Ọrụ Ndịozi 13:1-52

  • E zipụrụ Banabas na Sọl ka ha gaa mba ọzọ na-ekwusa ozi ọma (1-3)

  • Mgbe ha na-ekwusa ozi ọma na Saịprọs (4-12)

  • Okwu Pọl kwuru n’Antiọk nke dị na Pisidia (13-41)

  • Jehova gwara Pọl ka ọ gaa zie ndị mba ọzọ ozi ọma (42-52)

13  E nwere ndị amụma na ndị na-akụzi ihe n’ọgbakọ dị n’Antiọk.+ Ha bụ: Banabas na Simiọn onye aha ya bụkwa Naịja, na Lushiọs onye Saịrini, na Manen onye ya na Herọd onye na-achị ógbè ahụ gụkọrọ akwụkwọ, nakwa Sọl.  Ka ha nọ na-ejere Jehova* ozi ma na-ebu ọnụ, Chineke ji mmụọ nsọ ya sị: “Kpọpụtaranụ m Banabas na Sọl+ maka na e nwere ọrụ m kpọrọ ha ka ha rụọ.”+  Mgbe ha buchara ọnụ, kpeekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka n’isi wee sị ha gaa nke ọma.  Mmadụ abụọ a Chineke ji mmụọ nsọ ya zipụ gawara Seliushia, sizie ebe ahụ banye ụgbọ mmiri bugara ha Saịprọs.  Mgbe ha ruru Salamis, ha malitere ikwusa okwu Chineke n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Jọn nọkwa na-ejere ha ozi.*+  Mgbe ha gazuru agwaetiti ahụ niile wee ruo Pefọs, ha hụrụ otu nwoke onye Juu, bụ́ dibịa afa. Aha ya bụ Baa-Jizọs. Ọ bụkwa onye amụma ụgha.  Ya na onye na-achị ebe ahụ nọ. Aha onye a bụ Sajiọs Pọlọs. Ọ bụ nwoke ma ihe. Nwoke a kpọrọ Banabas na Sọl ka ha bịa na nke ya n’ihi na ọ chọrọ ịnụ okwu Chineke.  Ma dibịa afa ahụ, onye a na-akpọkwa Elimas (nke pụtara dibịa afa), malitere inye ha nsogbu, na-achọ ime ka onye ahụ na-achị ebe ahụ ghara ikwere n’Onyenwe anyị.  Sọl, onye a na-akpọkwa Pọl, jupụtara na mmụọ nsọ, wee legidesie ya anya ike, 10  sị ya: “Gị onye ụdị aghụghọ ọ bụla na ụdị arụrụala ọ bụla juru n’obi, nwa Ekwensu,+ onye iro nke ihe niile dị mma, gịnị mere i ji akpọdo eziokwu Jehova* isi n’ala? 11  Ugbu a, Jehova* ga-ata gị ahụhụ. Ị ga-ekpu ìsì, ị gaghịkwa ahụ ìhè anyanwụ ruo nwa oge.” N’otu ntabi anya ahụ, alụlụụ na ọchịchịrị kpuchiri ya anya, ya ana-asọ ìsì na-achọ onye ga-ejide ya n’aka na-edu ya. 12  Mgbe onye ahụ na-achị ebe ahụ hụrụ ihe merenụ, ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs, n’ihi na ihe ndị ọ nụrụ gbasara Jehova* tụrụ ya n’anya. 13  Pọl na ndị ya na ha so wee banye ụgbọ mmiri na Pefọs, ya ebuga ha Paga nke dị na Pamfilia. Ma Jọn+ hapụrụ ha, laghachi Jeruselem.+ 14  Ma, ha si Paga gaa Antiọk dị na Pisidia. Ha banyekwara n’ụlọ nzukọ+ n’Ụbọchị Izu Ike nọrọ ọdụ. 15  Mgbe a gụpụtachaara ndị mmadụ Iwu Mosis+ na Akwụkwọ Ndị Amụma,* ndị isi oche ụlọ nzukọ ahụ sịrị ha: “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ga-agba anyị ume, kwuwenụ ya.” 16  Pọl wee bilie, feere mmadụ niile aka ka ha nọrọ jụụ. O wee sị: “Ndị Izrel na ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke, geenụ ntị. 17  Chineke ndị Izrel họọrọ nna nna anyị hà, meekwa ka ha bụrụ mba dị ike mgbe ha bụ ndị mbịarambịa n’Ijipt. O jikwa ike ya dị ukwuu* kpọpụta ha n’ala ahụ.