ISI NKE 11
“M Họpụtara Gị Ka Ị Bụrụ Onye Nche”
IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Jehova họpụtara onye nche, kwuokwa ihe bụ́ ọrụ ya
1. Kwuo ihe ndị amụma Jehova bụ́ ndị nche nọ na-eme na ihe mechara mee.
ONYE nche guzo n’elu mgbidi Jeruselem n’oge mgbede, jiri aka kpuchitụ anya ya ka anwụ ghara ịchaba ya n’anya. Ọ na-elegharị anya ka ọ hụ ihe na-emenụ. Na mberede, o weliri opi ya, kuru ume ma fụọ ya iji gwa ndị obodo ha na ndị agha Babịlọn na-abịa. Ma, e nweghịzi ihe ndị obodo ha na-akpọchị ntị ga-emeli iji zọọ onwe ha ndụ. Kemgbe ihe karịrị otu narị (100) afọ, Jehova họpụtara ndị nche, ma ọ bụ ndị amụma, ndị nọ na-adọ ndị ya aka ná ntị gbasara ihe mere n’ụbọchị ahụ, ma ha egeghị ntị. Ugbu a, ndị agha Babịlọn agbaala obodo ha gburugburu. Mgbe ndị agha ahụ nọchibidoro obodo ha ruo ọtụtụ ọnwa, ha kwaturu mgbidi ya, bibie ụlọ nsọ ha, gbuo ọtụtụ ndị bi na Jeruselem, jidekwa ndị ọzọ.
2, 3. (a) Gịnị ga-eme ndị bi n’ụwa n’oge na-adịghị anya, gịnịkwa ka ha kwesịrị ikpebi ime? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?
2 Taa, ndị agha Jehova nọ n’eluigwe na-ejikere ka ha lụso ndị na-enupụ isi bi n’ụwa agha. (Mkpu. 17:12-14) A ga-alụ agha ahụ ná ngwụcha oge oké mkpagbu a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe e kere mmadụ. (Mat. 24:21) Ma oge agafechabeghị ka ọtụtụ ndị gee ntị n’ihe ndị Jehova họpụtara ka ha na-arụ ọrụ onye nche na-agwa ha.
3 Gịnị mere Jehova ji họpụta ndị nche? Olee ụdị ozi onye nche na-ezi? Olee ndị na-arụ ọrụ onye nche n’oge a? Oleekwa otú ọrụ ha na-arụ si gbasa anyị? Ka anyị zaa ajụjụ ndị a.
“Dọọ Ha Aka ná Ntị Otú M Gwara Gị Dọọ Ha”
4. Gịnị mere Jehova ji họpụta ndị nche? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)
4 Gụọ Ezikiel 33:7. N’oge ochie, ndị nche na-eguzokarị n’elu mgbidi obodo na-eche ndị obodo ha nche. Ọrụ a ha na-arụ na-egosi na eze ha hụrụ ndị ọ na-achị n’anya. Ọ bụrụ na onye nche afụọ opi, o nwere ike imete ndị obodo ha n’ụra. Ma, opi ahụ ọ fụrụ nwekwara ike ịzọ ndị mmadụ ndụ ma ha mee ihe ha kwesịrị ime. Jehova họpụtakwara ndị nche maka na ọ hụrụ ndị Izrel n’anya, chọọkwa ịzọ ha ndụ, ọ bụghị ka ha na-ezi ha ozi ga na-emenye ha ụjọ.
5, 6. Olee otu ihe na-egosi na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi?
5 Ọrụ Jehova nyere Ezikiel ka ọ bụrụ onye nche mere ka anyị mata àgwà ya ụfọdụ ndị na-eme ka obi ruo anyị ala. Ka anyị kwuo gbasara abụọ n’ime ha.
6 Ikpe ziri ezi: Otú Jehova si emeso anyị n’otu n’otu n’eleghị anyị anya n’ihu na-egosi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na ọ bụ ọtụtụ ndị nụrụ ozi Ezikiel ziri ma jụ ige ya ntị, Jehova ewereghị ndị Izrel niile ka ndị nnupụisi. Kama, ọ chọrọ ịma ihe onye ọ bụla nụrụ ozi ahụ ga-eme. Ọtụtụ ugboro, ọ dọrọ “onye ajọ omume” na “onye ezi omume” aka ná ntị. N’ihi ya, ọ bụ ihe onye ọ bụla mere mgbe ọ nụrụ ozi ahụ ga-ekpebi ihe Jehova ga-eme ya.—Ezik. 33:8, 18-20.
