Ọnụ Ọgụgụ 17:1-13
-
Mkpara Erọn wara okooko (1-13)
17 Jehova gwaziri Mosis, sị:
2 “Gwa ndị Izrel okwu, natakwa ha otu mkpara maka otu ọnụmara. Onyeisi ọnụmara nke ọ bụla ga-eweta otu mkpara.+ Mkpara niile ị ga-anata ga-adị iri na abụọ. Ị ga-ede aha onyeisi nke ọ bụla na mkpara ya.
3 Ị ga-ede aha Erọn na mkpara ebo Livaị n’ihi na ọ bụ otu mkpara ka a ga-eweta maka onyeisi ọnụmara nke ọ bụla.
4 Chịsa mkpara ndị ahụ n’ụlọikwuu nzute, n’ihu igbe ọgbụgba ndụ,*+ bụ́ ebe m na-apụta n’ihu unu mgbe niile.+
5 Mkpara onye m ga-ahọrọ+ ga-awa okooko. M ga-emekwa ka ndị Izrel kwụsị ịkatọ m,*+ ka ha kwụsịkwa ịkatọ unu.”+
6 Mosis wee gwa ndị Izrel okwu. Ndị isi ha niile wee nye ya mkpara. Otu mkpara maka onyeisi ọnụmara nke ọ bụla, ya bụ, mkpara iri na abụọ. Mkpara Erọn so na mkpara ndị ahụ.
7 Mosis chịsaziri mkpara ndị ahụ n’ihu Jehova, n’ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya.*
8 N’echi ya, mgbe Mosis banyere n’ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya,* mkpara Erọn, nke bụ́ maka ụlọ Livaị, amaala ifuru, gbawaa, malite ịwa okooko, na-amịpụtakwa mkpụrụ almọnd ndị chara acha.
9 Mosis wee si n’ihu Jehova chịpụtara ndị Izrel niile mkpara ahụ niile. Ha lere mkpara ndị ahụ anya, onye ọ bụla ewere nke ya.
10 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Tinyeghachi mkpara Erọn+ n’ihu igbe ọgbụgba ndụ* ka ọ bụụrụ ndị a na-enupụ isi+ ihe àmà,+ ka ha kwụsị ịkatọ m,* ka ha ghara ịnwụ.”
11 Ozugbo ahụ, Mosis mere ihe Jehova nyere ya n’iwu. O mere nnọọ otú ahụ.
12 Ndị Izrel wee sị Mosis: “Ugbu a, anyị ga-anwụ. A ga-ebibi anyị. Anyị niile ga-ala n’iyi.
13 Onye ọ bụla bịadịrị ụlọikwuu Jehova nso ga-anwụ.+ Ọ̀ bụ otú a ka anyị ga-esi nwụchaa?”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Ihe Àmà.”
^ Ma ọ bụ “ịtamu ntamu n’ihi m.”
^ Na Hibru, “n’ụlọikwuu Ihe Àmà.”
^ Na Hibru, “n’ụlọikwuu Ihe Àmà.”
^ Na Hibru, “Ihe Àmà.”
^ Ma ọ bụ, “ịtamu ntamu n’ihi m.”