Ndị Eze nke Abụọ 24:1-20

  • Mgbe Jehoyakim nupụrụ isi na mgbe ọ nwụrụ (1-7)

  • Jehoyakin malitere ịchị Juda (8, 9)

  • Ndị mbụ a dọọrọ n’agha laa Babịlọn (10-17)

  • Mgbe Zedekaya malitere ịchị Juda na mgbe o nupụrụ isi (18-20)

24  N’oge Jehoyakim na-achị, Nebukadneza+ eze Babịlọn bịara lụso ya agha, ya agbawara ya ohu ruo afọ atọ. Ma, o mechara nupụrụ ya isi.  Jehova mekwara ka ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ndị Kaldia+ na nke ndị Siria na nke ndị Moab nakwa nke ndị Amọn na-emesi ya ike. Jehova mere ka ha na-emesi Juda ike iji bibie ya, otú o si n’ọnụ ndị amụma bụ́ ndị ohu ya kwuo.+  Ihe a mere ndị Juda maka na Jehova kwuru na ọ ga-eme ha. Ọ chọrọ iwepụ ha n’ihu ya+ n’ihi mmehie niile Manase mere,+  nakwa n’ihi ndị aka ha dị ọcha o gburu.*+ O gburu ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha na Jeruselem. Jehova achọghịkwa ịgbaghara ndị Juda n’ihi ya.+  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jehoyakim na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda.+  N’ikpeazụ, Jehoyakim nwụrụ otú nna nna ya hà+ nwụrụ. Jehoyakin nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.  O nweghịkwa mgbe ọzọ eze Ijipt+ nwara anwa si n’obodo ya gaa agha, n’ihi na eze Babịlọn naara ya ala ya niile, malite na Ndagwurugwu* Ijipt+ ruo n’Osimiri Yufretis.+  Jehoyakin+ dị afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị ọnwa atọ na Jeruselem.+ Aha nne ya bụ Nehọshta nwa Elnetan onye Jeruselem.  Jehoyakin nọ na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova otú nna ya mere. 10  N’oge ahụ, ndị agha Nebukadneza eze Babịlọn bịara nọchibido Jeruselem.+ 11  Nebukadneza eze Babịlọn bịakwara Jeruselem n’oge ahụ ndị agha ya nọchibidoro ya. 12  Jehoyakin eze Juda, nne ya, ndị na-ejere ya ozi, ndị o mere ndị isi, na ndị na-eje ozi n’obí ya+ chịliiri eze Babịlọn aka+ elu, eze Babịlọn akpụrụkwa ya laa n’afọ nke asatọ eze Babịlọn malitere ịchị.+ 13  O bukọkwaara akụ̀ niile dị n’ụlọ Jehova na ndị nke dị n’ụlọ* eze,+ kụrisịakwa arịa niile Solomọn eze Izrel ji ọlaedo rụọ n’ụlọ nsọ Jehova.+ Ihe a niile mere otú Jehova kwuru na ha ga-eme. 14  Eze Babịlọn dọọrọ ndị Jeruselem niile n’agha, ma ndị isi niile+ ma ndị dike niile bụ́ ndị agha ma ndị omenkà niile ma ndị niile na-akpụ ụ́zụ́.*+ Ọ dọọrọ puku mmadụ iri (10,000) n’agha. E nweghị onye ọ hapụrụ ma e wezụga ndị ogbenye ọnụ ntụ.+ 15  Otú a ka o si dọrọ Jehoyakin+ n’agha laa Babịlọn.+ Ndị ọzọ o si Jeruselem dọrọ n’agha laa Babịlọn bụ nne eze, ndị nwunye eze, ndị na-eje ozi n’obí ya, nakwa ndị nwere agba n’obodo. 16  Eze Babịlọn dọkwaara ndị dike niile dị puku asaa (7,000) n’agha laa Babịlọn, dọrọkwa otu puku (1,000) mmadụ, bụ́ ndị omenkà na ndị na-akpụ ụ́zụ́.* Ha niile bụ ndị dike a zụrụ ịga agha. 17  Eze Babịlọn chikwara Matanaya, bụ́ nwanne nna Jehoyakin,+ eze, ya anọchie ya. Ọ gbanwekwara aha ya, kpọwazie ya Zedekaya.+ 18  Zedekaya dị afọ iri abụọ na otu mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jeruselem. Aha nne ya bụ Hamutal+ nwa Jeremaya onye Libna. 19  Ọ nọ na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova otú Jehoyakim mere.+ 20  Ihe mere ihe ndị a ji mee ndị bi na Jeruselem na ndị Juda bụ maka na ha nọ na-akpasu Jehova iwe ruo mgbe ọ chụpụrụ ha n’ihu ya.+ Zedekaya mechakwara nupụrụ eze Babịlọn isi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ọ wụfuru ọbara ha.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
O nwere ike ịbụ, “ndị na-arụ mgbidi siri ike.”
O nwere ike ịbụ, “ndị na-arụ mgbidi siri ike.”