ISIOKWU NKE 4
Otú Unu Ga-esi Hazie Ihe Unu Na-eji Ego Unu Eme
“A na-eji ndụmọdụ eme ka atụmatụ guzosie ike.”—Ilu 20:18
Ọ bụ ego ka anyị ji egbo mkpa ezinụlọ anyị. (Ilu 30:8) A sị ka e kwuwe, “ego bụ ihe nchebe.” (Ekliziastis 7:12) Ma, ọ na-esekarịrị ụfọdụ di na nwunye okwu. N’ihi ya, ekwela ka o seere unu okwu. (Ndị Efesọs 4:32) Di na nwunye kwesịrị ịtụkwasị ibe ha obi, na-akparịtakwa ihe ndị ha ga-eji ego ha na-eme.
1 KPEBIENỤ IHE UNU GA-AZỤ NA IHE UNU NA-AGAGHỊ AZỤ
IHE BAỊBỤL KWURU: “Ọ̀ dị onye n’ime unu nke chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka o wee hụ ma ò nwere ihe ga-ezu iji wuchaa ya?” (Luk 14:28) Unu abụọ kwesịrị ịnọkọ kpaa ihe ndị unu ga-azụ na ihe ndị unu na-agaghị azụ. (Emọs 3:3) Kpebienụ ihe ndị dị unu mkpa unu kwesịrị ịzụ nakwa ego ole unu ga-eji azụ ha. (Ilu 31:16) Ọ bụghị ihe ọ bụla unu hụrụ, unu azụrụ n’ihi na unu nwere ego ya. Gbalịanụ ka unu ghara ịna-eji ụgwọ. Na-ekonyekwanụ akpa unu ebe aka unu ga-eru.—Ilu 21:5; 22:7.
IHE I NWERE IKE IME:
-
Ọ bụrụ na unu emechaa ihe unu kwesịrị iji ego eme n’ọnwa, ego aka fọ unu n’aka, kpebienụ ihe unu ga-eji ya eme
-
Unu mechaa ihe ndị ahụ ma jiri ụgwọ, kwuonụ otú unu ga-esi wetulata aka n’ego unu na-emefu. Dị ka ihe atụ, unu nwere ike iji aka unu na-esi ihe unu na-eri kama ịna-eri nri ahịa
2 NA-AGWANỤ IBE UNU OTÚ EGO UNU SI AGA
IHE BAỊBỤL KWURU: Na-eme ihe niile n’eziokwu, “ọ bụghị naanị n’anya Jehova, kamakwa n’anya ụmụ mmadụ.” (2 Ndị Kọrịnt 8:21) Na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ego ole na-abata gị n’aka nakwa ego ole ị na-emefu.
Mgbe ọ bụla ị chọrọ ime ihe ga-eri gị nnukwu ego, mee ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mara. (Ilu 13:10) Ọ bụrụ na ọ mara otú gị na ego si na-aga, ihe gbasara ego agaghị na-esere unu okwu. Echefula na ego ọ bụla batara gị n’aka abụghị ego gị, kama, ọ bụ ego unu.—1 Timoti 5:8.
IHE I NWERE IKE IME:
-
Kpaanụ ego ole onye ọ bụla n’ime unu nwere ike iji zụọ ihe n’agwaghị onye nke ọzọ
-
Ọ bụghị mgbe ego seere unu okwu ka unu ga-ekpebi ihe unu ga na-eme. Unu kwesịrị ibu ụzọ hazie nke ga-aga ebe ọ ga-aga