ISI NKE 79
Ihe Mere A Ga-eji Bibie Ndị Juu Na-ekweghị na Jizọs
-
JIZỌS EJIRI IHE MBEREDE ABỤỌ MERENỤ KỤZIE IHE
-
JIZỌS AGWỌỌ NWAANYỊ HUURU EHURU N’ỤBỌCHỊ IZU IKE
Jizọs esila ụzọ dị iche iche gbalịa ime ka ndị ọ na-agwa okwu chebara otú Chineke si ele ha anya echiche. Ohere ọzọ dapụtara ka o meekwa otú ahụ n’oge ọ gwachara ndị mmadụ okwu n’èzí ụlọ onye Farisii.
Ụfọdụ n’ime ha kọọrọ ya otu ọdachi merenụ. Ha gwara ya banyere “ndị Galili [Gọvanọ Pọntiọs] Paịlet gwakọtara ọbara ha n’àjà ha.” (Luk 13:1) Olee ndị Galili ha na-ekwu okwu ha?
Ndị Galili ahụ nwere ike ịbụ ndị e gburu mgbe ọtụtụ puku ndị Juu malitere ime aghara. Ihe kpatara ya bụ na Paịlet weere ego n’ebe a na-edebe ego n’ụlọ nsọ ma jiri ya rụọ ọwa mmiri, mmiri ga-esi na-abata na Jeruselem. Ọ ga-abụ na ndị na-ahụ maka ego ahụ nyere Paịlet ikike ka o were ya. Ndị na-akọrọ Jizọs akụkọ a nwere ike iche na ihe mere ndị Galili ahụ ji nwụọ bụ maka ihe ọjọọ ha mere. Ma, Jizọs ekwetaghị na ọ bụ ya kpatara ya.
Ọ jụrụ ha, sị: “Ùnu chere na ndị Galili a bụ ndị mmehie karịa ndị Galili ọzọ niile n’ihi na ihe ndị a dakwasịrị ha?” Ọ zara ha mba. O jizi ihe ahụ merenụ dọọ ndị Juu aka ná ntị, sị: “Ọ gwụla ma ùnu chegharịrị, a ga-ebibi unu niile n’otu aka ahụ.” (Luk 13:2, 3) Jizọs kwuru banyere ọdachi ọzọ nwere ike ịbụ na o mere n’oge na-adịbeghị anya. Ọ ga-abụ na ihe kpatara ya bụ ọwa mmiri ahụ Paịlet na-arụ. Jizọs jụrụ ha, sị:
“Ùnu chere na mmadụ iri na asatọ ahụ ụlọ elu dị na Siloam dagburu bụ ndị mmehie karịa ndị ọzọ niile bi na Jeruselem?” (Luk 13:4) Ìgwè mmadụ a Jizọs na-agwa okwu nwere ike iche na ọ bụ ihe ndị ahụ metara gburu ha. Ma, Jizọs ekwetaghị. Ọ ma na “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya” nwere ike ịdabara mmadụ. Ọ ga-abụkwa ya mere ọdachi ahụ ji mee. (Ekliziastis 9:11) Ma, ndị mmadụ kwesịrị isi n’ihe ahụ merenụ mụta ihe. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu echegharịghị, a ga-ebibi unu niile n’otu ụzọ ahụ.” (Luk 13:5) Gịnị mere Jizọs ji na-akụzi ihe a ugbu a?
Ọ bụ n’ihi na o teela o jewere ozi ya. O mekwara ihe atụ iji gosi nke a. Ọ sịrị: “Otu onye nwere osisi fig a kụrụ n’ubi vaịn ya, o wee bịa na-achọgharị mkpụrụ na ya, ma ọ dịghị nke ọ hụrụ. O wee gwa onye ọrụ ubi vaịn ahụ, sị, ‘Ihe a bụ afọ atọ m nọ na-abịa na-achọ mkpụrụ n’osisi fig a, ma ọ dịghị nke m hụrụ. Gbutuo ya! Gịnị mere ọ ga-eji mee ka ala a ghara ịba uru?’ Ọ zara ya, sị, ‘Nna m ukwu, hapụkwuo ya afọ a, ruo mgbe m ga-egwu ala gburugburu ya ma tinye nsị anụ; ọ bụrụkwa na o mechaa mịa mkpụrụ n’ọdịnihu, nke ahụ amaka; ma ọ bụrụ na ọ mịghị, gị egbutuo ya.’”—Luk 13:6-9.
