Abụ Ọma 1:1-6

  • Ndị ezi omume na ndị ajọ omume

    • Ịgụ iwu Chineke na-eme obi ụtọ (2)

    • Ndị ezi omume dị ka osisi na-amị mkpụrụ (3)

    • Ndị ajọ omume dị ka mkpo ọka ifufe na-efesasị (4)(4)

1  Onye ọ bụla nke na-anaghị eso ndụmọdụ ndị ajọ omume,Nke na-anaghị eso ụzọ ndị mmehie,+Nke na-anaghịkwa anọ n’ebe ndị na-akwa emo nọ,+ na-enwe obi ụtọ.   Iwu Jehova na-atọ ya ụtọ,+Ọ na-agụkwa iwu ya ma na-atụgharị uche na ya* ehihie na abalị.+   Ọ ga-adị ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,Osisi nke na-amị mkpụrụ n’oge ya,Nke akwụkwọ ya na-anaghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.+   Ndị ajọ omume adịghị otú ahụ. Ha dị ka mkpo ọka* ifufe na-efesasị.   Ọ bụ ya mere a ga-eji ama ndị ajọ omume ikpe,+Ndị mmehie agaghịkwa anọgide n’ebe ndị ezi omume zukọrọ.+   N’ihi na Jehova ma ihe ndị ezi omume na-eme,+Ma a ga-ala ndị ajọ omume na ajọ omume ha n’iyi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.