Aịzaya 42:1-25
42 Leenụ ohu m,+ bụ́ onye m na-akwado,Onye m họọrọ,+ onye ihe ya masịrị m.*+
Enyela m ya mmụọ m.+
Ọ ga-eme ka a na-ekpe ikpe ziri ezi ná mba niile.+
2 Ọ gaghị eti mkpu. Ọ gaghị eme ka olu ya na-ala elu.
Ọ gaghịkwa eme ka a nụ olu ya n’okporo ámá.+
3 Ọ gaghị agbaji ahịhịa amị huuru ehuru.
Ọ gaghịkwa emenyụ owu mpanaka* ọ bụla na-achọ ịnyụ anyụ.+
Ọ ga-ahụrịrị na e kpere ikpe ziri ezi.+
4 Ike agaghị agwụ ya. Ọ gaghịkwa ada mbà ruo mgbe o mere ka a na-ekpe ikpe ziri ezi n’ụwa.+
Ndị bi n’agwaetiti dị iche iche ga na-echere iwu* ya.
5 Jehova bụ ezi Chineke,Onye kere eluigwe na Onye Ukwu nke mere ka ọ saa mbara.+
Ọ bụ ya kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya.+
Ọ bụ ya na-eme ka ndị mmadụ na-eku ume,+Na-enyekwa ndị na-ejegharị n’ụwa ume ndụ.+ Ọ sịrị:
6 “Mụnwa, bụ́ Jehova, akpọọla gị n’ihi na m na-eme ezi omume.
M serela gị n’aka.
M ga-echebe gị, meekwa ka ọ bụrụ gị ka mụ na ndị mmadụ ga-eji gbaa ndụ.+
M ga-emekwa ka ị bụrụ ìhè mba niile ji ahụ ụzọ,+
7 Ka i meghee anya ndị ìsì,+Ka ị kpọpụta ndị mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ,
Meekwa ka ndị nọ ọdụ n’ọchịchịrị si n’ụlọ mkpọrọ pụta.+
8 Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.
Anaghị m enye onye ọzọ ùgwù ruuru m.
Anaghịkwa m enye arụsị a pịrị apị otuto e kwesịrị inye m.+
9 Ihe ndị m kwuru n’oge gara aga emezuola.
Ọ bụzi ihe ndị ọhụrụ ka m na-akpọsa.
Tupu ha emewe, m na-agwa unu gbasara ha.”+
10 Ndị si n’oké osimiri aga njem na ihe niile dị n’oké osimiri,Agwaetiti dị iche iche na ndị bi na ha,+Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ.+
Jirinụ abụ too ya n’ụwa niile.+
11 Ka ala ịkpa na obodo ndị dị na yaNakwa ógbè dị iche iche ndị Kida+ bi tie mkpu.+
Ka ndị bi ná nnukwu nkume tie mkpu ọṅụ.
Ka ha nọrọ n’elu ugwu dị iche iche tisie mkpu ike.
12 Ka ha kwanyere Jehova ùgwù,Tookwa ya n’agwaetiti dị iche iche.+
13 Jehova ga-apụta ka dike.+
Ọ ga-adị ka onye agha na-anụ ọkụ n’obi ịga agha.+
Ọ ga-eti mkpu. Ọ ga-eti mkpu agha.
Ọ ga-egosi na ya ka ndị iro ya ike.+
14 “Agbachiri m nkịtị kemgbe.
Ekwughị m ihe ọ bụla. M jidere onwe m.
M ga-asụ ude, kusie ume ike, kuokwa ume ọkụ ọkụ n’otu mgbe ahụOtú nwaanyị na-amụ nwa na-eme.
15 M ga-ala ugwu ukwu na ugwu nta n’iyi,M ga-emekwa ka ahịhịa ndụ niile dị na ha kpọọ nkụ.
M ga-eme ka osimiri ghọọ agwaetiti.
M ga-emekwa ka ọdọ mmiri ndị ahịhịa amị juru takọọ.+
16 M ga-eduru ndị ìsì gaa n’ụzọ ha na-amaghị.+
M ga-emekwa ka ha jee ije n’okporo ụzọ ha na-amaghị.+
M ga-eme ka ìhè dị n’ebe gbara ọchịchịrị n’ihu ha,+Meekwa ka ala dị ndakoro ndakoro dị larịị.+
Ọ bụ ihe ndị a ka m ga-emere ha. M gaghịkwa ahapụ ha.”
17 Ihere ga-emegbu ndị tụkwasịrị arụsị a pịrị apị obi,Ndị na-asịkwa arụsị ndị a kpụrụ akpụ: “Unu bụ chi anyị.”+
A ga-emekwa ka ha laghachi azụ.
18 Ndị ntị chiri, geenụ ntị.
Ndị ìsì, leenụ anya ka unu hụ ụzọ.+
19 È nwere onye ọzọ kpuru ìsì ma e wezụga ohu m?
Ònyekwa ka ntị chiri ka onye na-agara m ozi?
Ònye kpuru ìsì ka onye m kwụrụ ụgwọ?
Ònye kpuru ìsì ka ohu Jehova?+
20 Ị na-ahụ ọtụtụ ihe, ma ị naghị echebara ha echiche.
Ị na-eghewe ntị gị oghe, ma ị naghị ege ntị.+
21 Jehova ji maka na ọ na-eme ezi omumeNwee mmasị igosi na iwu* ya enweghị atụ nakwa na ọ dị ebube.
22 Ma, ndị a bụ ndị e bukọọrọ ihe ha, kwakọrọkwa ihe ha.+
A kpọchiri ha niile n’ime olulu. E zokwara ha n’ụlọ mkpọrọ.+
A kpụrụla ha. E nweghịkwa onye ga-anapụta ha.+
A kpọọrọ ha n’ike. E nweghịkwa onye na-asị: “Kpọghachite ha!”
23 Ònye n’ime unu ga-anụ ihe a?
Ònye ga-atọ ntị n’ala, geekwa ntị maka ọdịnihu?
24 Ònye nyefere Jekọb n’aka ndị kwakọọrọ ihe ya,Nyefeekwa Izrel n’aka ndị na-ebukọrọ ihe mmadụ?
Ọ́ bụghị Jehova, onye anyị mehiere?
Ha jụrụ ije ije n’ụzọ ya.
Ha egeghịkwa ntị n’iwu* ya.+
25 Ọ bụ ya mere Chineke ji jiri iwe na ọnụma mee ndị Izrel ihe,Meekwa ka agha kpaa ha aka ọjọọ.+
O nweghị otú ọ na-esighị wesa ha iwe, ma ha achọghị ịma.+
Ọ nọ na-ewere ha ezigbo iwe, ma o metụghị ha n’obi.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “oriọna.”
^ Ma ọ bụ “ntụziaka.”
^ Ma ọ bụ “ntụziaka.”
^ Ma ọ bụ “ná ntụziaka.”