Ọrụ Ndịozi 9:1-43

  • Mgbe Sọl na-aga Damaskọs (1-9)

  • E zigara Ananayas ka ọ gaa nyere Sọl aka (10-19a)

  • Mgbe Sọl nọ na Damaskọs na-ekwusa ozi ọma gbasara Jizọs (19b-25)

  • Mgbe Sọl gara Jeruselem (26-31)

  • Mgbe Pita gwọrọ Anias (32-35)

  • Mgbe a kpọlitere Dọkas n’ọnwụ (36-43)

9  Ma Sọl kpebiri imesi ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị ike, chọọkwa igbuchapụ ha.+ N’ihi ya, ọ gakwuuru nnukwu onye nchụàjà  ma gwa ya ka o nye ya akwụkwọ ozi ndị ọ ga-eji gaa n’ụlọ nzukọ ndị dị na Damaskọs. Akwụkwọ ozi ndị ahụ ga-enye ya ikike ike onye ọ bụla na-eso Ụzọ Onyenwe anyị agbụ,+ ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, kpụrụkwa ha bịa Jeruselem.  Ka ọ nọ na-aga Damaskọs, ya afọkwa obere ka o ruo, ìhè si n’eluigwe nwuo gburugburu ya na mberede,+  ya adaa n’ala ma nụ olu na-agwa ya, sị: “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?”  Sọl wee sị ya: “Ị̀ bụkwanụ onye, Onyenwe m?” Ya asị ya: “Abụ m Jizọs,+ onye ị na-akpagbu.+  Bilie banye n’obodo, a ga-agwakwa gị ihe ị ga-eme.”  Ma, ihe a merenụ enyeghị ndị ya na ha so ọnụ okwu. Ha na-anụ olu onye na-ekwu okwu, ma ha ahụghị onye ahụ.+  Sọl wee si n’ala bilie, o nweghịkwa ihe ọ na-ahụ n’agbanyeghị na anya ya meghere emeghe. N’ihi ya, ha sekpụụrụ ya n’aka ma duru ya banye Damaskọs.  Ọ hụghị ụzọ ruo ụbọchị atọ,+ o righịkwa ihe, ọ ṅụghịkwa ihe ọ bụla. 10  Na Damaskọs, e nwere otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Ananayas.+ Onyenwe anyị kpọrọ ya òkù n’ọhụụ, sị: “Ananayas!” O wee sị: “Onyenwe anyị, lee m.” 11  Onyenwe anyị wee sị ya: “Bilie, gaa n’okporo ámá a na-akpọ Nke Kwụ Ọtọ. I ruo n’ụlọ Judas, jụọ ase otu nwoke aha ya bụ Sọl, onye Tasọs.+ Ọ nọ ebe ahụ na-ekpe ekpere ugbu a. 12  Ọ hụrụ gị bụ́ Ananayas n’ọhụụ ebe ị batara, bikwasị ya aka n’isi ka ọ hụwa ụzọ.”+ 13  Ma Ananayas sịrị: “Onyenwe anyị, anụla m ihe ọtụtụ ndị na-ekwu gbasara nwoke a. Ha na-ekwu gbasara ihe ọjọọ niile o mere ndị nsọ gị na Jeruselem. 14  Ndị isi nchụàjà nyekwara ya ikike ka ọ kpụta ndị niile na-eso ụzọ gị.”*+ 15  Ma Onyenwe anyị gwara ya, sị: “Gawa, n’ihi na ahọrọla m nwoke a+ ka ọ gbaara ndị mba ọzọ,+ ndị eze+ nakwa ndị Izrel àmà gbasara m. 16  M ga-eme ka ọ mara ahụhụ niile ọ ga-ata n’ihi aha m.”+ 17  N’ihi ya, Ananayas gawara ebe ahụ. Mgbe ọ banyere n’ụlọ Sọl nọ, o bikwasịrị ya aka n’isi, sị ya: “Sọl, nwanna m, Onyenwe anyị Jizọs, onye pụtara n’ihu gị mgbe ị nọ n’ụzọ na-abịa, zitere m, ka i wee hụwa ụzọ ma jupụta na mmụọ nsọ.”+ 18  Ihe yiri akpịrịkpa si n’anya ya dapụtasịa ozugbo, ya ahụwa ụzọ. O wee bilie, e meekwa ya baptizim, 19  ya erie nri ma nweta ume. Ya na ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Damaskọs nọkwara ụbọchị ole na ole.+ 20  N’egbughị oge, ọ malitere kwusawa n’ụlọ nzukọ na Jizọs bụ Ọkpara Chineke. 21  Ma o juru ndị niile na-anụ ihe ọ na-ekwu anya, ha ana-asị: “Onye a ọ́ bụghị nwoke ahụ na-emesi ndị na-eso ụzọ Jizọs* ike na Jeruselem?+ Ihe mekwara o ji bịa ebe a ọ́ bụghị ka o jide ha* ma kpụgara ha ndị isi nchụàjà?”+ 22  Ma Sọl nọ na-enwetakwu ike, na-ezi ndị mmadụ ozi ọma otú na-eme ka ha kweta n’ihe ọ na-ekwu. Otú o si kọwaara ndị Juu bi na Damaskọs na Jizọs bụ Kraịst doro nnọọ anya, ha enweghịkwa ike ịgbagha ihe o kwuru.+ 23  Ma mgbe ọtụtụ ụbọchị gachara, ndị Juu kpara nkata igbu ya.