7. Gịnị ka Jehova na-eji ekpe ndị mmadụ ikpe?
7 Otú Jehova si ekpe ndị mmadụ ikpe na-egosikwa na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ bụghị ihe ndị mmadụ mere n’oge gara aga ka Jehova ji ekpe ha ikpe, kama ọ bụ ihe ha mere mgbe a dọchara ha aka ná ntị. Jehova sịrị Ezikiel: ‘Ọ bụrụ na mụ asị onye ajọ omume: “Ị ga-anwụrịrị,” ya ahapụ mmehie ya mewe ihe ziri ezi na ezi omume, ọ ga-adịrị ndụ na-aga.’ Jehova kwukwara ihe ọzọ dị ezigbo mkpa, sị: “A gaghị ata ya ahụhụ maka mmehie ọ bụla o mere n’oge gara aga.” (Ezik. 33:14-16) Ma, ọ bụrụ na onye na-eme ihe ọma emewezie ihe ọjọọ, ọ gaghị atụ anya na Jehova ga-ahapụ ịta ya ahụhụ ihe ọjọọ ọ na-eme. Jehova kwuru na ọ bụrụ na onye ezi omume “emee ihe ọjọọ maka na o chere na ihe ọma ndị o mere ga-azọ ya, a gaghị echeta ihe ọma ọ bụla o mere. Kama, ọ ga-anwụ n’ihi ihe ọjọọ o mere.”—Ezik. 33:13.
8. Gịnị ka aka ná ntị ndị amụma dọrọ ndị Chineke na-akụziri anyị banyere otú Jehova si ekpe ikpe ziri ezi?
8 Ihe ọzọ gosikwara na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi bụ na ọ na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị otú dị mma tupu ọ taa ha ahụhụ. Ezikiel malitere ọrụ Chineke nyere ya ihe dị ka afọ isii tupu ndị agha Babịlọn ebibie Jeruselem. Ma, Ezikiel abụghị onye mbụ dọrọ ndị Chineke aka ná ntị na a ga-ata ha ahụhụ maka na ha na-enupụ isi. Ihe karịrị otu narị (100) afọ tupu e bibie Jeruselem, Jehova zigara ndị amụma bụ́ Hosia, Aịzaya, Maịka, Oded, na Jeremaya ka ha gaa dọọ ndị ya aka ná ntị otú ndị nche na-eme. Jehova gwara Jeremaya ka o chetara ndị Izrel, sị: “Ahọpụtara m ndị nche ndị nọ na-asị unu, ‘Ṅaanụ ntị n’ụda opi!’ ” (Jere. 6:17) A gaghị ata Jehova ma ọ bụ ndị amụma o ji mere ndị nche ụta maka ndị nwụrụ mgbe ndị Babịlọn mechara bibie Jeruselem otú Jehova kwuru.
9. Olee otú Jehova si gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya?
9 Ịhụnanya: Jehova zigara ndị nche ya ka ha dọọ ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume aka ná ntị n’agbanyeghị na ndị ajọ omume mere ihe wutere ya, mebiekwa aha ya. Ihe a gosiri na Jehova hụrụ ndị mmadụ n’anya. Chetakwa na ndị mmadụ ma na ndị Izrel bụ ndị Jehova. Ma, ha hapụrụ Jehova ọtụtụ ugboro fewe arụsị. Jehova ji mba Izrel tụnyere nwaanyị hapụrụ di ya kwawa iko iji mee ka a ghọta otú ihe ha mere si wute ya. (Ezik. 16:32) N’agbanyeghị ihe ha mere, Jehova ahapụghị ha ozugbo. Ọ gbara mbọ ka ya na ha dozie. Kama ibu ụzọ tawa ha ahụhụ, o bu ụzọ dọọ ha aka ná ntị ka ọ mara ma hà ga-echegharị. Maka gịnị? Ọ gwara Ezikiel, sị: “Obi anaghị atọ m ụtọ ma onye ajọ omume nwụọ, ma obi na-atọ m ụtọ ma onye ajọ omume gbanwee àgwà ya ma dịrị ndụ.” (Ezik. 33:11) Otú ahụ obi dị Jehova n’oge ahụ ka ọ dịkwa ya taa.—Mal. 3:6.
