Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 20

Ọrụ Ebube nke Abụọ Jizọs Nọ na Kena Rụọ

Ọrụ Ebube nke Abụọ Jizọs Nọ na Kena Rụọ

MAK 1:14, 15 LUK 4:14, 15 JỌN 4:43-54

  • JIZỌS NA-EKWUSA NA ‘ALAEZE CHINEKE ERUWO NSO’

  • JIZỌS ANỌRỌ EBE DỊ ANYA GWỌỌ OTU NWATA NWOKE

Mgbe Jizọs nọchara ihe dị ka abalị abụọ na Sameria, ọ gawara obodo ya. O kwusaala ozi ọma ogologo oge na Judia. Ma, ọ naghị alaghachi Galili ịga zuru ike. Kama, o bidoro ikwusasi ozi ọma ike n’obodo a ọ nọ tolite karịadị otú o mere na Judia. Ọ ga-abụ na ọ tụghị anya na ndị obodo ya ga-anabata ya, n’ihi na dị ka o kwuru, “onye amụma adịghị enwe nsọpụrụ n’obodo nke ya.” (Jọn 4:44) Ndị na-eso ụzọ Jizọs laghachiri n’ụlọ ha nakwa n’ọrụ ha na-arụbu kama isoro ya.

Olee ozi Jizọs malitere izisa? Ọ bụ: “Alaeze Chineke eruwokwa nso. Chegharịanụ, kwerekwanụ n’ozi ọma ahụ.” (Mak 1:15) Gịnị ka ndị mmadụ mere mgbe ha nụrụ ozi a? N’eziokwu, ọtụtụ ndị Galili sọpụụrụ Jizọs, nabatakwa ozi ya. Ọ bụghị naanị ozi ọ na-ezi mere ha ji sọpụrụ ya. Ọnwa ole na ole gara aga, ụfọdụ ndị si Galili bịara Ememme Ngabiga e mere na Jeruselem, ha hụkwara ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ.—Jọn 2:23.

Olee ebe Jizọs malitere ozi dị ukwuu o zisara na Galili? O nwere ike ịbụ na Kena, bụ́ ebe o mere mmiri ya aghọọ mmanya n’otu oriri agbamakwụkwọ. Na nke ugbu a ọ nọ na Kena, ọ nụrụ na e nwere nwatakịrị ahụ́ na-enye ezigbo nsogbu nke na ọ chọrọ ịnwụ anwụ. Ọ bụ nwa otu onye ọchịchị na-arụrụ Herọd Antipas ọrụ. Herọd Antipas bụ eze ahụ mechara ziga ndị gbupụrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim isi. Onye ọchịchị a nụrụ na Jizọs esila na Judia gawa Kena. N’ihi ya, nwoke a si n’ụlọ ya dị na Kapaniọm gaa Kena ịchọ Jizọs. Onye ọchịchị a nọ ná mwute sịrị Jizọs: “Onyenwe anyị, bịa tupu obere nwa m anwụọ.”—Jọn 4:49.

Ọ ga-abụ na ihe Jizọs zara ya tụrụ ya n’anya. Jizọs sịrị ya: “Lawa, nwa gị agbakeela.” (Jọn 4:50) Nwoke ahụ kwetara ihe Jizọs kwuru ma lawa. Mgbe ọ na-ala, ya na ndị odibo ya zuru n’ụzọ. Ha gba na-abịa ka ha kọọrọ ya ihe ọma merenụ. Ha kọọrọ ya na nwa ya agbakeela. Nwoke ahụ chọrọ ịma mgbe o mere. Ọ jụrụ ha, sị: ‘Ole mgbe ọ gbakere?’

Ha zara ya, sị: “Ọ bụ ụnyaahụ, n’awa nke asaa, ka ahụ́ ọkụ ahụ hapụrụ ya.”—Jọn 4:52.

Nwoke ahụ matara na ọ bụ kpọmkwem mgbe ahụ Jizọs sịrị ya, “Nwa gị agbakeela.” Nwoke a, bụ́ onye bara ezigbo ọgaranya ruo na nke inwe ọtụtụ ndị odibo, na ezinụlọ ya niile ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst.

Kena si otú a bụrụ ebe Jizọs rụrụ ọrụ ebube abụọ. Na nke mbụ, o mere mmiri ya aghọọ mmanya, na nke abụọ, ya anọrọ na Kena gwọọ nwata nwoke nọ ebe dị anya, ihe dị ka kilomita iri abụọ na ise. Ma, ọrụ ebube abụọ a abụghị naanị ọrụ ebube Jizọs rụrụ. Mana ọrụ ebube nke a pụrụ iche n’ihi na o gosiri na ọ lọghachila Galili. A naghịkwa agbagha ya agbagha na ọ bụ onye amụma Chineke họpụtara. Mana, olee otú a ‘ga-asọpụruru onye amụma a n’obodo nke ya’?

Anyị ga-amata mgbe Jizọs ruru n’obodo ya bụ́ Nazaret, bụ́ ebe ọ na-achọ ịga ugbu a. Gịnị ga-eme ya ebe ahụ?