+ 18  Ọ nọ na-edi omume ọjọọ ha na-eme n’ala ịkpa ruo ihe dị ka iri afọ anọ.+ 19  Mgbe o bibichara mba asaa n’ala Kenan, o nyere ndị nna nna anyị ala ha.+ 20  Ihe ahụ niile merenụ were ihe dị ka narị afọ anọ na iri ise (450). “Mgbe ihe ndị a mechara, ọ nọ na-enye ha ndị ikpe ruo n’oge Samuel onye amụma.+ 21  Ha mechara kwuo ka e nye ha eze.+ Chineke wee nye ha Sọl nwa Kish, nwoke si n’ebo Benjamin.+ Ọ chịrị ha afọ iri anọ. 22  Mgbe ọ kwụsịrị ya ịbụ eze, o mere ka Devid bụrụ eze ha.+ O kwuru banyere ya, sị: ‘Ahọrọla m Devid nwa Jesi,+ nwoke obi m nabatara.+ Ọ ga-eme ihe niile m na-achọ.’ 23  Chineke si n’ụmụ* nwoke a wetara Izrel onye nzọpụta bụ́ Jizọs,+ otú o kwere ná nkwa. 24  Tupu Jizọs abịa, Jọn kwusaara ndị Izrel niile na ha kwesịrị ime baptizim iji gosi na ha echegharịala.+ 25  Ma mgbe ọrụ Jọn na-agwụcha, ọ na-adị asị: ‘Ònye ka unu chere na m bụ? Abụghị m onye unu chere na m bụ. Kama, e nwere onye na-abịa n’azụ m, onye m na-erughị eru ịtọpụ akpụkpọ ụkwụ ya.’+ 26  “Ụmụnna m, ndị si n’agbụrụ Ebreham nakwa ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke n’ime unu, ọ bụ anyị niile ka Chineke ziteere ozi gbasara nzọpụta anyị.+ 27  N’ihi na ndị bi na Jeruselem na ndị na-achị ha amaghị onye a. Ma, mgbe ha na-ekpe ya ikpe, ha mezuru ihe Akwụkwọ Ndị Amụma kwuru,+ bụ́ ihe a na-agụpụta kwa ụbọchị izu ike. 28  N’agbanyeghị na ha ahụghị ihe ọ bụla mere a ga-eji gbuo ya,+ ha gwara Paịlet ka e gbuo ya.+ 29  Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha si n’elu osisi budata ya ma lie ya.*+ 30  Ma Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ.+ 31  O gosikwara ndị ya na ha so si Galili gaa Jeruselem onwe ya ruo ọtụtụ ụbọchị. Ọ bụ ndị ahụ na-agbara ndị Juu àmà banyere ya ugbu a.+ 32  “N’ihi ya, anyị na-ezi unu ozi ọma banyere nkwa ahụ Chineke kwere nna nna anyị hà. 33  Ọ kpọlitere Jizọs n’ọnwụ,+ si otú ahụ meere anyịnwa, bụ́ ụmụ ha, ihe ahụ niile o kwere ná nkwa, dị ka e dere ya n’abụ ọma nke abụọ, sị: ‘Ị bụ ọkpara m. Abụrụla m nna gị taa.’+ 34  Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ. Ọ gaghị abụ mmadụ ọzọ, ọ gaghịkwa anwụ anwụ ma ọ bụ ree ure. Chineke gosiri na ihe a bụ eziokwu mgbe ọ sịrị: ‘M gaghị akwụsị ịhụ unu n’anya* otú ahụ m kwere Devid ná nkwa. E kwesịrị ịtụkwasị m obi na m ga-emezu nkwa a.’+ 35  O kwukwara ebe ọzọ n’abụ ọma, sị: ‘Ị gaghị ekwe ka onye jisiri gị aka ike ree ure.’+ 36  Devid mere ihe Chineke chọrọ n’oge nke ya, mechaa nwụọ, e lie ya otú e si lie ndị nna nna ya, ya ereekwa.+ 37  Ma, onye ahụ Chineke kpọlitere n’ọnwụ ereghị ure.