10, 11. Gịnị na gịnị ka anyị ga-amụta n’otú Jehova si meso ndị ya?
10 Gịnị ka anyị ga-amụta n’otú Jehova si gosi na ọ hụrụ ndị Izrel n’anya ma na-ekpe ikpe ziri ezi? Otu ihe anyị kwesịrị ịmụta bụ na ndị anyị na-ezi ozi ọma abụghị otu, kama onye nke ọ bụla dị iche n’ibe ya. Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma anyị chee na mmadụ agaghị ege ntị n’ozi ọma n’ihi ihe o mere n’oge gara aga, ma ọ bụ otú ọ dị, ebe o si, otú o nweruru ego, ma ọ bụkwanụ asụsụ ọ na-asụ. Jehova kụziiri Pita onyeozi otu ihe gbara ọkpụrụkpụ nke anyị kwesịrị ịna-echeta taa. Ihe ahụ bụ na “Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Kama ná mba ọ bụla, ọ na-anabata onye na-atụ egwu ya, nke na-emekwa ihe dị mma.”—Ọrụ 10:34, 35.
11 Ihe ọzọ dị mkpa anyị kwesịrị ịmụta bụ na anyị kwesịrị ịna-eleru onwe anyị anya. Ihe ọma ndị anyị mere n’oge gara aga agaghị eme ka Chineke ghara ịta anyị ahụhụ maka ihe ọjọọ ndị anyị na-eme ugbu a. Anyị kwesịrị ịna-echeta na anyị ezughị okè otú ndị anyị na-ezi ozi ọma na-ezughịkwa okè. N’ihi ya, ihe Pọl onyeozi gwara ọgbakọ dị na Kọrịnt gbasakwara anyị. Ọ sịrị ha: “Ka onye chere na ya kwụ chịm lezie anya ka ọ ghara ịda. Ọnwụnwa na-abịara unu na-abịakwara mmadụ niile.” (1 Kọr. 10:12, 13) Anyị ekwesịghị iche na ‘ihe ọma ndị anyị mere ga-azọ anyị,’ anyị emewezie ihe ọjọọ, na-eche na a gaghị ata anyị ahụhụ maka na anyị na-emekwa ihe ọma. (Ezik. 33:13) N’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị kwesịrị ịna-adị umeala n’obi ma na-erubere ya isi.
12. Ọ bụrụ na anyị mere mmehie dị oké njọ n’oge gara, gịnị ka anyị kwesịrị icheta?
12 Ma, gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na obi ka na-ama anyị ikpe maka ihe ọjọọ anyị mere n’oge gara aga? Ozi ahụ Ezikiel ziri ndị Izrel na-akụziri anyị na ọ bụ ndị na-eme ihe ọjọọ na-ekweghị echegharị ka Jehova na-ata ahụhụ. Ma, ọ na-akụzikwara anyị na Jehova bụ Chineke ịhụnanya, ọ bụghị Chineke na-ata ndị mmadụ ahụhụ. (1 Jọn 4:8) Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị gosiri na anyị echegharịala, anyị ekwesịghị ịna-eche na Chineke enweghị ike imere anyị ebere. (Jems 5:14, 15) Jehova gbaghaara ndị Izrel hapụrụ ya gaa fewe chi ọzọ. Ọ dịkwa njikere ịgbaghara anyị.—Ọma 86:5.
“Gwa Ndị Obodo Gị, Sị”
13, 14. (a) Olee ụdị ozi ndị nche na-ezisa? (b) Olee ozi Aịzaya zisara?
13 Gụọ Ezikiel 33:2, 3. Olee ụdị ozi Jehova chọrọ ka ndị o mere ndị nche zisaa? Otu ihe dị mkpa so n’ọrụ Jehova nyere ha bụ ịna-adọ ndị mmadụ aka ná ntị. Ma, ha zikwara ndị mmadụ ozi ọma. Ka anyị hụ ụfọdụ n’ime ha.
