IHE ỌMỤMỤ NKE 12
Gịnị Na-Eme Mgbe Mmadụ Nwụrụ?
Ọnwụ bụ adịghị ndụ. Ọnwụ yiri oké ụra. (Jọn 11:11-14) Ndị nwụrụ anwụ apụghị ịnụ ihe, ịhụ ụzọ, ikwu okwu, ma ọ bụ iche echiche ọ bụla. (Eklisiastis 9:5, 10) Okpukpe ụgha na-akụzi na ndị nwụrụ anwụ na-aga n’ala mmụọ ije soro ndị nna nna ha biri. Nke ahụ abụghị ihe Bible na-akụzi.
Ndị nwụrụ anwụ apụghị inyere anyị aka, ha apụghịkwa imerụ anyị ahụ. Ọ bụ ihe a na-ahụ n’ebe nile bụ́ ndị mmadụ ime ememe na ịchụ àjà ndị ha kwenyere na ha ga-amasị ndị nwụrụ anwụ. Nke a adịghị amasị Chineke n’ihi na ọ dabeere n’otu n’ime ụgha ndị Setan ghara. Ọ pụghịkwa ịmasị ndị nwụrụ anwụ, ebe ọ bụ na ha adịghị ndụ. Anyị ekwesịghị ịtụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ ma ọ bụ ife ha ofufe. Anyị kwesịrị ife nanị Chineke ofufe.—Matiu 4:10.
Ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. Jehova ga-akpọte ndị nwụrụ anwụ ịdị ndụ n’ụwa paradaịs. Oge ahụ ka dị n’ihu. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Chineke pụrụ ịkpọte ndị nwụrụ anwụ dị nnọọ ka ị pụrụ isi kpọtee mmadụ n’ụra.—Mak 5:22, 23, 41, 42.
Echiche bụ́ na anyị adịghị anwụ anwụ bụ ụgha nke Setan bụ́ Ekwensu na-agbasa. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eme ka ndị mmadụ na-eche na mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ma na-akpata ọrịa na nsogbu ndị ọzọ. Setan na-aghọgbu ndị mmadụ, mgbe ụfọdụ site ná nrọ na ọhụụ. Jehova na-akatọ ndị na-anwa iso ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu.—Deuterọnọmi 18:10-12.