Abụ Ọma 107:1-43

  • Keleenụ Jehova n’ihi ọrụ ndị dị ebube ọ na-arụ

    • O duru ha ka ha soro ezi ụzọ (7)

    • O nyejuru ha mmiri na nri afọ (9)

    • O si n’ọchịchịrị kpọpụta ha (14)

    • O nyere iwu, e wee gwọọ ha (20)

    • Ọ na-anapụta ndị a na-emegbu emegbu (41)

(Abụ Ọma 107-150) 107  Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+ Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+   Ka ndị Jehova napụtara kwuo otú ahụ,Bụ́ ndị ọ napụtara n’aka onye iro,+   Ndị o si n’ala dị iche iche kpọkọta.+ O si ma n’ebe ọwụwa anyanwụ ma n’ebe ọdịda anyanwụ,Ma n’ebe ugwu ma n’ebe ndịda kpọkọta ha.+   Ha wagharịrị n’ala ịkpa, n’ọzara. Ha ahụghị ụzọ ha ga-esi gaa n’obodo ha ga-ebi.   Agụụ gụrụ ha, mmiri gụkwara ha. Ezigbo ike gwụrụ ha.*   Ha nọ na-ebesara Jehova ákwá mgbe ha na-ata ahụhụ.+ Ọ napụtara ha ná nsogbu ha nọ na ya.+   O mere ka ha jee ije n’ezigbo ụzọ,+Ka ha wee bata n’obodo ha ga-ebi.+   Ka ndị mmadụ kelee Jehova+ n’ihi ịhụnanya ya*Nakwa n’ihi ọrụ ndị dị ebube ọ na-arụrụ ndị mmadụ.+   N’ihi na o nyela ndị mmiri na-agụ mmiri. O jirikwala ihe ọma dị iche iche nyejuo ndị* agụụ na-agụ afọ.+ 10  Ụfọdụ bibu n’oké ọchịchịrị,Bụ́ ndị mkpọrọ a na-emekpa ahụ́, ndị a tụkwara ịga. 11  N’ihi na ha nupụrụ isi n’ihe Chineke kwuru. Ha ledara ndụmọdụ Onye Kacha Elu anya.+ 12  N’ihi ya, o mere ka ihe siere ha ike ka ha wee dị umeala n’obi.+ Ha dara, e nweghịkwa onye nyeere ha aka. 13  Ha kpọkuru Jehova ka o nyere ha aka mgbe ha na-ata ahụhụ. Ọ napụtara ha ná nsogbu ha nọ na ya. 14  O si n’oké ọchịchịrị kpọpụta ha,Ọ dọbisịkwara agbụ e kere ha.+ 15  Ka ndị mmadụ kelee Jehova n’ihi ịhụnanya ya*+Nakwa n’ihi ọrụ ndị dị ebube ọ na-arụrụ ndị mmadụ. 16  N’ihi na o tiwaala ibo ụzọ e ji ọla kọpa rụọMa gbuwaa ígwè e ji atụchi ha.+ 17  Ha dị nzuzu, ha takwara ahụhụ+Maka mmehie ha na ihe ọjọọ ha mere.+ 18  E nweghịzi nri ọ bụla na-agụ ha agụụ. Ọ fọrọ obere ka ha nwụọ. 19  Ha na-akpọku Jehova ka o nyere ha aka mgbe ha na-ata ahụhụ. Ọ na-anapụtakwa ha ná nsogbu ha nọ na ya. 20  Ọ na-enye iwu, e wee gwọọ ha.+ Ọ na-anapụtakwa ha n’olulu ebe e ji ha. 21  Ka ndị mmadụ kelee Jehova n’ihi ịhụnanya ya*Nakwa n’ihi ọrụ ndị dị ebube ọ na-arụrụ ndị mmadụ. 22  Ka ha chụọrọ ya àjà ekele,+Jirikwa mkpu ọṅụ kọsaa ọrụ ya. 23  Ndị ji ụgbọ mmiri aga n’oké osimiri,Ndị na-azụ ahịa n’elu nnukwu mmiri,+ 24  Ha ahụla ọrụ JehovaNakwa ihe ndị dị ebube o kere n’oké osimiri,+ 25  Otú okwu o kwuru si eme ka oké ifufe malite ife,+Meekwa ka e nwee ebili mmiri n’oké osimiri. 26  Ebili mmiri na-ebugoru ha na mbara igwe. Ọ na-atụbakwa ha n’ala ala osimiri. Obi na-alọ ha mmiri n’ihi ọdachi chọrọ ịdakwasị ha. 27  Ha na-aṅagharị, na-adagharịkwa ka ndị mmanya na-egbu,E nweghịzi uru ihe niile ha ma gbasara ịkwọ ụgbọ bara.+ 28  Ha na-ebesara Jehova ákwá mgbe ahụ ha na-ata ahụhụ,+Ọ na-anapụtakwa ha ná nsogbu ha nọ na ya. 29  Ọ na-eme ka oké ifufe kwụsị ife. Ebili mmiri na-adajụ.+ 30  Ha na-aṅụrị ọṅụ mgbe ihe niile a dara jụụ,Ọ na-edurukwa ha gaa n’ebe ha bu n’obi ịkwụsị ụgbọ ha. 31  Ka ndị mmadụ kelee Jehova n’ihi ịhụnanya ya*Nakwa n’ihi ọrụ ndị dị ebube ọ na-arụrụ ndị mmadụ.+ 32  Ka ha too ya n’ebe ndị mmadụ gbakọrọ,+Ka ha tookwa ya n’ebe ndị okenye zukọrọ. 33  Ọ na-eme ka osimiri ghọọ ọzara,Ọ na-eme ka isi mmiri ghọọ ala kpọrọ nkụ,+ 34  Ọ na-emekwa ka ala nke na-eme nri ghọọ ala nnu nke na-abaghịzi uru,+N’ihi ihe ọjọọ nke ndị bi na ya na-eme. 35  Ọ na-eme ka ọzara ghọọ ọdọ mmiri nke ahịhịa amị juru,Na-emekwa ka ala kpọrọ nkụ ghọọ isi mmiri.+ 36  Ọ na-emekwa ka ndị agụụ na-agụ biri n’ebe ahụ,+Ka ha wee rụọ obodo ha ga-ebi.+ 37  Ha na-akụ mkpụrụ n’ubi, na-akọkwa ubi vaịn+Nke na-amị mkpụrụ nke ọma.+ 38  Ọ na-agọzi ha, ha adịzie nnọọ ọtụtụ. Ọ naghị ekwe ka anụ ụlọ ha dị ole na ole.+ 39  Ma n’ihi mmegbu a na-emegbu ha na ọdachi na-adakwasị ha na uju ha na-eru,Ha na-adị ole na ole ọzọ, a na-emechukwa ha ihu. 40  Ọ na-eme ka a na-eleda ndị a ma ama anya,Na-emekwa ka ha na-agagharị n’ọzara ụzọ na-adịghị.+ 41  Ma ọ na-anapụta ndị ogbenye a na-emegbu emegbu,+Na-emekwa ka ezinụlọ ha dị ọtụtụ ka ìgwè atụrụ. 42  Ndị ezi omume na-ahụ ihe ndị a ṅụrịa ọṅụ.+ Ma a ga-emechi ọnụ ndị ajọ omume niile.+ 43  Onye ọ bụla ma ihe ga-ahụ ihe ndị a+Ma chebara ịhụnanya Jehova ezigbo echiche.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”