o si mara ihe tụrụ ndị okenye na-akụzi ihe n’ụlọ nsọ n’anya.
AKỤKỌ NKE 88
Jọn Emee Jizọs Baptizim
Jọn nọ na-eme ndị mmehie baptizim, ma Jizọs emetụbeghị mmehie. Gịnịzi mere Jọn ji mee ya baptizim?
AKỤKỌ NKE 90
Mgbe Jizọs na Otu Nwaanyị Nọ n’Akụkụ Olulu Mmiri
Olee otú mmiri Jizọs na-enye ga-esi mee ka akpịrị ghara ịkpọ nwaanyị ahụ nkụ ọzọ?
AKỤKỌ NKE 91
Mgbe Jizọs Na-ezi Ihe n’Elu Ugwu
Mụta ọtụtụ ihe ndị ga-abara gị uru ná ndụ n’Ozizi Elu Ugwu Jizọs.
AKỤKỌ NKE 92
Jizọs Akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ
Jizọs ji ike Chineke kwuo mkpụrụ okwu abụọ ma kpọlite ada Jaịrọs n’ọnwụ.
AKỤKỌ NKE 93
Jizọs Enye Ọtụtụ Mmadụ Nri
Olee otu ihe dị mkpa Jizọs ji inye ọtụtụ puku mmadụ nri kụziere anyị?
AKỤKỌ NKE 94
Jizọs Hụrụ Ụmụntakịrị n’Anya
Jizọs kụziiri ndịozi ya na e nwere ọtụtụ ihe ha ga-amụ banyere ụmụaka, nweekwa ihe ndị ha ga-esi n’aka ụmụaka mụta.
AKỤKỌ NKE 95
Ụzọ Jizọs Si Akụzi Ihe
Ihe atụ ezigbo onye agbata obi ahụ Jizọs mere bụ otu ihe gosiri na Jizọs na-ejikarị ihe atụ akụzi ihe.
AKỤKỌ NKE 97
Jizọs Abịa Dị Ka Eze
Ìgwè mmadụ bịara ịnabata ya, ma ọ bụghị mmadụ niile ka obi dị mma.
AKỤKỌ NKE 99
N’ime Ụlọ Dị n’Ụlọ Elu
Gịnị mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eri nri a pụrụ iche n’afọ ọ bụla?
AKỤKỌ NKE 100
Mgbe Jizọs Nọ n’Ime Ubi A Gbara Ogige
Gịnị mere Judas ji sutu Jizọs ọnụ wee rara ya nye?
AKỤKỌ NKE 102
Jizọs Dị Ndụ
Mgbe mmụọ ozi kwapụrụ nkume e ji dochie ọnụ ili ebe e liri Jizọs, ndị agha nọ nche ebe ahụ tụrụ ụjọ n’ihi ihe ha hụrụ n’ime ebe ahụ e liri ya.
AKỤKỌ NKE 103
N’ime Ụlọ A Kpọchiri Akpọchi
Gịnị mere na ndị na-eso ụzọ Jizọs amataghịzi ya mgbe o bilitechara n’ọnwụ?
AKỤKỌ NKE 104
Jizọs Alaghachi n’Eluigwe
Tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, o nyere ndị na-eso ụzọ ya otu iwu ikpeazụ.
AKỤKỌ NKE 105
Ha Nọ Na Jeruselem Na-echere
Gịnị mere Jizọs ji wụsa ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ n’ụbọchị Pentikọst?
AKỤKỌ NKE 106
A Tọhapụ Ha n’Ụlọ Mkpọrọ
Ndị ndú okpukpe ndị Juu tụkpuru ndịozi Jizọs n’ụlọ mkpọrọ ka ha kwụsị ha ikwusa ozi ọma. Ma Chineke nwere ihe ọzọ o bu n’obi.
AKỤKỌ NKE 110
Timoti—Onye Inyeaka Ọhụrụ nke Pọl
Timoti hapụrụ ụlọ ha gaa soro Pọl kwusawa ozi ọma n’ebe dị iche iche.
AKỤKỌ NKE 111
Nwata Nwoke Ụra Buuru
Ụra buuru Yutikọs mgbe Pọl na-agwa ndị na-eso ụzọ nọ na Troas okwu, ọ bụghị mgbe Pọl na-ekwu okwu nke abụọ ya ka ihe a mere. E nwere ọrụ ebube merenụ n’agbata oge Pọl kwuru okwu nke mbụ na mgbe o kwuru nke abụọ.
AKỤKỌ NKE 112
Ụgbọ Ha Ekpuo n’Otu Agwaetiti
Mgbe o yiri ka olileanya adịghịzi, Chineke gwara Pọl ihe mere ka obi sie ya ike.
AKỤKỌ NKE 113
Mgbe Pọl Nọ na Rom
Olee otú Pọl onyeozi ga-esi kwusaa ozi ọma ebe ọ bụ na a tụrụ ya mkpọrọ?
NKEBI NKE 8
Ihe Baịbụl Kwuru Ga-emezu
AKỤKỌ NKE 114
Ngwụsị Nke Ihe Ọjọọ Niile
Gịnị mere Chineke ji zipụ ndị agha ya si n’eluigwe ka Jizọs duru ha lụọ agha Amagedọn?
AKỤKỌ NKE 115
Paradaịs Ọhụrụ n’Elu Ụwa
O nwere mgbe ndị mmadụ bi na paradaịs n’ụwa a, ha ga-ebikwa na paradaịs n’ụwa a ọzọ.
AKỤKỌ NKE 116
Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Dị Ndụ Ebighị Ebi
Naanị ịmara onye Jehova na Jizọs bụ, ò zuola? Ọ bụrụ na ò zughị, gịnị ọzọ dị mkpa?
Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Ajụjụ na amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere ụmụaka aka ịghọtakwu ihe a kọrọ n’akụkọ Baịbụl nke ọ bụla.