14 Aịzaya rụrụ ọrụ a malite n’ihe dị ka afọ 778 ruo afọ 732 T.O.N.K. Ọ dọrọ ndị bi na Jeruselem aka ná ntị na ndị Babịlọn ga-emeri Jeruselem ma dọrọ ndị bi na ya n’agha. (Aịza. 39:5-7) Ma, e sikwa n’ike mmụọ nsọ mee ka o dee, sị: “Geenụ ntị! Ndị nche unu na-eti mkpu. Ha ji otu olu na-eti mkpu ọṅụ. N’ihi na ha ga-eji anya ha hụ mgbe Jehova ga-akpọlata ndị bi na Zayọn.” (Aịza 52:8) Aịzaya zisara ozi na-eme obi ụtọ, na a ga-eme ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe.
15. Olee ụdị ozi Jeremaya zisara?
15 Jeremaya buru amụma malite n’afọ 647 ruo afọ 580 T.O.N.K. A na-asịkarị na amụma ọ na-ebu bụ “amụma ọdachi.” N’eziokwu, ọ gbasiri mbọ ike dọọ ndị Izrel aka ná ntị maka ọdachi Jehova kwuru na ọ ga-eme ka ọ dakwasị ha. a Ma, o zisakwara ozi ọma. O kwuru na ndị Chineke ga-alọghachi n’ala ha, maliteghachi ife ya ezigbo ofufe n’ebe ahụ.—Jere. 29:10-14; 33:10, 11.
16. Olee otú ozi Ezikiel ziri si baara ndị a dọọrọ n’agha nọ na Babịlọn uru?
16 A họpụtara Ezikiel ka ọ bụrụ onye nche n’afọ 613 T.O.N.K. Ọ rụrụ ọrụ a ruo n’ihe dị ka afọ 591 T.O.N.K. Anyị mụtara n’Isi nke 5 na nke 6 n’akwụkwọ a na Ezikiel ji obi ya niile dọọ ndị Izrel aka ná ntị na a ga-ebibi ha. Ihe a o mere ga-eme ka ikpe ọbara ghara ịma ya ma e bibie onye ọ bụla n’ime ha. Ezikiel dọrọ ndị ahụ a dọọrọ n’agha aka ná ntị na Jehova ga-ata ndị bi na Jeruselem hapụrụ Jehova fewe arụsị ahụhụ. Ma, o nyekwaara ndị a dọọrọ n’agha bi na Babịlọn aka ka ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma, ka ha nwee ike ịrụrụ ya ọrụ n’ọdịnihu. Ha nọchaa afọ iri asaa na Babịlọn, Jehova ga-akpọrọ ụfọdụ n’ime ha kpọghachi n’ala Izrel. (Ezik. 36:7-11) Ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụ na ụmụ ụmụ ndị ahụ gere Ezikiel ntị. Ihe ndị e kwuru n’isiokwu ndị ọzọ dị ná Nkebi nke 3 n’akwụkwọ a gosiri na Ezikiel ziri ndị Izrel ozi ọma, mee ka o doo anya na a ga-eme ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe na Jeruselem.
17. Olee mgbe Jehova na-ahọpụta ndị nche?
17 Jehova ji ndị amụma ndị a gwa ndị ya okwu tupu e bibie Jeruselem n’afọ 607 T.O.N.K. Ma, ọ̀ bụ naanị ha bụ ndị Jehova họpụtara ka ha rụọ ọrụ ndị nche? Mba. Mgbe ọ bụla Jehova chọrọ imezu ihe gbara ọkpụrụkpụ o bu n’uche ime, ọ na-ebu ụzọ họpụta ndị nche ga-adọ ndị ajọ omume aka ná ntị ma zie ndị mmadụ ozi ọma.
Ndị Nche E Nwere n’Ihe Dị Ka Puku Afọ Abụọ Gara Aga
18. Olee ọrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim rụrụ?
18 N’ihe dị ka puku afọ abụọ (2,000) gara aga, Jọn Onye Na-eme Baptizim rụrụ ọrụ onye nche. Ọ dọrọ ndị Juu aka ná ntị na Chineke ga-ajụ ha n’oge na-adịghị anya ma ọ bụrụ na ha echegharịghị. (Mat. 3:1, 2, 9-11) Ma, ọ bụghị naanị ya bụ ihe o mere. Jizọs sịrị na ọ bụ Jọn bụ “onye ozi” e buru n’amụma, onye ga-edoziri Mezaya ụzọ. (Mal. 3:1; Mat. 11:7-10) Ihe so n’ọrụ a ọ rụrụ bụ izi ozi ọma na “Nwa Atụrụ Chineke,” bụ́ Jizọs, abịala nakwa na ọ ga-ewepụ “mmehie nke ụwa.”—Jọn 1:29, 30.