Ọ karịala afọ atọ Jizọs gbalịwara ime ka ndị Juu nwee okwukwe. Ma, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ bụkwa naanị ha nabatara ozi ọma ya. Ugbu a Jizọs banyere n’afọ nke anọ ọ na-ekwusa ozi ọma, ọ gbasikwuru mbọ ike kwusaa ya na Judia na Peria, kụziekwara ndị mmadụ ihe n’ebe ndị a. Ihe a o mere yiri igwu ala gburugburu osisi fig ma tinye ya nsị anụ. Olee uru mbọ niile Jizọs gbara bara? Naanị ndị Juu ole na ole nabatara ozi ọma ya. Ọtụtụ n’ime ha jụrụ ichegharị, si otú ahụ bụrụ ndị a ga-ebibi.
Ihe mechara mee n’otu Ụbọchị Izu Ike gosiri n’eziokwu na ọtụtụ ndị Juu anabataghị ozi ọma Jizọs kwusara. N’ụbọchị ahụ, Jizọs nọ na-akụzi ihe n’otu ụlọ nzukọ ndị Juu. Ka ọ na-akụzi ihe, Luk 13:12) Jizọs bikwasịrị ya aka, ya agbatịa n’otu ntabi anya ma malite ito Chineke.
ọ hụrụ otu nwaanyị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu. Nwaanyị ahụ na-ehuru ehuru kemgbe afọ iri na asatọ. Jizọs meteere nwaanyị ahụ ebere ma gwa ya, sị: “Nwaanyị, a tọhapụwo gị n’adịghị ike gị.” (Ihe a Jizọs mere were onyeisi oche ụlọ nzukọ ahụ iwe, ya agwa ìgwè mmadụ nọ ebe ahụ, sị: “E nwere ụbọchị isii e kwesịrị ịrụ ọrụ n’ime ha; ya mere, bịanụ n’ụbọchị ndị ahụ ka a gwọọ unu, ọ bụghị n’ụbọchị izu ike.” (Luk 13:14) Onyeisi oche a anaghị ekwu na Jizọs enweghị ikike ịgwọ ọrịa, kama, ọ nọ na-akatọ ìgwè mmadụ ahụ maka na ha bịara n’Ụbọchị Izu Ike ka a gwọọ ha. Ihe a o kwuru mere ka Jizọs gwa ya, sị: “Ndị ihu abụọ, ọ̀ dị onye ọ bụla n’ime unu nke na-adịghị atọpụ ehi ya ma ọ bụ ịnyịnya ibu ya n’ụlọ anụ n’ụbọchị izu ike ma kpụrụ ya gaa ka o nye ya mmiri? Ya mere, nwaanyị a bụ́ nwa Ebreham, onye Setan kere agbụ ruo afọ iri na asatọ, ọ̀ bụ na o kwesịghị ka a tọpụ ya agbụ a n’ụbọchị izu ike?”—Luk 13:15, 16.
Mgbe Jizọs kwuru ihe ndị a, ihere mere ndị niile na-emegide ya, ma ìgwè mmadụ nọ ebe ahụ ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ihe ndị dị ebube ha hụrụ Jizọs na-eme. Ugbu a Jizọs nọ na Judia, o meghachiri ihe atụ abụọ o meburu banyere Alaeze eluigwe. O mere ihe atụ ndị ahụ mgbe ọ nọ n’ụgbọ mmiri n’Oké Osimiri Galili.—Matiu 13:31-33; Luk 13:18-21.