Abụ Ọma 105:1-45
105 Keleenụ Jehova,+ kpọkuonụ aha ya.
Kọọrọnụ mba dị iche iche ihe ndị ọ na-eme.+
2 Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto.
Chebaranụ ọrụ niile dị ebube ọ na-arụ echiche.*+
3 Jirinụ aha nsọ ya na-eme ọnụ.+
Ka obi ndị na-achọ Jehova ṅụrịa ọṅụ.+
4 Chọọnụ Jehova,+ rịọkwanụ ya ka o nye unu ike.
Na-arịọnụ ya mgbe niile ka o meere unu amara.
5 Chetanụ ihe ndị dị ebube o mere,Ọrụ ebube ndị ọ rụrụ nakwa ikpe ndị o kpere,+
6 Unu ụmụ* Ebreham bụ́ ohu ya,+Unu ụmụ Jekọb, bụ́ ndị ọ họọrọ.+
7 Ọ bụ ya bụ Jehova Chineke anyị.+
Ọ na-ekpe ụwa niile ikpe.+
8 Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.+
Ọ na-echeta nkwa o kwere* ruo otu puku ọgbọ.+
9 Ọ bụ ya na Ebreham gbara ndụ ahụ,+Ọ ṅụkwaara Aịzik iyi.+
10 Ọ ṅụrụ iyi ahụ iji mee ka obi sie Jekọb ikeNakwa ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ga-adịte aka ya na Izrel gbara.
11 Ọ sịrị: “M ga-enye unu ala Kenan+Ka ọ bụrụ ihe unu ketara.”+
12 Ha dị ole na ole mgbe ahụ.+
N’eziokwu, ha ehighị nne, ha bụkwa ndị mbịarambịa.+
13 Ha nọ na-aga si n’otu mba ruo mba ọzọ,Sikwa n’otu alaeze ruo alaeze ọzọ.+
14 O kweghị ka onye ọ bụla megbuo ha,+Kama ọ baara ndị eze mba n’ihi ha.+
15 Ọ sịrị: “Unu akpala ndị m tere mmanụ aka,Unu emekwala ndị amụma m ihe ọjọọ ọ bụla.”+
16 O kwuru ka ụnwụ daa n’ala ahụ.+
O mebiri ebe ha na-edosa achịcha.*
17 O zipụrụ otu nwoke ka o buru ha ụzọ gawa,Ya bụ, Josef, onye e rere ka ọ bụrụ ohu.+
18 Ha tụrụ ya ịga n’ụkwụ.+
E kere ya agbụ ígwè n’olu.
19 Ọ bụ okwu Jehova nụchara yaRuo mgbe ihe Chineke kwuru mezuru.+
20 Eze ziri ozi ka a tọhapụ ya.+
Onye na-achị ndị dị iche iche tọhapụrụ ya.
21 O mere ya onyeisi n’ezinụlọ ya,Onye na-elekọta ihe niile o nwere,+
22 Ka o wee chịwa ndị eze mere ndị isi otú masịrị yaNakwa ka ọ kụziere ndị okenye ya ihe.+
23 Izrel wee bata n’Ijipt.+
Jekọb wee bụrụ onye mbịarambịa n’ala Ham.
24 Chineke mere ka ndị ya mụọ ọtụtụ ụmụ.+
O mere ka ha dị ike karịa ndị iro ha.+
25 O kwere ka ha gbanwee obi ha wee kpọọ ndị ya asị,Ka ha kpaara ndị ohu ya nkata ọjọọ.+
26 O zigara Mosis ohu ya+Nakwa Erọn+ bụ́ onye ọ họọrọ.
27 Ha meere ha ihe àmà ya,Ya bụ, ọrụ ebube ndị ọ rụrụ n’ala Ham.+
28 Chineke mere ka ala ha gbaa ọchịchịrị.+
Ha* enupụrụghị ya isi.
29 O mere ka mmiri ha ghọọ ọbara,Gbuokwa azụ̀ ha.+
30 Mbàrá juru ebe niile n’ala ha,+Ma n’ime ụlọ eze ha.
31 O nyere odudu na anwụnta iwuKa ha nubata n’ala ha niile.+
32 O mere ka akụ́ mmiri ígwé zooro ha ka mmiri,Meekwa ka àmụ̀mà gbuo* n’ala ha.+
33 O bibiri osisi vaịn ha na osisi fig ha,Kụjisiekwa osisi ndị dị n’ala ha.
34 O kwuru ka igurube nubata,Bụ́ ụmụ igurube a na-enweghị ike ịgụta ọnụ.+
35 Ha richapụrụ ahịhịa ndụ niile dị n’ala ahụ,Ha richapụkwara ihe niile ala ha mepụtara.
36 O gbuziri nwa mbụ ọ bụla a mụrụ n’ala ha,+Ya bụ, ndị ha bu ụzọ mụọ.
37 O mere ka ndị ya jiri ọlaọcha na ọlaedo pụta.+
E nweghịkwa onye ọ bụla n’ebo ya ike gwụrụ.*
38 Ndị Ijipt ṅụrịrị ọṅụ mgbe ha pụrụ,Maka na ụjọ ndị Izrel* ejidela ha.+
39 Ọ gbasara ígwé ojii ka o kpuchie ha,+Meekwa ka ọkụ na-enye ha ìhè n’abalị.+
40 Ha rịọrọ ya anụ, ya ezitere ha nnụnụ kwel.+
O nyere ha achịcha si n’eluigwe, ha erie rijuo afọ.+
41 O meghere nnukwu nkume, mmiri agbapụtawa.+
Mmiri a nọ na-asọ n’ọzara ka à ga-asị na ọ bụ osimiri.+
42 N’ihi na o chetara nkwa dị nsọ o kwere Ebreham ohu ya.+
43 O wee mee ka ndị ya jiri ọṅụ pụta,+Meekwa ka ndị ọ họọrọ tiri mkpu ọṅụ pụta.
44 O nyere ha ala ndị mba ọzọ.+
Ha weghaara ihe ndị ọzọ gbara mbọ rụpụta,+
45 Ka ha wee na-eso ntụziaka ya+Ma na-edebe iwu ya.
Toonụ Jaa!*
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ, “Kwuonụ gbasara ọrụ niile dị ebube ọ na-arụ.”
^ Na Hibru, “mkpụrụ.”
^ Na Hibru, “iwu o nyere.”
^ Na Hibru, “Ọ gbajiri osisi achịcha niile.” O nwere ike ịbụ osisi e ji ekonye achịcha.
^ O nwere ike ịbụ Mosis na Erọn.
^ Ma ọ bụ “Zitekwa ire ọkụ.”
^ Ma ọ bụ “daranụ.”
^ Na Hibru, “ha.”
^ Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.