19, 20. Olee otú Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya si rụọ ọrụ ndị nche?
19 Ọ bụ Jizọs bụ onye kachanụ n’ime ndị niile Chineke họpụtara ka ha bụrụ ndị nche. Jehova zigara ya ka ọ gaa dọọ “ndị Izrel” aka ná ntị, otú o zigara Ezikiel. (Ezik. 3:17; Mat. 15:24) Jizọs dọrọ ndị Izrel aka ná ntị na n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ajụ ha nakwa na a ga-ebibi Jeruselem. (Mat. 23:37, 38; 24:1, 2; Luk 21:20-24) Ma, ozi kacha mkpa Jizọs ziri bụ ozi ọma.—Luk 4:17-21.
20 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya hoo haa, sị: “Na-echenụ nche.” (Mat. 24:42) Ha rubeere Jizọs isi ma rụọ ọrụ ndị nche. Ha nọ na-adọ ndị Juu aka ná ntị na Jehova ga-ajụ mba Izrel ma bibie obodo ha bụ́ Jeruselem. (Rom 9:6-8; Gal. 4:25, 26) Ha zisakwara ozi ọma, otú ndị nche bu ha ụzọ mere. Otu n’ime ozi ha zisara bụ ozi pụrụ iche, ya bụ, na ndị Jentaịl nweziri ike iso n’Izrel nke Chineke e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, sorokwa Kraịst mee ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe n’ụwa.—Ọrụ 15:14; Gal. 6:15, 16; Mkpu. 5:9, 10.
21. Olee ọrụ e ji ama atụ Pọl rụrụ?
21 N’ime ndị a họpụtara ka ha bụrụ ndị nche n’ihe dị ka puku afọ abụọ (2,000) gara aga, Pọl onyeozi bụ onye e ji ama atụ. O ji ọrụ e nyere ya kpọrọ ihe. Ọ ma na ikpe ọbara ga-ama ya ma ọ bụrụ na ọ rụghị ọrụ a e nyere ya, otú ahụ Ezikiel makwa. (Ọrụ 20:26, 27) Pọl dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị, zisaakwa ozi ọma, otú ndị nche ndị ọzọ mere. (Ọrụ 15:35; Rom 1:1-4) N’eziokwu, o si n’ike mmụọ nsọ kwuo ihe Aịzaya buru n’amụma, sị: “Ụkwụ onye si n’elu ugwu ziri ozi ọma na-abịa mara ezigbo mma.” Pọl kwuru na ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke ndị na-eso ụzọ Kraịst na-arụ na-emezu amụma a.—Aịza. 52:7, 8; Rom 10:13-15.
22. Gịnị mere mgbe ndịozi Jizọs nwụchara?
22 Mgbe ndịozi Jizọs nwụchara, ọtụtụ ndị kwụsịrị iso ụzọ Kraịst, gbawazie ihe a na-eme n’ọgbakọ Ndị Kraịst ụkwụ, otú e buru ya n’amụma. (Ọrụ 20:29, 30; 2 Tesa. 2:3-8) Ruo ọtụtụ afọ, Ndị Kraịst adịgboroja, ndị yiri ata, bịara dị nnọọ ọtụtụ karịa ezigbo Ndị Kraịst, ndị yiri ọka wit. Ihe a meziri ka a na-akụziri ndị mmadụ ozizi ụgha, kama izi ha ozi ọma Alaeze Chineke. (Mat. 13:36-43) Ma, mgbe oge ruru ka Jehova mee ka a maliteghachi ife ya ezigbo ofufe, ọ họpụtakwara ndị nche ọzọ ga-adọ ndị mmadụ aka ná ntị ma zie ha ozi ọma. Ihe a gosiri na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya, na-ekpekwa ikpe ziri ezi. Ole ndị bụ ndị nche ọ họpụtara?
