IHE ỌMỤMỤ NKE 1
Okwu Mmeghe Na-adọrọ Mmasị
Ọrụ Ndịozi 17:22
IHE Ị GA-EME: Okwu mmeghe gị kwesịrị ịdọrọ mmasị ndị ị na-agwa okwu, mee ka ihe ị na-ekwu doo anya, meekwa ka ha ghọta otú ọ ga-esi baara ha uru.
OTÚ Ị GA-ESI EME YA:
-
Dọta mmasị ha. Chọta ajụjụ, okwu, ihe ndị mere eme ma ọ bụkwanụ ihe ndị gbara n’akwụkwọ akụkọ ga-amasị ndị ị na-agwa okwu.
-
Mee ka ihe ị na-ekwu doo anya. Gbaa mbọ ka okwu mmeghe gị mee ka ndị ị na-agwa okwu mata ihe ị na-ekwu nakwa ihe mere i ji ekwu ya.
-
Gosi ihe mere ihe ị na-ekwu ji baa uru. Mee ka ihe ị na-ekwu daba n’ihe ndị ị chọpụtara gbasara ndị ị na-agwa okwu. Ha kwesịrị ịghọta otú ihe ị na-agwa ha ga-esi baara ha uru.