Abụ Ọma 128:1-6
Abụ Mgbago.
128 Onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova+Ma na-eme ihe ọ chọrọ na-enwe obi ụtọ.+
2 Ị ga-eri ihe i ji aka gị rụpụta.
Obi ga-adị gị ụtọ, ihe ga-agakwara gị nke ọma.+
3 Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịn nke na-amị mkpụrụ n’ụlọ gị.+
Ụmụ gị ga-adị ka ome osisi oliv gburugburu tebụl gị.
4 Ọ bụ otú ahụ ka a ga-esi gọzie+Onye na-atụ egwu Jehova.
5 Jehova ga-esi na Zayọn gọzie gị.
Ka o mee ka ị hụ ka ihe na-aga nke ọma na Jeruselem n’oge niile ị dị ndụ,+
6 Ka ị hụkwa ụmụ ụmụ gị.
Ka udo dịrị Izrel.