Abụ Ọma 113:1-9
113 Toonụ Jaa!*
Unu ndị ohu Jehova, toonụ ya.
Toonụ aha Jehova.
2 Ka e too aha Jehova
Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.+
3 Ka a na-eto aha Jehova+Malite n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda anyanwụ.
4 Jehova dị elu karịa mba niile.+
Ọ dị ebube karịaeluigwe.+
5 Ònye dị ka Jehova Chineke anyị,+Onye bi* n’ebe dị elu?
6 Ọ na-ehulata ka o lee eluigwe na ụwa anya.+
7 Ọ na-esi n’ájá ekulite onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya.
Ọ na-esi n’ebe a na-ekpofu ntụ* ekulite ogbenye,+
8 Ka o wee mee ka o soro ndị a ma ama nọrọ,Bụ́ ndị a ma ama ná ndị Chineke.
9 Ọ na-eme ka obi dị nwaanyị aga ụtọMaka na ọ mụtala ụmụ n’ụlọ ya.+
Toonụ Jaa!*
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
^ Ma ọ bụ “nọ n’ocheeze.”
^ O nwere ike ịbụ, “ahịhịa.”
^ Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.