+ 38  “N’ihi ya, ụmụnna m, ya doo unu anya na ọ bụ naanị Jizọs ka Chineke na-esi n’aka ya agbaghara anyị mmehie. Ọ bụ ihe a ka a na-ekwusara unu.+ 39  Marakwanụ na Iwu Mosis emelighị ka unu bụrụ ndị ezi omume.+ Ma n’ihi ọnwụ nwoke a, Chineke ga-agụ onye ọ bụla kweere na ya n’onye ezi omume.+ 40  N’ihi ya, kpacharanụ anya ka ihe e kwuru n’Akwụkwọ Ndị Amụma ghara ime unu. E kwuru, sị: 41  ‘Unu ndị ọ na-amasị ilelị ihe anya, hụnụ ọrụ m na-arụ n’oge unu. Ọ bụ ọrụ unu na-agaghị ekweta na m rụrụ ọ bụrụgodị na mmadụ akọọrọ unu ya nke ọma. Ma, ọ ga-eju unu anya, unu ga-alakwa n’iyi.’”+ 42  Mgbe ha na-apụ, ndị Juu rịọrọ ha ka ha gwakwuo ha ihe ndị a n’Ụbọchị Izu Ike na-abịanụ. 43  Mgbe ndị zukọrọ n’ụlọ nzukọ ahụ gbasara, ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu* sooro Pọl na Banabas. Ha gwara ha okwu, gbaakwa ha ume ka ha ghara ikwe ka amara Chineke kwaa ha.+ 44  N’Ụbọchị Izu Ike sochirinụ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ obodo ahụ niile zukọrọ ka ha nụ okwu Jehova.* 45  Mgbe ndị Juu hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, ekworo juru ha obi, ha amalitekwa ịgbagha ihe Pọl na-ekwu, si otú ahụ kwuluo Chineke.+ 46  Pọl na Banabas wee gwa ha n’atụghị egwu, sị: “Ọ dị mma na unu bụ ndị mbụ a gwara okwu Chineke.+ Ma, ebe ọ bụ na unu jụrụ ya, meekwa onwe unu ndị na-erughị eru inweta ndụ ebighị ebi, anyị na-agakwuru ndị mba ọzọ.+ 47  N’ihi na Jehova* gwara anyị, sị: ‘Ahọpụtala m gị ka ị bụụrụ mba dị iche iche ìhè, ka i wee gaa n’ebe niile n’ụwa kwusaa otú m ga-esi azọpụta ndị mmadụ.’”+ 48  Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe a, ha malitere ịṅụrị ọṅụ, na-ekwukwa na okwu Jehova* dị ebube. Ndị niile na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi wee ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. 49  A nọkwa na-agbasa okwu Jehova* ná mba ahụ niile. 50  Ma, ndị Juu mere ka ụmụ nwaanyị a ma ama, ndị bu okpukpe n’isi, na ụmụ nwoke nwere agba n’obodo, megidewe+ Pọl na Banabas. Ha wee mesie ha ike ma chụpụ ha n’obodo ha. 51  Pọl na Banabas wee tichapụrụ ha ájá dị ha n’ụkwụ ma gawa Aịkoniọm.+ 52  Ndị na-eso ụzọ Jizọs wee na-ejupụta na mmụọ nsọ, obi ana-abụkwa ha sọ aṅụrị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ A5.
Ma ọ bụ “na-enyere ha aka.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
“Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma” pụtara Akwụkwọ Nsọ Hibru niile.
Na Grik, “ogwe aka ya dị ike.”
Na Grik, “ná mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “lie ya n’ili ncheta.”
Ma ọ bụ “igosi unu ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ndị a tọghatara atọghata.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.