+ 24  Ma, Sọl matara gbasara nkata a ha kpaara ya. Ha na-echesikwa ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ nche ike, ma n’ehihie ma n’abalị, ka ha gbuo ya. 25  N’ihi ya, ndị ọ kụziiri ihe kpọọrọ ya ma si n’oghere dị ná mgbidi jiri nkata butuo ya n’abalị.+ 26  Mgbe o ruru Jeruselem,+ ọ gbalịrị ka o sonyere ndị na-eso ụzọ Jizọs, ma ha niile nọ na-atụ ya ụjọ, n’ihi na ha ekwetaghị na ọ ghọọla onye na-eso ụzọ Jizọs. 27  N’ihi ya, Banabas+ nyeere Sọl aka, ya na ya agakwuru ndịozi. Banabas wee kọọrọ ha gbasara otú Sọl si hụ Onyenwe anyị n’ụzọ, gwakwa ha na Onyenwe anyị+ gwara Sọl okwu. Ọ kọkwaara ha otú Sọl si kwuo okwu n’aha Jizọs n’atụghị egwu na Damaskọs.+ 28  Sọl na ndịozi ahụ wee nọrọ, ya ana-aga ebe ọ bụla ọ chọrọ ịga na Jeruselem, na-ekwu okwu n’aha Onyenwe anyị n’atụghị egwu. 29  Ya na ndị Juu ndị na-asụ Grik nọkwa na-ekwurịta okwu ma na-arụrịta ụka. Ma, ha nọ na-achọ igbu ya.+ 30  Mgbe ụmụnna matara gbasara ihe a, ha kpọgara ya Sizaria ma ziga ya Tasọs.+ 31  Obi malitere iru ọgbakọ niile dị na Judia na Galili na Sameria+ ala n’oge ahụ, okwukwe ha ana-esikwukwa ike. Ha nọkwa na-ehikwu nne maka na ha na-atụ egwu Jehova,* mmụọ nsọ ana-akasikwa ha obi.+ 32  Ka Pita nọ na-aga ebe dị iche iche, ọ bịakwutere ndị nsọ bi na Lida.+ 33  N’ebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Anias, onye dina n’àkwà* ya kemgbe afọ asatọ, n’ihi na ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. 34  Pita wee sị ya: “Anias, Jizọs Kraịst agwọọla gị.+ Bilie dozie àkwà gị.”+ O wee bilie ozugbo ahụ. 35  Mgbe ndị niile bi na Lida na Sharọn hụrụ nwoke ahụ, ha kweere n’Onyenwe anyị. 36  Na Jọpa, e nwere otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Tabita, nke bụ́ “Dọkas”* n’asụsụ Grik. Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ọma, na-enyekwara ndị ogbenye aka. 37  Ka Pita ka nọ na Lida, Dọkas rịawara ọrịa, mechaakwa nwụọ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ wee saa ya ahụ́ ma busa ya n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu. 38  Ma, Lida dị Jọpa nso. N’ihi ya, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs nụrụ na Pita nọ na Lida, ha ziri ụmụ nwoke abụọ ka ha gakwuru ya ma sị ya: “Biko, bịa na nke anyị ngwa ngwa.” 39  Pita wee bilie soro ha gawa. Mgbe o ruru, ha duuru ya gaa n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu. Ụmụ nwaanyị isi mkpe niile bịakwutekwara ya na-ebe ákwá, na-egosi ya ọtụtụ uwe mwụda* na uwe ndị ọzọ Dọkas kwaara ha mgbe ọ dị ndụ. 40  Pita gwaziri mmadụ niile ka ha pụọ n’èzí.+ Mgbe ha pụrụ, o gburu ikpere n’ala, kpee ekpere, tụgharịzie chee ihu n’ebe e busara ozu ahụ ma sị: “Tabita, bilie!” Nwaanyị ahụ wee meghee anya ya. Ozugbo ọ hụrụ Pita, o biliri nọrọ ọdụ.+ 41  Pita wee jide ya n’aka, nyere ya aka ya eguzoro ọtọ. Ọ kpọkwara ndị nsọ na ụmụ nwaanyị ndị ahụ di ha nwụrụ ma gosi ha na Tabita dịzi ndụ.+ 42  Akụkọ ihe a merenụ gbasara na Jọpa niile, ọtụtụ ndị kwekwaara n’Onyenwe anyị.+ 43  Pita nọkwuru ọtụtụ ụbọchị na Jọpa n’ụlọ otu nwoke aha ya bụ Saịmọn, onye na-esiji akpụkpọ anụ.*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “ka o kee ndị niile na-akpọ aha gị agbụ.”
Na Grik, “ndị na-akpọ aha a.”
Na Grik, “ka o kee ha agbụ.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Dọkas, bụ́ aha Grik, na Tabita, bụ́ aha Arameik, pụtara nne mgbada.
Ma ọ bụ “uwe elu.”
Ya bụ, onye na-emechasị akpụkpọ anụ ma sijie ya ka e jiri ya rụọ ihe dị iche iche.