Jehova Họpụtara Ndị Nche Ọzọ Ka Ha Dọọ Ndị Ajọ Omume Aka ná Ntị
23. Olee ọrụ C. T. Russell na ndị ya na ha rụkọrọ ọrụ rụrụ?
23 Afọ ole na ole tupu afọ 1914, Charles Taze Russell na ndị ya na ha rụkọrọ ọrụ rụrụ ọrụ ka “onye ozi” nke ‘ga-edozi ụzọ’ tupu Alaeze Mezaya amalite ịchị. b (Mal. 3:1) Ha rụkwara ọrụ ndị nche. Ha ji magazin bụ́ Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence dọọ ndị mmadụ aka ná ntị gbasara ikpe Chineke ga-ekpe ha, zisaakwa ozi ọma Alaeze Chineke.
24. (a) Olee otú ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi si rụọ ọrụ onye nche? (b) Gịnị ka ị mụtara n’aka ndị rụrụ ọrụ ndị nche n’oge gara aga? (Gụọ chaatị isiokwu ya bụ “Ụfọdụ Ndị Nche E Ji Ama Atụ.”)
24 Mgbe Alaeze ahụ maliterela ịchị n’eluigwe, Jizọs họpụtara ụmụ nwoke ole na ole ka ha bụrụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. (Mat. 24:45-47) Kemgbe ahụ, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye a na-akpọkwa Òtù Na-achị Isi ugbu a, na-arụ ọrụ onye nche. Ohu a na-ebute ụzọ n’ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị gbasara “ụbọchị Chineke anyị ga-akwụ ndị iro ya ụgwọ.” Ọ na-ekwusakwa “afọ Jehova na-emere ndị mmadụ amara.”—Aịza. 61:2; i nwere ike ịgụ 2 Ndị Kọrịnt 6:1, 2.
25, 26. (a) Olee ọrụ ndị niile na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ịrụ, oleekwa otú ha si arụ ya? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’Isi nke 12?
25 Ọ bụ eziokwu na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ebute ụzọ n’ịrụ ọrụ nche, Jizọs nyere ndị “niile” na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Na-echenụ nche.” (Mak 13:33-37) Anyị na-erube isi n’iwu a ma ọ bụrụ na anyị mụrụ anya n’ihe gbasara ofufe anyị na-efe Jehova ma jiri obi anyị niile na-akwado ohu ahụ na-arụ ọrụ nche n’oge anyị a. Anyị na-egosi na anyị mụ anya ma anyị na-arụ ọrụ ikwusa ozi ọma e nyere anyị. (2 Tim. 4:2) Gịnị mere anyị ji arụ ya? Otu ihe mere ya bụ na anyị chọrọ ịzọ ndị mmadụ ndụ. (1 Tim. 4:16) N’oge na-adịghị anya, ọtụtụ ndị ga-anwụ maka na ha egeghị ntị n’aka ná ntị onye na-eche nche n’oge a na-adọ ha. (Ezik. 3:19) Ma, isi ihe mere anyị ji ezi ozi ọma bụ na ọ na-agụ anyị agụụ izi ndị mmadụ ozi na-eme obi ụtọ, ya bụ, na a maliteghachila ife Chineke ezigbo ofufe. Oge a bụ “afọ Jehova na-emere ndị mmadụ amara.” Ọtụtụ ndị ka nwere ike iso anyị fewe Jehova Chineke anyị, Onye hụrụ anyị n’anya ma na-ekpe ikpe ziri ezi. N’oge na-adịghị anya, ọchịchị Ọkpara Chineke, bụ́ Kraịst Jizọs, ga-abara ndị niile ga-afọ ndụ n’ụwa mgbe a ga-ebibi ụwa Setan uru. Jizọs ga-emere ndị niile ọ ga-achị ebere. N’ihi ya, ka anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma, si otú a na-enyere ndị na-arụ ọrụ onye nche n’oge a aka.—Mat. 24:14.
26 Jehova arụọla ọrụ ebube mee ka ndị ya dịrị n’otu n’ụwa Setan a. N’Isi nke 12, anyị ga-eleba anya n’otu amụma nke kwuru gbasara osisi abụọ. E ji amụma a gosi otú Jehova si mee ka ndị ya dịrị n’otu.
a Okwu bụ́ “ọdachi” gbara ihe karịrị ugboro iri ise n’akwụkwọ Jeremaya.
b A kọwara amụma a na otú o si mezuo n’akwụkwọ Alaeze Chineke Amalitela Ịchị, n’isi nke 2, nke isiokwu ya bụ “Alaeze Chineke Amalitela Ịchị n’Eluigwe.”