ISI NKE 13
Otú Okpukpe Ụgha Si Emechu Chineke Ihu
Ọ bụrụ na Chineke bụ ịhụnanya, gịnị mere ọtụtụ okpukpe, ndị na-ekwu na ha na-anọchite anya ya ji akpa àgwà ọjọọ dị iche iche? Ihe ọ pụtara bụ na okpukpe ndị ahụ bụ okpukpe ụgha. Ha na-ete aha ya unyi. Olee otú ha si na-ete aha ya unyi? Olee otú obi dị Chineke gbasara ya? Gịnịkwa ka ọ ga-eme gbasara ya?
1. Olee otú okpukpe ụgha si eji ihe ọ na-akụzi emechu Chineke ihu?
Okpukpe ụgha ejirila “eziokwu nke Chineke gbanwere okwu ụgha.” (Ndị Rom 1:25) Dị ka ihe atụ, ọtụtụ okpukpe anaghị akụziri ndị òtù ha ihe bụ́ aha Chineke. Ma, Baịbụl kwuru na anyị ga na-akpọ Chineke aha ya. (Ndị Rom 10:13, 14) Ọ na-abụ ihe ọjọọ mee mmadụ, ụfọdụ ndị isi okpukpe asị na ọ bụ uche Chineke. Ma, ihe a ha na-ekwu bụ ụgha chara acha. Ọ bụghị Chineke na-akpata ihe ọjọọ. (Gụọ Jems 1:13.) Ma, ihe a na-abụghị eziokwu okpukpe dị iche iche na-akụzi emeela ka ọtụtụ ndị na-agbara Chineke ọsọ.
2. Olee otú àgwà ndị okpukpe ụgha na-akpa si emechu Chineke ihu?
Otú ndị okpukpe ụgha si emeso ndị mmadụ ihe dị iche n’otú Jehova si emeso ha. Baịbụl kwuru na mmehie ndị okpukpe na-eme “karịrị akarị.” (Mkpughe 18:5) Kemgbe ọtụtụ narị afọ, okpukpe ụgha na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-akwado agha dị iche iche a na-alụ n’ụwa. Ha akpatakwala ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ ma ọ bụkwanụ kwado ka e gbuo ha. Ụfọdụ ndị isi okpukpe na-anakwa ndị okpukpe ha ụtụ ka ha were ya na-ebi ndụ okomoko. Ihe ndị a niile na-egosi na ha amaghị Chineke nakwa na ha anaghị anọchite anya ya.—Gụọ 1 Jọn 4:8.
3. Olee otú ihe okpukpe ugha na-eme na-adị Chineke?
Ọ bụrụ na ihe ndị okpukpe ụgha na-eme na-ewe gị iwe, oleezi otú i chere obi ga-adị Jehova? Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya, ma, àgwà ndị isi okpukpe, ndị na-emechu ya ihu, na-emegbukwa ndị okpukpe ha, na-ewute ya. O kwuru na a ga-ebibi okpukpe ụgha nakwa na “a gaghịzi ahụ ya ọzọ.” (Mkpughe 18:21) N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ebibi okpukpe ụgha niile kpamkpam.—Mkpughe 18:8.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụtakwuo otú ihe okpukpe ugha na-eme na-adị Chineke. Chọpụtakwa ihe ọjọọ ndị ọzọ okpukpe ụgha merela nakwa ihe mere ihe ndị a ha mere ekwesịghị ime ka ị ghara ịmatakwu Jehova.
4. Chineke anaghị anabata okpukpe niile
Ọtụtụ ndị na-ekwu na okpukpe dị iche iche dị ka ọtụtụ ụzọ e si agakwuru Chineke. Ma, ihe a ha na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu? Gụọnụ Matiu 7:13, 14. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara okporo ụzọ na-eduba ná ndụ?
Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Baịbụl ò kwuru na Chineke na-anabata ọtụtụ okpukpe?
5. Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya, ma, okpukpe ụgha ahụghị ha n’anya
E nwere ọtụtụ ụzọ okpukpe ụgha si emechu Chineke ihu. Otu n’ime ụzọ jọgburu onwe ya bụna ha na-etinye aka n’ịlụ agha. Unu chọọ ịhụ otu n’ime mgbe ha tinyere aka n’ịlụ agha, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Gịnị ka ọtụtụ chọọchị mere mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ?
