NKEBI NKE 14
Olee Otú Ị Ga-esi Gosi na Ị Na-erubere Jehova Isi?
Na-akwado Chineke. 1 Pita 5:6-9
Emela omenala ndị Baịbụl na-akwadoghị. Iji zere ime omenala ndị ahụ, ị ga-enwe obi ike.
Etinyela aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo; ọ dịghị akwado Jehova na Alaeze ya.
Matiu 7:24, 25
Mee mkpebi ga-akacha abara gị uru, ya bụ, gee Chineke ntị.Gị na Ndịàmà Jehova na-akpa; ha ga-enyere gị aka ịbịaru Chineke nso.
Nọgide na-amụ banyere Chineke. Jisiekwa ike na-edebe iwu ya.
Ọ bụrụ na okwukwe gị sie ike, i kwesịrị inyefe Jehova onwe gị, e meekwa gị baptizim.—Matiu 28:19.
Gee Chineke ntị. Na-agụ Baịbụl, gwakwa Ndịàmà Jehova ka ha nyere gị aka ka ị ghọta Baịbụl. Na-emekwa ihe ị na-amụta. Ọ bụrụ na i mee ihe ndị ị mụtara, ị ga-adị ndụ ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:29.