-
Olee otú obi dị gị gbasara ihe ndị ahụ ha mere?
Gụọnụ Jọn 13:34, 35 na 17:16. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
-
Olee otú ọ ga-abụrịrị na obi na-adị Jehova ma ndị okpukpe na-etinye aka n’ịlụ agha?
-
Ọ bụ okpukpe ụgha na-akpata ọtụtụ ihe ọjọọ na-eme n’ụwa. Olee ihe ndị ị na-ahụ ndị okpukpe na-eme ndị gosiri na ha ahụghị ndị mmadụ n’anya otú Chineke hụrụ ha?
6. Chineke chọrọ inyere ndị mmadụ aka ka ha si n’okpukpe ụgha pụta
Gụọnụ Mkpughe 18:4. a Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Olee otú obi dị gị ugbu a ị matara na Chineke chọrọ ịnapụta ndị okpukpe ụgha duhierela?
7. Akwụsịla ịmụ gbasara ezi Chineke
Otú ndị okpukpe ụgha sị akpa àgwà ò kwesịrị ime ka i lewe Chineke anya ọjọọ? Chegodị gbasara nwatakịrị jụrụ ịna-eme ọmarịcha ihe ndị nna ya gwara ya na-eme. Nwatakịrị ahụ mechara si n’ụlọ ha pụọ, ma malite ibi ndụ ọjọọ. Ụdị ndụ ọ na-ebi adịghị nna ya mma. Gịnị mere na ọ dịghị mma mmadụ ikwu na ọ bụ nna ya mere nwatakịrị ahụ ji akpa àgwà ọjọọ?
-
Ọ̀ dị mma mmadụ ikwu na ọ bụ Jehova mere ndị okpukpe ụgha ji akpa àgwà ọjọọ dị iche iche ha na-akpa ma ọ bụkwanụ mmadụ iji maka ya kwụsị ịmụ gbasara Jehova?
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na e nweghị ihe gbasara ha na Chineke n’ihi na ọ bụ okpukpe na-akpata ọtụtụ nsogbu dị n’ụwa.
-
Ì kwetara ihe a ha na-ekwu?
-
Gịnị mere na àgwà ọjọọ ndị okpukpe ụgha na-akpa ekwesịghị ime ka anyị lewe Jehova anya ọjọọ?
NCHỊKỌTA
Okpukpe ụgha na-emechu Chineke ihu n’ihi ihe ndị na-abụghị eziokwu ha na-akụziri ndị mmadụ nakwa n’ihi àgwà ọjọọ ha na-akpa. Chineke ga-ebibi okpukpe ụgha.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
-
Olee otú obi dị gị n’ihi ihe dị iche iche na-abụghị eziokwu okpukpe ụgha na-akụzi nakwa n’ihi otú ha si akpa àgwà?
-
Olee otú ihe okpukpe ugha na-eme na-adị Jehova?
-
Gịnị ka Chineke ga-eme okpukpe ụgha?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe abụọ mere na Chineke anaghị anabata ọtụtụ okpukpe.
Gịnị mere Jehova ji chọọ ka anyị na ndị ọzọ na-ezukọ na-efe ya?
“Mmadụ Ò Kwesịrị Inwe Okpukpe Ọ Nọ na Ya?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)
Obi nọ na-ajọ otu ụkọchukwu njọ n’ihi ihe ndị okpukpe ya na-eme. Ma, ihe a emeghị ka ọ ghara ịmụta ihe ndị bụ́ eziokwu gbasara Chineke.
“Ihe Mere Otu Ụkọchukwu Ji Hapụ Chọọchị Ya” (Teta!, Febụwarị 2015)
Kemgbe ụwa, okpukpe na-akụzi ụgha ndị na-eme ka a na-agbara Chineke ọsọ ma na-ele ya anya ka onye ọjọọ. Chọpụta nke bụ́ eziokwu n’ụgha atọ ha na-akụzi.
“Gịnị Mere O Ji Esiri Ụfọdụ Ndị Ike Ịhụ Chineke n’Anya?” (Ụlọ Nche, Nọvemba 1, 2013)
a Unu chọọ ịma otú anyị si mara na ọ bụ okpukpe ụgha bụ nwaanyị ahụ Baịbụl kpọrọ Babịlọn ukwu ahụ, gụọnụ Ihe nke 1 E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A.